2022
Ndị Petrak: Ndị Ha Bụrịị na Ihe O ji Dị Mkpa
Febụwarị 2022


“Ndị Petrak: Ndị Ha Bụrịị na Ihe O ji Dị Mkpa,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Feb. 2022.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Febụwarị 2022

Jenesis 11– 50

Ndị Petrak ahụ

Ndị Ha Bụrịị na Ihe O ji Dị Mkpa

Ikekwe ị nụwo maka Abraham, Aịzik, na Jekọb. Anyị na-agụ ihe banyere ha ọtụtụ mgbe niime Akwụkwọ nke Mọmọn ma ịhaghị ịnụkwa ọtụtụ ihe gbasara ha mgbe ị na-amụ Agba Ochie n’afọ nke a. Site na ọtụtụ ohere e nyere ha, ha ga-adịrịrị oke mkpa, ọkwa ya? Mana i nwere ike na-ajụ onwe gị, “Gịnị mere ndịikom atọ biri ndụ puku kwuru puku afọ gara aga jiri dị mkpa ụbọchị taa?” Ọdịmma, ọtụghe nye azịza ahụ dabeere na ọgbụgba ndụ niile dị ebighị ebi na ngọzi niile e kwere na nkwa Chineke nyere ha.

Abraham

Foto, oyiyi
Abraham

Ngosipụta niile site n’aka Jarom Vogel

Abraham bụụrụ nnukwu onye amụma. Ọ bụụrụ onye ezi omume ma na-erube isi nye iwu nsọ niile nke Chineke.

E mere ya baptizim, ọ natara okwa nchụaja, ma a rachiri ya na nwunye ya Sera maka ebighị ebi.

Chineke na Abraham gbara ndụ na agbụrụ ya ga-adị ukwuu ma ga-enwe otu ụdịrị ngọzi ndị ahụ ọ nataworo.

Ha ga-ewegara mba niile nke ụwa ozuzu ozi ọma nke Jizọs Kraịst.

Aịzik

Foto, oyiyi
Aịzik

Aịzik bụ ọkpara Abraham na Sera.

Chineke gwara Abraham ka o were Aịzik chụọ aja. Abraham hụrụ Aịzik naanya mana họrọ irubere Chineke isi. Obere oge tupu Abraham agawa iji Aịzik chụọ aja, onye mmụọ ozi gwara Abraham kwụsị. Ịdị njikere nke Abraham na Aịzik n’irubere Chineke isi bụ ihe eji atụnyere Aja mgbaghara mmehie nke Ọkpara nke Chineke Mụrụ Naanị Ya.

Ekwere Aịzik otu ụdịrị nkwa ndị ahụ e kwere Abraham.

Jekọb

Foto, oyiyi
Jekọb

Dị nnọọ ka nna ya na nna nna ya, Jekọb nwere okwukwe na Chineke.

Niihi ikwesị ntụkwasị obi ya, Onyenwe anyị gbanwere aha Jekọb ị bụ Israel, nke pụtara “onye na-ekwe ka Chineke merie” ma ọ bụ “kwee ka Chineke merie” (lee Ọkọwa okwu Baịbụl, “Israel”).

Jekọb mụrụ ụmụ nwoke 12. Ụmụ nwoke ndị a na ezi na ụlọ ha bụ ndị a maara dị ka ebo niile nke Israel.

Ọgbụgba ndụ nke Chineke na Abraham mere ka e megharịrị ya na Jekọb na ụmụ ya.

Ndị Petrak Ahụ na Gị

Dị ka onye otu nke Nzukọ nsọ ahụ, i so bụrụ ndị ụmụ ụmụ nke Abraham, Aịzik, na Jekọb. Ọgbụgba ndụ nke ha na Chineke gbara metụtakwara gị!

I nwe ngọzi na oke na ọrụ ịgba ama gị banyere Onye Nzọpụta ma kwusaa ozi ọma ahụ.

A kpọkwara gị oku ịkpọku mmadụ niile ime na idebe ọgbụgba ndụ niile ma nata emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja. Onyeisi Russell M. Nelson e kwuwo na ihe niile bụcha akụkụ nke mkpokọta nke Israel, nke “bụ ihe kachasị mkpa a na-eme nelu ụwa taa” (“Olileanya nke Israel,” [worldwide youth devotional, June 3, 2018], 8, ChurchofJesusChrist.org).

Bipụta