“Erọn Na-akuziri Eze ahụ,” Friend, Jul. 2024, 26–27.
Ozi Friend Kwa ọnwa, Julaị 2024
Erọn Na-akuziri Eze ahụ
Erọn bụ otu niime ụmụ ndị nwoke nke Mozaya. Ọ bụụrụ onye mgbasa ozi ọma. Ọ kuziiri eze na-achị ndị Laman gburugburu ala ahụ.
Erọn jụrụ eze ahụ ma o kwere na Chineke. Eze ahụ kwuru na ọ ga-ekwe ma ọ bụrụ ma Erọn gwa ya na Chineke dị irè. Ọ gwara Erọn ka ọ gwa ya ọtụtụ ihe ọzọ banyere Chineke.
Erọn na-agụrụ eze ahụ akwụkwọ nsọ. Ọ kuziri maka okike nke ụwa. Ọ kuziri maka atụmatụ nke Chineke. Ọ gwara eze ahụ banyere Jizọs Kraịst.
Mgbe emesịrị, eze ahụ ekpee ekpere. Ọ jụrụ Chineke ma ihe ahụ Erọn kwuru ọ bụ eziokwu. Eze ahụ natara azịza ahụ na ọ bụ eziokwu!
Eze kwere n’ihe Erọn kụziiri. Onye ọbụla nọ n’ebe obibi ya kwenyekwara. E mere ha baptizim ma ha họọrọ isoro Jizọs Kraịst.
© 2024 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Julaị 2024. Igbo. 19348 593