Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa
Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Ozi nke Onye Nzọpụta nye Unu
Maachị 2024


“Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Ozi nke Onye Nzọpụta nye Unu,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa:, Mar. 2024.

Ozi Kwa Ọnwa Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Maachị 2024

Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Ozi nke Onye Nzọpụta nye Unu

Nduzi nke a na-enyere unu aka ijikọ nhọrọ unu na Jizọs Kraịst na ozizi Ya.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst

M Guzoro na Ọnụ ụzọ ma Kụọ aka, site n’aka J. Kirk Richards

Were ya na ị bi niime Galili oge ochie afọ 2,000 gara aga. A kpọwo gị na ndị enyi gị ka unu bịa n’ofufe ndị ntoroọbịa n’ụlọ nzukọ dị n’ogbe unu, nke nwere ọka okwu ọbịa pụrụ iche: Jizọs nke Nazareth. Ma n’otu oge n’ozi Ya, Jizọs na-akpọku ndị ntoroọbịa na-ege ntị ka ha jụọ Ya ajụjụ.

O lee ụdị ajụjụ ndị i chere na i nwere ike ịnụ?

E chere m na ụfọdụ ajụjụ ga-egosipụta omenaala na ọnọdụ niile nke oge ahụ. Mana M kwenyere n’ezie na ọtụtụ niime ha ga-akacha ehi ụda dị ka ajụjụ ndị anyị nwere taa.

N’ịmaatụ, na Agba Ọhụrụ, ndị mmadụ jụrụ Onye Nzọpụta ajụjụ dị ka ndị a:

  • Gịnị ka m kwesịrị ime iji nweta ndụ ebighị ebi?1

  • A nabatara M? Eso M Biri?2

  • Ọ bụrụ na nwanne m nwoke emehie megide m, ugboro ole ka m ga-agbaghara ya?3

  • Gịnị ga-eme ụwa nke a n’ọdịniihu? Aga m enwe nchekwa?4

  • I nwere ike ịgwọ onye m hụrụ n’anya?5

  • Gịnị bụ eziokwu?6

  • Kedụ ka m ga-esi mara ma m na-aga n’ụzọ ziri ezi?7

Ọ bụ na anyị anaghị eche otu ụdị ihe ahụ site n’oge ruo n’oge? Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ajụjụ ndị ahụ agbanwebeghị nnukwu. Ma ọbụghịkwa ma ọmịiko nke Onye Nzọpụta n’ebe ndị na-arịọ ha nọ. Ọ maara otu ndụ nwere ike isi na enye nsogbu ma na-agbagwoju anya. Ọ maara ịdị mfe ọ dị ifu n’ụzọ anyị. Ọ maara na anyị na-echegbu onwe anyị mgbe ụfọdụ banyere ọdịniihu. Ma Ọ na-agwa mụ na gị, dị ka Ọ gwara ndị na-eso ụzọ Ya n’oge gara aga:

  • “ Ka obi unu ghara ịlọ mmiri.”8

  • “A bụ m ụzọ ahụ [na] eziokwu ahụ.”9

  • “Soronụ M.”10

Mgbe i nwere nhọrọ ndị dị mkpa ime, Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya eweghachitere bụ nhọrọ ndị kachasị mma. Mgbe i nwere ọtụtụ ajụjụ, Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya eweghachitere bụ azịza ndị kachasị mma.

Nke a mere m ji hụ Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile naanya. Ọ na-atụrụ anyị aka na Jizọs Kraịst ka anyị nwee ike nata ume Ya. Ana m edebe otu kọpị niime akpa m mgbe niile. Dị ka m na-ezute ndị mmadụ na gburugburu ụwa niile ndị chọrọ ịma ihe kpatara anyị, dị ka ndị otu Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst, ji na-eme ihe anyị na-eme, ana m akọrọ ha ihe banyere ntuziaka nke a.

Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa na-akuzi eziokwu ndị dị ebighị ebi gbasara Onye Nzọpụta na ụzọ Ya. Ọ na-akpọku gị ka i mee nhọrọ ndị dabeere na eziokwu ndị ahụ. Ma ọ na-akọwa ngọzi niile ekwere na nkwa nke Ọ na-eme ka orute ndị na-eso Ya. Biko gụọ, tụgharịa uche, ma kọsaa ntuziaka nke a!

Kpọbata Ya

Jizọs Kraịst chọrọ ịbụ akụkụ nke ndụ gị—na-adịgide adịgide, na-adị kwa ụbọchị, n’oge ndị dị mma na oge ndị dị njọ. Ọ bụghị naanị na ọ na-eguzo na njedebe nke ụzọ ahụ, na-eche ka irute Ya nso. Ọ ga-eso gị na-aga na nzọ ụkwụ ọbụla nke ụzọ ahụ. Ọ bụ Ụzọ ahụ!

