Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa
Ebe A Mụrụ Ya
Dizemba 2024


Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa ọnwa, Dizemba 2024

Ebe a mụrụ ya

Mụọ ihe banyere ebe e mere Ekeresimesi nke a dị nso na otu ọ ga-esi nyere anyị aka na-elekwasị Onye Nzọpụta anya.

Bethlehem

Ngosipụta niile site n’aka Caroline Vibbert

Bethlehem

Bethlehem pụtara “ụlọ nke achịcha” na Hibru. Mgbe ụfọdụ ana akpọ ya obodo nke David, onye esitere na agbụrụ ya buo amụma Mezaya ga-abịa (lee Jeremaya 23;5; Jọn 7;42). Samuel tere David mmanụ ị bụ Eze na Bethlehem (lee 1 Samuel 16:1–13). E buru amụma na-aga amụ Mezaya ahụ ebe ahụ (lee Maịka 5:2).

ụlọ oriri ọha na eze

Ụlọ oriri ọha na eze

Mkpụrụokwu ndị Grik maka inn nwere ike ịpụta ebe ọbụla a na-akwụ ụgwọ laba ihi ụra nwa mgbe nta, gụnyekwara ime ụlọ onye ọbịa. Meri “nyiwere [Kraịst Nwata] nʼebe a na-etinyere anụ ụlọ nri; niihi na-enweghị ọnụ ụlọ ọbụla ha nwere ebe ahụ a na-akwụ ụgwọ maka ihi ụra” (Luk 2:7). (Ntụgharị Asụsụ nke Joseph Smith sịrị “inns.”) “Enweghị ọnụ ụlọ” nwere ike ịpụta na-anabataghị ha ma ọ bụ na enweghị ebe ha gaara anọ nwee ọnụ ụlọ ịmụ nwa. Otu ọbụla o si dịrị, ha gara otu ebe ọ bụ ebe a na-etinyere anụ ụlọ nrị.

Ebe a mụrụ ya ebe ihe mere

Ebe a na-etinyere anụ ụlọ nri

Ebe a na-etinyere anụ ụlọ nri bụ igbe ebuliri elu ma ọ bụ ọkwa nri anụmanụ nke na-ejide nri maka ụmụ anụmanụ. Niime Judea mgbe ochie, ihe ndị a bụ ihe a na-ejikarị okwute arụ. Ebe ndị a na-akwụ ụgwọ maka ihi ụra nwere otu mbara ezi na-etiti nwere ebe a na-etinyere anụ ụlọ nri, ma ọtụtụ ebe obibi nwekwara ebe ndị a na-etinyere anụ ụlọ nri niime obosara ọnụ ụlọ nke ga-eme ka e nwee ike dobe ụmụ anụmanụ ebe ahụ ji ejie bọọ.

Uwe Mkpuchi ụmụ a mụrụ ọhụrụ

Ndị nne nọ na-ekpuchi ụmụ a mụrụ ọhụrụ (afụchi ha na blanket ma ọ bụ akwa) kemgbe afọ puku kwuru puku. Nke a na-eme ha ị nọdụ jụụ ma nwete onwe ha nke ọma mgbe mkpọnwụ ahụ ịhapụ afọ nne ha gasịrị. Akwa nke Meri jiri fụchie nwa nwere ike bụrụ nke nwere akara pụrụ iche nye ezi na ụlọ ahụ.

Meri na Josef

Ha bụụrụ ndị ezigbo mmadụ na ndị ezi omume, ma ha abụọ bụ ndị si na-agbụrụ David pụta. Nke ọbụla niime ha enwewo onye mmụọ ozi bịara leta ha na nkwadobe maka ọmụmụ nke Onye Nzọpụta (lee Matiu 1:18–25; Luk 1:26–38). Ha mere njem 100-140km (60–90 maịlụ) ruo Bethlehem. Merị dịịrị ime noge njem ahụ.

ndị ọzụzụ atụrụ

Ndị ọzụzụ atụrụ

Ndị ọzụzụ atụrụ naara elekọta igwe anụmanụ ha na-ebe dị nso na Bethlehem. Dị ka otu ndị ọka mmụta siri kwuo, naanị atụrụ enwere iji chụọ aja na tempụl ka a na-ekwe ka a zụọ ha na nso nso obodo ukwu. Ya mere ndị ọzụzụ atụrụ ndị a nwere ike naara elekọta atụrụ gaara anọchi anya aja nke Jizọs Kraịst maka anyị (lee Moses 5:6–7). Ha hapụrụ igwe anụmanụ ha ịga ịhụ Mezaya ahụ, onye nke aja ịkwụ ụgwọ mmehie ya ga-ewepụ aja nke ụmụ anụmanụ.

Nwata Kraịst Ahụ

Jizọs Kraịst bụ isi ihe nọ n’etiti Ebe a mụrụ ya ebe ihe mere—na ndụ anyị niile.

Hụba ama

  1. Ntụgharị asụsụ Josef Smith, Luk 2:7 (niime Luk 2:7, nkọwada b).

  2. Lee Andy Mickelson, “Otu Ebe a na-akwụ ụgwọ ehi ụra Na-anaghị ekwe omume: Edereede niile na Omenaala Gbara gburugburu Luk 2:7,” Studia Antiqua vol. 14, no. 1 (Me 2015).

  3. Lee Andy Mickelson, “Ebe a na-akwụ ụgwọ ehi ụra Na-agaghị ekwe omume.”

  4. Lee Russell M. Nelson, “Udo na Ọńụ nke Ịmata na Onye Nzọpụta Dị ndụ,” Liahona, Diz. 2011, 19–20.

  5. Lee Alfred Edersheim, Ndụ na Oge niile nke Jizọs bụ Mezaya ahụ, 8th ed. (1907), 1:186.