2022
Oriọna nye Ụkwụ Anyị
Ọgọst 2022


“Oriọna nye Ụkwụ Anyị,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Ọgọ. 2022.

Ozi Kwa Ọnwa Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Ọgọst 2022

Oriọna nye Ụkwụ Anyị

Ihe gbasara onye niile maka ndị Israel mgbe gboo nwere ike ikuziri anyị otu Onyenwe anyị na-esi edu anyị.

Foto, oyiyi
mmanụ ọkụ oriọna

Eziokwu

Na oge Agba Ochie, ndị dị iche iche jiri mmanụ ọkụ oriọna na-amụ ọkụ n’ọchịchịrị. Ọtụtụ niime oriọna ndị a nwere agwara ntọala atọ:

  1. Otu efere ụrọ iji jide mmanụ oliv; na-adịkarị ntakịrị nke ọma ijigide n’ọba aka nke mmadụ

  2. Otu olilo eriri ọkụ a ga-amụnye mgbe ọ mịtachara mmanụ ahụ

  3. Otu ọnụ ma ọ bụ ebe pịrị ọnụ n’isi ijide eriri ọkụ ahụ

Mmanụ ọkụ oriọna niile dị mfe nwere naanị otu eriri ọkụ ga-enye ihe naanị nzọ ụkwụ ole ma ole na gburugburu ha. Ọ bụrụ na-ejiri ya mgbe a na-ejegharị gburugburu, ha ga-enye naanị ihe ga-ezu ịhụ otu nzọ ụkwụ nọ niihu gị onwe gị nke ga-eme ka i nwee ike gagharịa nke ọma niime ọchịchịrị.

Ihe Anyị Nwere ike Ịmụta

Foto, oyiyi
Jizọs Kraist jidere mmanụ ọkụ oriọna

E jiri mee ihe site n’ikike. Duo, N’ihe Nke ịhụnaanya, site n’aka Simon Dewey. Ezi ụma nke altusfineart.com © 2022.

Okwu nke Onyenwe anyị nwere ike inye ụzọ anyị ihe site n’ọchịchịrị ahụ na mgbagwoju anya nke gbara anyị gburugburu niime ụwa.

Onyenwe anyị agwawo anyị ka anyị hapụ ikpuchi ihe anyị kama ka anyị na-eburu ihe nke ozi ọma ka ndị ọzọ nwee ike hụ ya (lee Matiu 5:14-16).

Ọ dị anyị n’aka ị hụ na oriọna anyị juputara na mmanụ ọkụ (lee Matiu 25:1–13). Anyị na-eme nke a site na ekpere, ịmụ akwụkwọ nsọ, ozi, isoro onye amụma, na ihe omume ndị ọzọ na-egosi okwukwe na nnukwu ịhụnaanya (lee Spencer W. Kimball, Okwukwe N’eburu ụzọ tupu Ọrụ ebube [1972], 256).

Ọ bụrụ na anyị etinye okwukwe n’ọrụ, Onyenwe anyị mgbe ụfọdụ na-enye ụzọ ụkwụ anyị ihe nke ga-ezuru anyị nnọọ ịzọpụkwa otu nzọm ụkwụ ọzọ (lee Boyd K. Packer, “Oriọna Ahụ nke Onyenwe anyị,” Ensign, Jan. 1983, 54).

Bipụta