2022
Kedụ Otu I Si Anụ olu Ya?
Maachi 2022


“Kedụ Otu I Si Anụ olu Ya? Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Mar. 2022.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Maachi 2022

Kedụ Otu I Si Anụ olu Ya?

Sitere na Ozi ọgbakọ zuruọha nke Eprel 2020.

Foto, oyiyi
iberibe pọzụl
Foto, oyiyi
ndị mmadụ iberibe pọzụl ha n’ezughi ezu

Ngosipụta niile site n’aka Oksana Grivina

Tinyekwara odudu nwere udo nke anyị na-anata n’aka Mmụọ Nsọ ugboro ugboro, Chineke n’eji ike Ya na n’ụzọ nke onwe iji gbaa obi onye ọbụla anyị ume na ọ maara ma hụ anyị anya. Emesịa, n’ime oge ihe isi ike anyị, Onye nzọpụta na-akpọghachi nhụmihe ndịa azụ n’ime uche anyị.

Chee maka ndụ nke onwe gị. Nhụmihe ndịa nwere ike ịbịa n’oge dị mkpa n’ime ndụ anyị ma ọ bụ n’ihe nwere ike ịdị ka ha abụghị mmemme dara ụda. Ihe mwogharị nke mmụọ ndịa na-abịa n’oge dị iche iche ma n’ụzọ dị iche iche, ọ na-abịara onye ọbụla n’ime anyị n’ụzọ onye na nke ya.

Joseph Smith kọwara na mgbe ụfọdụ anyị na-anata “echiche n’otu ntabi anya” ma mgbe ụfọdụ ọ na-asọbata dị ka mmata ihe nke n’enweghi ntupọ.1

Onyeisi Dallin H. Oaks, mgbe ọ na-aza ajụjụ nke otu nwoke onye kwuru na ọ nwetebeghi ụdị nhumihe ahụ mbụ, kwuru, “Enwere ike ekpere gị ka azara ugboro ugboro, mana i dokwasịrị ọchịchọ gị ị hụta ihe ọrụ ebube ma ọ bụ ị nụta olu nke dara ụda nke mere ijiri chee na ị natabeghi aziza ọbụla.”2

Oge n’eteghi aka, anyị a nuwo Onyeisi Russell M. Nelson ka o kwuru: “Ana m akpọ gị ka ichee echiche nke ọma ma mgbe ụfọdụ banyere ajụjụ nke a dị mkpa: Kedụ otu i si anụ olu Ya? Ana m akpọkwa gị ka i mee ihe ị g’eme iji nụrụ olu Ya n’ụzọ kacha mma ma na-anụkwa ya ọtụtụ mgbe.”3

Bipụta