2021
Nụrụ, Ńa nti, ma Rube isi
Jenụwarị 2021


“Nụrụ, Ńa nti, ma Rube isi,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa,Jan. 2021, 32.

Maka Ume nke Ndị NtoroọbịaOzi Kwa Ọnwa, Janụwarị 2021

Nụrụ, Ńa nti, ma Rube isi

Foto, oyiyi
Ige ntị, ịgụ ihe, ikwu okwu n’ebe mgbago

Ngosipụta site n’aka Guev Design

Okwu nke mbụ dị nime Ozizi na ọgbụgba-ndụ niile bụ ńa ntịlee Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 1:1 Ọ pụtara “ige ntị n’ebumnobi irube isi.” Ị nụrụ pụtara ị “nụrụ olu Ya”—ị nụrụ ihe Onye Nzọpụta kwuru ma mgbe ahụ i rube isi nye ndụmọdụ Ya. N’ime okwu abụọ ndị ahụ—“Nụrụ olu Ya”—Chineke n’enye anyị usoro nke oganihu, ańụrị, na ọńụ n’ime ndụ a. Anyị kwesịrị ị nụrụ okwu niile nke Onyenwe anyị, nụrụ ha, ma rube isi n’ihe Ọ gwaworo anyị!

Ebee ka anyị nwere ikeịga ịnụrụ Ya?

Anyị nwere ike gaa na akwụkwọ nsọ. Anyị nwekwara ike nụrụ olu Yan’ime tempụl. Anyị nakwa a nụrụ olu Yan’ụzọ kwere nghọta karịa dịka anyị na-emezi ike anyị ịmata ntaka nke Mmụọ Nsọ. Ma, n’ikpeazụ, anyị na anụrụ olu Yamgbe anyị n’erube isi n’okwu niile nke ndị amụma, ndị ọhụụ ụzọ, na ndị mkpughe.

Gịnị ga-eme dịka ị na a eji ebumnuche ege ntị, nụrụ, ma rube isi n’ihe Onye Nzọpụta kwuworo na ihe Ọ na-ekwu ugbua site n’aka ndị amụma Ya? A na m ekwe nkwa na aga eji ike agbakwunyere agọzi gị iji megide ọnwụnwa, ndọlị niile, na adịghị ike. A na m ekwe nkwa ọrụ ebube n’ime mmekọrịta ezi na ụlọ niile, na ọrụ nke ụbọchị ọbụla. Ma a na m ekwe nkwa na ike gị ịhụta ọńụ ga-amụba ọbụna m’ọbụrụ na ọgba aghara na-abawanye n’ime ndụ gị.

Bipụta