Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa
Mmekọrịta Dị ike
Ọgọst 2024


Ozi Kwa Ọnwa Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Ọgọst 2024

Mmekọrịta Dị ike

Ọgbụgba ndụ karịrị nkwekọrịta; ọ bụ mmekọrịta.

Foto, oyiyi
oche ndị na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ

A ka nwere m foto oche ndị na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ nke Okenye Pistone na Okenye Morasco nọdụrụ ọdụ mgbe ha kuziiri ezi na ụlọ m n’ebe obibi anyị na Agentina. Ha kuziri ihe jiri ike dị ukwuu nke mere na nwanne m nwanyị gbara afọ 10 na m (gbara afọ 9) ga-agba ọsọ ịmetụ oche ndị ahụ aka mgbe ha lara, na-atụanaya na ike ahụ ga-emetụ anyị na-ahụ.

Oteghị anya mgbe m matara na ike ahụ esighị n’oche ndị ahụ mana site n’inwe mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Chineke na Jizọs Kraịst.

Nhụmiihe Baptizim Mụ

E mere m ọgbụgba ndụ m nke mbụ na Nọvemba 13, 1977. Echeteghị m ihe buru ibu banyere baptizim m, mana echetere m dị ka Okenye Pistone na-enyere m aka ịbanye niime mmiri na Okenye Morasco na-anabata m mgbe ntụtụ isi m ka dị mmiri mmiri. Echetekwara m ọńụ nke m nwetere dị ka ndị enyi ọhụrụ nke ngalaba ukwu naara amakụ ma n’esusu m ọnụ otu ndị Agentina si eme na ọchịchọ siri ike m nwetere ịbụ nwaada nke Nna nke Eluigwe kwesịrị ntụkwasị obi.

Foto, oyiyi
ezi na ụlọ n’ebe baptizim

Nwanne nwanyị Spannaus Nta (n’etiti) ya na ndị nne na nna ya (aka ekpe), nwanne ya nwanyị Silvina (na ngwụcha aka nri), na Okenye Morasco.

N’ikpeazụ a matara na ọńụ ahụ nke m nwetere bịara site n’aka onyinye nke Mmụọ Nsọ. A mụtara m na dị ka m ji nkwesị ntụkwasị obi na-edebe ọgbụgba ndụ m mụ na Chineke, Mmụọ ahụ ga-anọnyere m. Mmụọ Nsọ bụ nnọọ otu niime ngọzi ndị dị ike na-abịa site na mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Chineke na Jizọs Kraịst.

Ugbu a, ọbụna mgbe ebumnobi m niile, echiche m niile, na omume m niile dara mba, enwere m olileanya ịnọ na-anwa. Maka Gịnị? Niihi na ị na-eri oriri nsọ na-eme ya ekwe omume maka m imegharị ọgbụgba ndụ m niile ọhụrụ ma mee ọgbụgba ndụ ọhụrụ izu ụka ọbụla. Obi dị m nnukwu ekele maka ngọzi ahụ.

Mmekọrịta Ọgbụgba ndụ Na-ekpo ọkụ

Anyị na-anụkarị na ọgbụgba ndụ bụ nkwa ụzọ-abụọ dị n’etiti anyị na Chineke. Ebe nke ahụ bụ eziokwu, nke a abụghị naanị ihe ha bụ. Na nsiridị, “ịna edebe ọgbụgba ndụ abụghị nkwekọrịta enweghị mmasị mana mmekọrịta na-ekpo ọkụ.”

Ya mere kedụ otu i si emepụta mmekọrịta ọgbụgba ndụ gị na Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta? Ha ahụwo gị rịị naanya n’ụzọ zuru oke ma na-achọ ịgọzi gị (lee 3 Nifaị 14:11). Mana mmekọrịta ọbụla nwere ụzọ-abụọ na-ewe oge na ịhụnaanya site n’akụkụ abụọ ahụ.

Ị chọrọ igbutukwu oge gị na Ha? Mgbe i mere ihe ndị ahụ Ha gaara eme, ị na-eso Ha na-eje ije! Nke ahụ nwere ike dịrị mfe dị ka ige otu enyi ntị n’oge rara ezigbo ahụ, na-emepụta oge isoro ụmụnne gị gwuo egwuregwu, ma ọ bụ gụnye otu onye ọ na-adị ya ka sọ ya nọ. Na nso nso a, etinyere m oge soro Chineke na-eje ije site na-eme rekọọdụ ozi ọnụ niile na iziga ozi ederede nye otu enyi nọ Agentina onye naara enwe mmetụta owu ọmụma. Emewo kwa m mkpebi ịna-edebe rekọmend tempụl m n’ọrụ ka m wee nwee ike nọnyere Onyenwe anyị niime ụlọ nsọ Ya. I nwere ike kpee ekpere maka echiche niile nke ga-enyere gị aka ịnọnyere Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta gị.

Ị na-achọ igosi Ha na ịhụrụ ha naanya? Meso iwu nsọ ndị ịgbaworo ndụ idebe dị ka ụzọ isi egosi ịhụnaanya gị, na-abụghị ndepụta iwu niile. N’ịmaatụ, ibi ndụ Okwu nke Amamiihe, a mụtara m otu esi esi ihe oriri ndị na-emezi ahụ. Ugbu a ana m akuziri ụmụada m ime otu ụdị ahụ. Dị ka ị na-eji obi gị edebe iwu nsọ niile nke Chineke, ịhụnaanya gị maka Ya na Onye Nzọpụta ga-etolite.

Mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ga-enyere anyị aka mata Ha nke ọma ma nwee ohere ruo n’ike Ha niime ndụ anyị karịa—enweghị ngwụcha karịa ihe ọbụla oche ndị na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ nwere inye. Ma ike ahụ na-agbanwe anyị ruo ebighị ebi!

Hụba ama

  1. Ann M. Madsen, niime Truman G. Madsen, Tempụl Ahụ: Ebe Eluigwe Zutere Ụwa (2008), 69.

Bipụta