Mana Ọ gaghị amanye ụzọ Ya niime ndụ gị. Ị na-akpọbata Ya, site na nhọrọ gị niile. Nke a bụ ihe mere ntuziaka maka ime nhọrọ niile, dị ka Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa, ji baa oke uru. Oge ọ bụla ị na-eme nhọrọ ziri ezi dabeere na eziokwu niile dị ebighị ebi nke Onye Nzọpụta, ị na-egosi na ị chọrọ Ya niime ndụ gị. Nhọrọ ndị ahụ na-emeghe ọnụ ụzọ ama nke eluigwe, ma ike Ya na-abịa na-agbaba niime ndụ gị.11

Mee Njikọ Siri Ike

Ị nwere ike icheta na Onye Nzọpụta jiri ndị na-anụ ma na-eme okwu Ya niile tụnyere nwoke amamiihe ahụ onye “wuru ụlọ ya n’elu nkume.” Ọ kọwara:

“Mmiri ozuzo gbadatara, ma ide mmiri niile bịara, ma ifufe niile fere, ma tikwasi ụlọ ahụ; ma ọ daghị, n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu nkume.”12

Ụlọ anaghị anya ndụ n’oke ifufe n’ihi na ụlọ ahụ siri ike. Ọ naghịkwa anya ndụ naanị n’ihi na oke nkume ahụ siri ike. Ụlọ ahụ na-alanarị oke ifufe n’ihi na ejikọtasiri ya ike na nkume ahụ siri ike. Ọ bụ ike nke njikọ na nkume ahụ bụ ihe dị mkpa.

N’otu aka ahụ, ka anyị na-ewuli ndụ anyị, ọ dị mkpa ime nhọrọ ndị dị mma. Ma ọ dị mkpa ịghọta eziokwu dị ebighị ebi nke Onye Nzọpụta. Mana ike nke anyị ga-achọ iji guzogide oke ifufe nke ndụ na-abịa mgbe anyị jikọtara nhọrọ anyị niile na Jizọs Kraịst na ozizi Ya. Nke ahụ bụ ihe Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa na-enyere anyị aka ime.

Na ịmaatụ, ndị enyi gị nwere ike mara na ị na-agbalị ka ị ghara iji okwu mkparị ma ọ bụ na-akpasu iwe. Ha nwere ike hụ ka ị na-agakwuru nwatakịrị ahụ nọ n’ụlọ akwụkwọ nke ọtụtụ ndị mmadụ na-eleghara anya nnọọ ma ọbụladị na-emegbu ya. Mana ha ma na i na-eme nhọrọ ndị a n’ihi na Jizọs Kraịst kụziri na “mmadụ niile bụ ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwanyị—gụnyere … ndị dị iche na ebe ị nọ”?13

Ndị enyi gị nwere ike mara na ị na-aga ụka kwa Sọnde. Ha nwere ike ịhụ mgbe ị gbanyụrụ otu egwu a maara amara ma ọ bụ jụ ọkpụkpọ oku ikiri ụfọdụ ihe nkiri dị ańaa. Mana ha maara na ị na-eme nhọrọ ndị a n’ihi na ị nwere “mmekọrịta ọgbụgba ndụ nke ọńụ gị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst,” ma na dị ka akụkụ nke nkwa ahụ iso Onye Nzọpụta, i nwere obi ekele “inwe Mmụọ Nsọ dị ka onye nsiso gị mgbe niile”?14

Ndị mmadụ nwere ike ịma na ị naghị ańụ mmanya ma ọ bụ ańụ siga ma ọ bụ na-ańụ ọgwụ ndị ọzọ na-emerụ ahụ. Mana ha maara na i na-eme nhọrọ ndị a n’ihi na Jizọs Kraịst kuziri na “ahụ gị dị nsọ,” “onyinye dị ịtụnanya sitere n’aka Nna gị nke Eluigwe, nke e mere n’oyiyi Ya?15

Ndị enyi gị nwere ike ịma na ị gaghị aghọ aghụghọ ma ọ bụ tụọ asị ma na ị na-eji agụmakwụkwọ kpọrọ ihe. Mana ha maara na nke a bụ n’ihi na Jizọs Kraịst kuziri na “eziokwu ga-eme ka ị nwere onwe gị”?16

Karịsịa ihe niile, ndị enyi gị ha maara na ị na-eme nhọrọ ndị a na-adịghị amasị ọha na eze mgbe ụfọdụ iji nọgide n’eziokwu na-agbaso ụkpụrụ niile nke Kraịst n’ihi na ị maara na “Jizọs Kraịst bụ ike gị”?17

Ọ bụ Ike Gị

Ana m agbara unu aka ebe dị ire na Jizọs Kraịst bụ Ụzọ ahụ na-eduba na ọdịniihu na-egbuke egbuke ma dị ebube—ọdịniihu gị. Ma Ọ bụ kwa Ụzọ ahụ na-eduba n’oge ugbua na-egbuke egbuke ma dị ebube. Jee ije n’ụzọ Ya, ma Ọ ga-eso gị jee ije. I nwere ike ime nke a!

Ezigbo ndị enyi m na-eto eto, Jizọs Kraịst bụ ike unu. Na-eso Ya na-ejegharị, ma Ọ ga-enyere gị aka fegharịa “jiri nku dị ka nke ugo”18 chee ihu n’ọńụ dị ebighị ebi nke Ọ kwadobere maka gị.

Bipụta