Kedụkwanụ maka nchegharị? Ọ bụrụ na echiche nke ichegharị na-eme gị izo nokpuru ihe mkpuchi gị niile ma ọ bụ rie oke chokolat, ederede nke a bụ maka gị.
“Biko atụkwala egwu ma ọ bụ gbuo oge ichegharị,” Onyeisi Russell M. Nelson kwuru. Ma jiri nzube dị mma. Nke a bụ ihe ole ma ole nke nchegharị bụ na abụghị, dị ka Onyeisi Nelson kwuru.
Nabata Onyinye Zuru oke nke Chineke
Ya mere, ị dị njikere ịtụkwasị obi na Onye Nzọpụta iji merie ịtụ egwu nke nchegharị? Ị gaghị enwe akwa ụta.
Onyeisi Nelson kwuru sị: “Niihi na ụwa na-achọ nzọpụta, ma niihi na mụ na gị na-achọ nzọpụta, [Nna nke Eluigwe] zitara Onye Nzọpụta.
“… Ka anyị nabata onyinye nke Chineke zuru oke dị oke ọnụ ahịa. Ka anyị tụkwasị ibu anyị na mmehie anyị niile n’ụkwụ nke Onye Nzọpụta ma nwete nhụmiihe nke na-abịa site na nchegharị na mgbanwe.”