Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa
Kedụ N’ezie Nkwa Anyị Na-ekwe Mgbe A Na-eme Anyị Baptizim?
Jun 2024


“Kedụ n’ezie nkwa anyị na-ekwe mgbe a aa-eme anyị baptizim?,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Jun 2024.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Jun 2024

Kedụ N’ezie Nkwa Anyị Na-ekwe Mgbe A Na-eme Anyị Baptizim?

Foto, oyiyi
baptizim

Baptizim, site n’aka Annie Henrie Nader

Akwụkwọ nsọ na-akụziri anyị na mgbe e mere anyị baptizim, anyị na-agba ndụ (ma ọ bụ kwee nkwa) na anyị ga-adị njikere iwekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst, jeere Chineke ozi, ma debe iwu nsọ Ya. (lee Mozaya 18:10; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37, 77).

Anyị na-amụtakwa niime akwụkwọ nsọ na baptizim na-enyere anyị aka imezu ọchịchọ anyị “ịbata n’otu nke Chineke, na ka a na-akpọ [anyị] ndị nke ya” (Mozaya 18:8). Na-ikwu ya n’ụzọ ọzọ, otu ihe mere e ji mee anyị baptizim bụ na anyị chọrọ isonye na Nzukọ nsọ ​​nke Jizọs Kraịst ma rite ihunaanya na nsonye nke na-abịa site na-ịdị n’otu niime Kraịst.

Mkpebi ijere Onyenwe anyị ozi na idobe iwu nsọ Ya nwere ike ịgụnye ọtụtụ ihe gburugburu ndụ anyị. Na ịmaatụ, ọ gụnyere ị “dị na njikere iburita ibu arọ onye ọbụla nye ibe ya, … isoro ndị n’eru uju ruo uju; ee, kasịe obi ndị ahụ nọ na mkpa nkasị obi, na iguzoro dị ka ndị aka ebe nke Chineke n’oge niile na n’ihe niile, na n’ebe niile” (Mozaya 18:8-9).

Bipụta