2023
Ugbua Ka Kraịst Bilitere n’Ọnwụ
Septemba 2023


“Ugbua Ka Kraịst Bilitere n’Ọnwụ,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Sept. 2023.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Septemba 2023

Ugbua Ka Kraịst Bilitere n’Ọnwụ

Mụọ ihe Onyeozi Pọl kuziri gbasara Mbilite N’ọnwụ nke Jịzọs Kraịst.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst bilitere n’ọnwụ

Jizọs Kraịst Bilitere n’Ọnwụ, nke si n’aka Wilson J. Ong

ugbua ka Kraịst bilitere site na ndị nwụrụ anwụ

Jizọs Kraịst nwụrụ n’elu obe, elie ya niime ili, ma bilite site na ndị nwụrụ anwụ n’ụbọchị nke atọ.

mkpụrụ mbụ site niime ndị ahụ rahụrụ ụra

Mkpụrụokwu Griik e jiri mee ihe ebe a maka mkpụrụ mbụ niile pụtara akụkụ ubi nke afọ e buru ụzọ kụọ. Ọ bụ nke mbụ e buru ụzọ wee n’ubi—nke mbụ n’ọtụtụ ndị ọzọ ga-abịa.

Nkebiokwu ahụ ndị ahụ rahụrụ ụra pụtara “ndị ahụ na-anwụwo.”

Jizọs Kraịst bụụrụ onye mbụ bilitere n’ọnwụ, ma mgbe Mbilite n’ọnwụ Ya gasịrị, ndị niile ga-ebilite n’ọnwụ.

site na mmadụ ka ọnwụ siri bịa

Nke a na-ekwu maka Adam. Ọdịda ya pụtara na mmadụ niile ndị ga-abata n’ụwa ga-anwụ anwụ. (Lee Moses 1:39.)

niime Kraịst ka onye niile ga-esi dị ndụ

Niihi Mbilite n’ọnwụ nke Jịzọs Kraịst, mmadụ niile gakwa ebilite n’ọnwụ. Nke ahụ pụtara na onye ọbụla nke biworo ndụ ma ọ bụ ga-adị ndụ ga-ebilite n’ọnwụ. Mmụọ anyị na ahụ anyị ga-ejikọta ọnụ, ma ahụ anyị ga-ezu oke ma gakwaghị anwụ anwụ. (Lee Alma 11:43–45.)

Bipụta