2023
Were Mmụọ ahụ maka Onye Ndu Gị
Ọktoba 2023


“Were Mmụọ ahụ maka Onye Ndu Gị,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Oct. 2023.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Ọktoba 2023

Were Mmụọ ahụ maka Onye Ndu Gị

Site na ozi enyere na ọgbakọ zuru ọha nke Eprel 2017.

Nna anyị nke Eluigwe maara na noge ndụ anụ ahụ nke a anyị ga-ezute ihe ịma-aka, mkpagbu, na ọgba-aghara niile; Ọ maara na anyị na ajụjụ, ndakpọ olileanya, ọnwụnwa, na adịghị ike niile ga-agba mgba. Iji nye anyị ike nke anụ arụ na nduzi dị nsọ, O nyere Mmụọ Nsọ ahụ.

Site n’ọrụ dị nsọ, Mmụọ ahụ na-akpali, na-agba ama, na-akuzi, ma na-akpate anyị ije ije n’ihé nke Onyenwe anyị. Anyị nwere oke na ọrụ dị nsọ ịmụta ịmata mmetụta Ya nime ndụ anyị niile ma zaghachi.

Kedụ ka anyị ga-esi eme nke a?

Nke mbụ, anyị ga-agbalịsi ike ibi ndụ ndị kwesịrị Mmụọ ahụ.

Nke abụọ, anyị ga-enwerịrị mmasị ịnabata Mmụọ ahụ.

Nke atọ, anyị ga-amarịrị Mmụọ ahụ mgbe ọ biara.

Nke anọ, anyị ga-emerịrị ihe site na mkpalite mbụ.

Ka anyị were ọkpụkpọ nke Onyenwe anyị “norọ nụ n’ezigbo ọn̄ụ, n’ihi na a ga m eduru unu na-aga” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:18.). O na-edu anyị site na Mmụọ Nsọ ahụ. Ka anyị bie nso nye Mmụọ ahụ, na-eme ngwa ngwa na mkpali mbụ anyị niile, ebe anyị maara na ha sitere na Chineke. A na m agba akaebe nke ikike nke Mmụọ Nsọ idu anyị, ma nọnyere anyị mgbe ebigh ebi.

Bipụta