Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa
Ana M Ebi ndụ “site n’Ụdị usoro nke An̄ụrị”?
Febụwarị 2024


“Ana m ebi ndụ ‘site nỤdị Usoro nke An̄ụrị’?,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Feb. 2024.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Febụwarị 2024

2 Nefi 5

Ana M Ebi ndụ “site ncỤdị usoro nke An̄ụrị”?

Ndị a bụ ụfọdụ echiche maka gị ibi ụdị ndụ Nefi kwuru ndị ya biri.

Foto, oyiyi
ndị ntoroọbia

Ngosipụta site n’aka Alyssa González

Ngwa ngwa mgbe ekewachara site na ndị Laman, Nefi sịrị na ndị ya “biri ndụ site n’ụdị usoro nke an̄ụrị” (2 Nefi 5:27). Ị na-eche na e nwere ndị otu ọzọ ndị chọburu igbu ha(lee 2 Nefi 5:1–6, 14), nke a nwere ike dị ịtụnaanya. Kedụ otu onye ọbụla nwere ike iji enwe obi ụtọ nọnọdụ ndị dị otu ahụ?

Nke mbụ, mata na “anyị biri ndụ n’ụdị usoro nke ọńụ” apụtaghị na “onye ọbụla na ndị Nefi nwere obi ụtọ 24/7.” Ọ pụtara na ha biri ndụ n’ụzọ dị ańaa ma mee ụdị ihe dị iche iche, nke n’ụzọ nille na-eduba na ańụrị. Achịkọta ihe niile, na-agbanyeghị ihe aka mgba niile ha nwere, ọ bụụrụ oge obi ụtọ.

Ya mere gịnị bụ “ụdị usoro nke an̄ụrị”? Olee otu anyị nwere ike iji emegharị ya niime ndụ nke onwe anyị, bụ nke nwekwara ọtụtụ ihe aka mgba? Ka anyị lee anya!

  • Nwee nrube isi. “Anyị chetara idebe … iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị” (2 Nephi 5:10).

    Ibi ndụ ozi ọma bụ Nzọ ụkwụ 1. I nwere ike ịnọ n’ọnọdụ inwe obi ụtọ niime mmehie nke na-anaghị adịgide, mana ọ gaghị anọte aka. Ị na-akpachara anya enupuru Chineke isi abụghị “ụdị usoro nke an̄ụrị” (lee Alma 41:10).

  • Nyochagharịa akwụkwọ nsọ. “Mụ onwe m, Nefi, ewetawo … ndekọihe niile bụ ndị akanyere n’elu epekele niile nke bras” (2 Nefi 5:12). “Anyị … chọgharịrị ha ma chọpụta na ha na-enye mmasị; ee, ọbụna baa nnukwu uru nye anyị” (1 Nefi 5:21) .

    Ndị nke Nefi nwererịị akwụkwọ nsọ. Ma ọ bụghị naanị na ha nwere ha—ha nyochagharịrị ha.

  • Gee ndị ndu nwere mkpatemmụọ ntị. “Mụ onwe m, Nefi, doro Jekọb na Josef nsọ, ka ha bụrụ ndị nchụaja na ndị nkuzi na-achị … ndị m” (2 Nefi 5:26).

    Ndị nkuzi ndị a jiiri akwụkwọ nsọ dị ka ihe na-edu ha (lee 2 Nefi 4:15; 6:4).

  • Gaa na tempụl (na ebe ndị ọzọ dị nsọ). “Mụ onwe m, Nefi, wuru otu tempụl” (2 Nefi 5:16).

    Ọ dị mkpa inwe ebe nsọ niile dị ka ụlọ ọgbakọ niile na tempụl niile maka ndị na-eso ụzọ ịgbakọta ma fee ofufe. (Anyị nwere ike na-eche na ndị Nefi abụghị naanị na ha nwere otu tempụl—ha jiri ya mee ihe n’ezie.) Ọ bụrụ na i nweghị ike ịga tempụl n’onwe gị, i nwere ike ịrụ ọrụ agụgụala ezi na ụlọ mgbe niile.

  • Mee ihe n’onwe gị. “A kuziiri m ndị m iwu ọtụtụ ụlọ, na ịrụ ọrụ. … [Mụ onwe m] mere ka ndị m bụrụ ndị na-agba mbọ, ma na-eji aka ha na-arụ ọrụ” (2 Nefi 5:15, 17).

    Otu akụkụ nke “ụdị usoro nke ańụrị” bụ inwe ihe ị ga-eme! Ọrụ e nyere ịrụ, otu ọrụ, otu oke na ọrụ—ihe ọbụla na-eme ka i nwee nlekwasị anya na ebumnuuche (nwere oge dabara adaba iji jee zuo ike, nezie). Ọ na-ara ahụ inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ike na-agwụ gị mgbe niile.

Ị ga-asị na ị na-ebi ndụ n’ụdị usoro nke an̄ụrị noge a? Ma ọ bụghị otu a, ikekwe ọmụmaatụ nke Nefi nwere ike inye gị ụfọdụ uche banyere otu esi akarị eme nke ọma.

Bipụta