2023
Anyị O Kwesịrị Izu Oke Ugbu a?
Febụwarị 2023


“Anyị O Kwesịrị Izu Oke Ugbu a? Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Feb. 2023.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Febụwarị 2023

Anyị O Kwesịrị Izu Oke Ugbu a?

Sitere na Ozi ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2017.

Foto, oyiyi
onye ikom nta na-agụ akwụkwọ nsọ

Ngosipụta niile sitere n’aka Emily E. Jones

E dere akwụkwọ nsọ niile iji gọzie ma gbaa anyị ume, ma nke eziokwu ha na-eme otu ahụ. Mana ị chọpụtawo na n’ọge nke a niile ma ọbụ mgbe ọzọ otu akụkụ n’apụta nke n’echetere anyị na anyị na-adatụ mba obere? N’ọmụmaatụ: “Ya mere unu kwesịrị izu oke, ọbụna dị ka Nna unu … bi n’eluigwe si zuo oke” (Matiu 5:48). Site na iwu nsọ ahụ, anyị chọrọ ịlaghachi azụ n’akwa ụra ma jiri akwa mkpuchi kpuchie isi anyị. Ụdị ebumnuuche celestial a yiri ka ọ karịrị aka anyị. Otu ọ dị n’ezie Onyenwe anyị agaghị ma ọlị enye anyị iwu nsọ Ọ maara na anyị agaghị enwe ike edebe.

Foto, oyiyi
nwainyom nta ji nche anwụ na mmiri ozuzo

“Ee, bịakwutenụ Kraịst, ma zuo oke nime ya,” Moronaị na arịọ. “Hụ Chineke naanya jiri ike gị niile, uche gị niile na ume gị niile, emesịa … site n’amara ya unu nwere ike zuo oke n’ime Kraịst” (Moronaị 10:32; ihe agbakwunyere). Naanị olileanya anyị maka ezi izu oke bụ na-ịnata ya dị ka onyinye sitere n’eluigwe—anyị enweghị ike “irite” ya.

Foto, oyiyi
nwainyom nta n’eje ije na mgbago ugwu nta ya na nkịta

Ewezuga maka Jizọs, ọ dịbeghị arụmarụ ọbụla ndị na-enweghị ntụpọ na njem elu ụwa a anyị na-eje, ya mere na ndụ anụ ahụ ka anyị gbalịa maka ọganiihu na-aganiihu ma zere atụmaanya niile gafere oke nke onwe anyị na ndị ọzọ.

Foto, oyiyi
ụgbọ mmiri dị na oke osimiri ebilimmiri na achị

Ọ bụrụ anyị nọgidesie ike, emesịa n’otu ebe na ndụ ebighị ebi nńụcha anyị ka a ga-emecha ma ya ezuo oke—nke bụ nkọwa Agba Ọhụrụ nke izu oke.

Bipụta