2022
Ha bụ Nke m ma Mụ onwe m Ma Ha
Jenụwarị 2022


“Ha bụ Nke m ma Mụ onwe m Ma Ha,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Jen. 2022.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Janụwarị 2022

“Ha bụ Nke m ma Mụ onwe m Ma Ha”

Moses 1

Foto, oyiyi
Onye inyom nta nọ na igwe mmadụ

Foto sitere n’aka Getty Images

Ọ dịtụla gị ka enweghị ihe ị bụ? E nwere ike ọ dịtụla gị otu a mgbe i cheworo banyere mmadụ ole enwere n’ime ụwa ma ọ bụ lewo anya otu kpakpando ole ndị enwere n’eluigwe. Enwetụla mgbe ị na-eche ma Chineke ọ maara onye ị bụ na ihe ndụ gị dị ka ya n’ezie? Ọ bụrụ otu ahụ, ya mere Moses nwere ozi maka gị.

N’otu ọhụ, Chineke gosiri Moses akụkụ niile nke ụwa na ndị niile dị iche iche bụ ndị ga-ebi ebe ahụ. Ha dịịrị ka “aja dị n’elu ikpere mmiri a na-enweghị ike ịgụta n’ọnụọgụgụ” (Moses 1:28). Mgbe ahụ Chineke gwara Moses na O mewo “ụwa ndị n’enweghị ọnụọgụgụ” (Moses 1:33)—na okike Ya niile gafere ụwa nke a.

Enwere ike ya eju Moses anya mgbe ọ hụrụ ihe ndị a niile. Elemanya o chere: Olee ebe m ga-adaba n’etiti ọtụtụ ihe ndị ekere eke. Ma olee otu Chineke ga-esi hazie ọtụtụ ihe ndị a?

Aziza Chineke dịrịị mfe: “Ihe niile ka a gụrụ ọnụ nye m.” Kedụ? “Ha bụ nke m ma a ma m ha” (Moses 1:35). Chineke maara onye Moses bụ, ọbụna dị ka Ọ maara ụmụ Ya niile, dịkwa ka ihe niile O kere eke. Ha niile bụ nke Ya—kpakpando niile, aja, ma nke ka nke ụmụ Ya nọ n’elu ụwa. Ha bụ ihe kpatara na O mepụtara ụwa. Nzọpụta ebighị ebi ha bụ ọrụ nke Chineke kachasị dị mkpa.

“N’ihi na lee, nke a bụ ọrụ m na ebube m—iweta na mmezu anwụgh anwụ na ndụ ebighi ebi nke mmadụ” (Moses 1:39).

Dị ka nnọọ otu Moses matara ebe ọ dabara n’atụmatụ nke Chineke, gịnwa kwa nwere ike nwee mmasi obi ike na Chineke maara gị! Inyere gị aka laghachikwuru Ya bụ ọrụ na ebube Ya. Maka Gịnị? N’ihi na ị bụ nke Ya. Ma enweghị ihe dị obere banyere nke ahụ!

Bipụta