“Osisi nke Ndụ Ahụ,” Friend, Jan. 2024, 26–27.
Ozi FriendKwa ọnwa, Jenụwarị 2024
Osisi nke Ndụ Ahụ
Lehi bụụrụ onye amụma. Chineke gwara ya ka ọ kpọrọ ezi na ụlọ ya gaa n’ala ahụ e kwere na nkwa. Mgbe ha na-eme njem, ọ rọrọ nrọ gbasara otu ọmarịcha osisi. A kpọrọ ya osisi nke ndụ ahụ.
Osisi ahụ mịpụtara mkpụrụ ọcha na-atọ ụtọ Lehi nwere obi ụtọ nke ukwuu mgbe o riri ya! Ọ chọrọ ka ezi na ụlọ ya nwaa kwa ya.
Lehi hụkwara otu okporo igwe nke dubara nebe osisi ahụ nọ. Ndị mmadụ jigidere okporo ahụ iji rute osisi ahụ ma rie mkpụrụ ya.
Osisi ahụ dị na nrọ Lehi dị ka ịhụnaanya nke Chineke. Okwu ahụ dị ka akwụkwọ nsọ. Mgbe anyị na-agụ akwụkwọ nsọ, anyị na-abịarute Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist nso.
© 2024 site n’aka Intellectual Reserve, Inc.Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Enyi Kwa Ọnwa, Jenụwarị 2024. Language. 19273 593