2023
Mepee Obi Gị nye Mmụọ Nsọ ahụ
Eprel 2023


“Mepee Obi Gị nye Mmụọ Nsọ ahụ,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Apr. 2023.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Eprel 2023

Mepee Obi Gị nye Mmụọ Nsọ ahụ

N’oge Ista nke a, Ana m ekele Nna anyị nke Eluigwe maka onyinye nke Ọkpara Ya Ọ Hụrụ n’anya, onye bịara n’afọ ofufo n’ụwa ka ọ bụrụ Onye Mgbapụta anyị. E nwere m obi ekele ịmara na O tụrụ aja maka mmehie anyị niile ma wee bilie na Mbilite n’ọnwụ. Kwa ụbọchị A na-agọzi m ịmara na, nihi Aja mgbaghara mmehie Ya, enwere m ike ịkpọlite otu ụbọchị ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime ezinụlọ dị ịhụnanya.

Ama m ihe ndị ahụ site na naanị ụzọ onye ọbụla n’ime anyị nwere ike ịmara ha. Mmụọ Nsọ ahụ agwawo uche na obi m na ha bụ eziokwu—ọbụghị naanị otu ugboro kama ọtụtụ mgbe.

Anyị nwere nkwa dị oke ọnụ ahịa nke Mmụọ Nsọ dị ka onye nsiso. Ọrụ anyị bụ ịhọrọ imeghe obi anyị ịnata ntụziaka na nkasi obi na-aga n’ihu site na mmụọ nsọ n’oge ndụ anyị niile.

Foto, oyiyi
ifuru

Ngosipụta niile sitere n’aka Emily E. Jones

Nhọrọ nke mbụ bụ ịdị umeala n’obi n’ihu Chineke.

Foto, oyiyi
aka ndị na-ekpe ekpere

Nke abụọ bụ na-ekpe ekpere n’okwukwe n’ime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.

Foto, oyiyi
kompas

Nke atọ bụ irube isi kpọmkwem.

Foto, oyiyi
ụdị obi

Ma nke anọ bụ ikpe ekpere ka ịmata mkpa na obi nke ndị ọzọ na otu esi enyere ha aka maka Onyenwe anyị.

Eji m obi m niile na-ekpe ekpere ka ị nụ olu nke Mmụọ ahụ, nke ezitere gị na mmesapụ aka. Ma ana m ekpe ekpere ka ị meghee obi gị mgbe niile ịnata Mmụọ ahụ ka ị wee nwee ọńụ nke ịnwe Ya dị ka onye nsiso gị mgbe niile.

Bipụta