Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa
A Bụ M Onye Na-Eso Ụzọ Jizọs Kraịst
Jenụwarị 2024


“A bụ M Onye Na-Eso Ụzọ Jizọs Kraịst,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Jan. 2024.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Jenụwarị 2024

A Bụ M Onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst

I nwere ike isoro Onye Nzọpụta ma gbasaa okwu Ya nye ndị ọzọ.

Foto, oyiyi
Logo Isiokwu Ndị Ntoroọbịa 2024

Enwetuwo mgbe I chere echiche ihe mere, mgbe a gwọchara ndị mmadụ, Jizọs gwara ụfọdụ niime ha ka ha ghara ịgwa onye ọbụla (lee Mak 7:36)? Otu ihe mere nwere ike ị bụ ụdị ndị na-eso ụzọ Ọ chọrọ. I nwere ike chee na ọ bụrụ na ndị mmadụ e kwuo okwu gbasara ọgwụgwọ ha ọ ga-abụ ụzọ dị mma maka Jizọs ịdọta ndị na-eso. Otu osila dị, Jizọs achọghị nnọọ ndị na-eso. Ọ chọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.

Jizọs sịrị Pita na Andru, “Soronụ m” (Matiu 4:19). Ntụgharị asụsụ Josef Smit nke amaokwu ahụ sịrị, “Abụ m ya onye nke e deworo site naka ndị amụma; soronụ m” (Ntụgharị asụsụ Josef Smit, Matiu 4:18 [niime Matiu 4:19, nkọwada a]). Ọkpụkpọ oku ahụ abụghị ije kpakwuje Ya ọrịrị obere oge. Ọ chọrọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Ya ruo ebighị ebi.

Ọ chọghị nnọọ ka ha na-ele Ya ị na-akuziri ndị mmadụ ihe, ahụ ndị mmadụ naanya, ma na-arụ ọrụ ebube niile. Ọ chọrọ ka ha meekwa otu ahụ. Ọ chọrọ ka ọrụ Ya ghọọ ọrụ ha. Ịhọrọ Kraịst pụtara na ha ga-amụ ije ozi dị ka O si jee ma chee echiche dị ka O si chee. Ha ga na-amụ i bi ndụ dị ka O biri, ma Ọ ga-akuziri ha ihe ma nye ha enyem aka ha chọrọ iji dịkarịa ka Ya.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst

Mkpụrụokwu Grik maka onye na-eso ụzọ bụ mathetes Ọ pụtara karịa ị bụ onye na-eso ma ọ bụ nwa akwụkwọ. Ọtụtụ mgbe a na-asụgharị ya dị ka onye na-amụ ọrụ. N’ụbọchị nke Kraịst, ndị na-eso ụzọ otu ọ dị nnọọ na-ahọrọ nna ukwu site n’onye ha chọrọ i soro mụọ ihe ma na-atụanya ịghọ ndị nna ukwu n’onwe ha. Kraịst esoghị ụdịrị otu ahụ a maara esi eme ihe. Ọ tụgharịrị ya ma kma chọpụta ndị na-eso ụzọ Ya. Taa, Kraịst na-akpọku anyị ịbịakwute Ya. Ọ na-akpọ anyị ị bụ ndị na-eso ụzọ Ya ma maa ọkwa okwu Ya n’etiti ndị Ya ka ha wee nwee ndụ ebighị ebi (see 3 Nefi 5:13).

Otu onyeinyom nta sitere na Haiti dị na Caribean gosịrị ọchịchọ ya ị bụ onye na-eso ụzọ Kraịst site na ịkpọku enyị ya onye nke na-abụghị onye otu Nzukọ nsọ isoro ya gaa ọgbakọ FSY. Na mbụ nna enyi ya achọghị inye nwa ya nwanyị ikikere ịga. Ndị ndu Nzukọ nsọ kọwara ihe gbasara nhụmiihe bara uru nke chebiiri ya na ndị dimkpa nta ndị ndụmọdụ dị ịtụnaanya ndị ga-elekọta ha. Nna ahụ nyere ikike maka nwa ya nwanyị i soro jee, ma mgbe ọ hụchara ihe dị iche o mere na ndụ ya, o nyekwara ya ikike ịga ọgbakọ niile nke Nzukọ nsọ—ka ọnwa isii gachara—mee baptizim.

Otu onyeinyom nta sitere na Haiti dị South America gosịrị ọchịchọ ya ị bụ onye na-eso ụzọ Kraịst site na-ike kandi ya ya na otu enyi dị ka ha gbakọrọ bọs na-aga ụlọakwụkwọ. Mgbe ọ bịarutere ebe a na-ere kọfị na-esi isi ụtọ, ọ kọwara na o nwetụbeghị mgbe ya malitere ito akpịrị maka isi ụtọ ahụ ebe na-enweghị onye nọ na ezi na ụlọ ya na-ańụ kọfị. Nke ahụ dubara na nkata gbasara Nzukọ nsọ ahụ, nke dubara na ọkpụkpọ oku ị na-abịa nzukọ niile, nke mechara duba enyi ya na-isonye Nzukọ nsọ ahụ na ije ozi mgbasa ozi ọma na Chile.

Ọ bụghị onye ọbụla ị gwara okwu gbasara Nzukọ nsọ ma ọ bụ kpọkuo ịbịa ihe omume na Nzukọ nsọ ga-achọ isonye. Ọ dị Mma. Ọ bụghị onye niile Kraịst gwara okwu n’oge ije ozi Ya n’ụwa sonye kwara. Otu ọ dị, dị ka anyị na-ahọrọ ịbụ ndị n’eso ụzọ nke Jizọs Kraịst ma maa ọkwa okwu Ya, Ọ ga-enye anyị mgbam ume na ike si na chi. Anyị ga-amụ otu a ga-esi adịkarị ka Ya, ma nke ahụ bụ ihe ndị na-eso ụzọ na-eme.

Bipụta