2022
Onye Nzọpụta Na-ata Ahụhụ
Eprel 2022


“Onye Nzọpụta Na-ata Ahụhụ,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Epr. 2022.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Eprel 2022

Onye Nzọpụta Na-ata Ahụhụ

Ọtụtụ narị afọ tupu Jizọs Kraịst abịa, Aịsaịa buru amụma ntaramahụhụ Ya maka mmehie anyị.

kpọrọ asị̀ ma jụ

Foto, oyiyi
E kechiri aka nke Jizọs Kraịst

Mgbe Jizọs Kraịst bịara n’ụwa, ụfọdụ ndị kweere na Ya, ma ọtụtụ ndị ekweghị. Ha ledakwara Ya anya, ma ọtụtụ ndị kpọrọ Ya asị̀. N’ikpeazụ, ndị mmadụ họọrọ ka a taa Ya ahụhụ ma gbuo Ya. (Lee 1 Nefi 19:9.)

o buruwo iru uju anyị niile

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst na-egbu ikpere n’ala n’ime Getsemane

Jizọs Kraịst wekwaara n’onwe Ya ihe mgbu, ọrịa, na adịghị ike anyị niile. O mere nke a ka O wee nwee ike meere anyị ebere ma mara otú Ọ ga-esi nyere anyị aka. (Lee Alma 7:11–13.)

e merụrụ ya ahụ́ n’ihi njehie anyị niile

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst n’elu obe

Jizọs Kraịst tara ahụhụ maka mmehie anyị niile. O mere nke a ka e wee nwee ike ịgbaghara anyị dị ka anyị chegharịrị. (Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:11; 19:15-19.)

n’ihi ọnyá utari ya a gwọwo anyị

Foto, oyiyi
ndị mmadụ na-enwe mmetụta aka nke Jizọs Kraịst a kpọlitere n’ọnwụ

“ọnyá utari Ya” bụ ọnyá Ya. Ndị a na-anọchi anya ahụhụ niile Ọ tachiri obi maka anyị, gụnyere ịwụfu ọbara Ya na ọnwụ Ya. N’ihi na Jizọs Kraịst tara ahụhụ n’ihi anyị, e nwere ike ime ka ahụ́ dị anyị mma ọzọ. Àjà Ya na-eme ka e nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị. Dị ka anyị chegharịrị ma na-agbalị idobe ọgbụgba-ndụ anyị, Ọ na-agwọ anyị ma na-agbanwe anyị. (Lee Mosaịa 3:7-11; Ndepụta nke Okwukwe 1:3.)

Bipụta