2022
Atụla Egwu—Onyenwe anyị Nọnyeere Gị
Julaị 2022


Atụla Egwu, Onyenwe anyị Nọnyeere Gị,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Julaị 2022.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Julaị 2022

Atụla Egwu—Onyenwe anyị Nọnyeere Gị

Ịtụ egwu adịghị ọhụrụ. Kemgbe oge mgbe ochie niile, ịtụ egwu ebelatawo echiche nke ụmụ nke Chineke. N’ime Ndị Eze 2, eze Sirịa ezipuwo otu ndị agha ijide ma gbuo onye amụma Elisha.

“Ma mgbe nwa odibo nke [Elisha] biliri n’oge, ma gawo niihu, lee, igwe mmadụ ji ma ọtụtụ ịnyịnya ma ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya gbaa obodo ahụ gburugburu. Ma nwa odibo [Elisha] gwara ya sị, Ewoo, nna m ukwu! Olee otu anyị ga-esi mee?” (2 Ndị Eze 6:15).

Nke ahụ bụ ịtụ egwu na-ekwu okwu.

“Ma [Elisha] zaghachịrị, Atụla egwu: n’ihi na ha bụ ndị na-anọnyere anyị karịrị ha bụ ndị na-anọnyere ha.

“Ma Elisha kpere ekpere, ma sị, Onyenwe anyị, a rịọ m gị, meghee anya ya, ka o wee hụ ụzọ. Ma Onyenwe anyị meghere anya nke nwata nwoke ahụ; ma ọ hụrụ ụzọ: ma, lee, ugwu ukwu ahụ jupụtara n’ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya ọkụ gbara Elisha gburugburu” (2 Ndị Eze 6:16-17).

Anyị nwere ike ma ọ bụ enweghị ike nwee ụgbọ ịnyinya nke ọkụ ezitere ichụpụ ịtụ egwu anyị ma merịe mmụọ ọjọọ anyị, mana nkuzi ahụ doro anya. Onyenwe anyị nọnyeere anyị, buru anyị n’uche, ma na-agọzi anyị n’ụzọ ndị naanị Ya nwere ike ime.

Ọ bụrụ na anyị gbalịsie ike tụkwasị obi n’ime Onyenwe anyị na n’ụzọ Ya niile, ọ bụrụ na anyị nọrọ n’ọrụ Ya, anyị agaghị atụ egwu usoro niile nke ụwa ma ọbụ nwee nsogbu site na ha. Onyenwe anyị n’eche anyị nche, n’elekọta anyị, ma na-anọgidere anyị.

Bipụta