“Jizọs Gọziri n’Otu n’Otu,” Friend, Ọktoba 2024, 26–27.
Kwa Ọnwa FriendOzi, Ọktoba 2024
Jizọs Gọziri Otu n’Otu
Ndị amụma kuziiri ndị Nifaị ihe gbasara ihe ịriba ama niile nke ọnwụ Jizọs Kraist. Mgbe Ọ nwụrụ, e nwere ọchịchịrị n’ala ahụ ruo mkpụrụ ụbọchị atọ. Emesia, ndị mmadụ nụrụ olu Nna nke Eluigwe ka o si n’eluigwe ekwu okwu.
Nna nke Eluigwe sịrị, “Lee Ọkpara m Hụrụ n’Anya” (3 Nifaị 11:7). Jizọs pụtara ihe nye ndị Nifaị. O bilitere n’ọnwụ! Ọ kụziiri ndị Nifaị ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha ka ha chegharịa ma soro Ya.
Ọ gwara ndị mmadụ ka ha kpọtara Ya ndị na-arịa ọrịa ka a gwọọ ha. Ọ gọziri ha.
O gọzikwara ụmụntakịrị niile n’otu n’otu. Ndị mmụọ ozi gbara ụmụntakịrị ahụ gburugburu.
© 2024 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Ọktoba 2024. Igbo. 19291 593