Ụkpụrụ niile nke Nkwusa-ozi-ọma, Julaị 2018
Setipụ-aka n’Ọmịko
Dịka I na esoro ọmụmatụ ọmịko nke Onye-Nzọpụta, I ga-ahụta na I nwere ike imepụta ihe dị iche n’ime ndụ ndị ọzọ.
Ọmịko bụ inwe mmata mkpagbu nke ndị ọzọ ma nwe kwa mmasị ibelata ma ọ bụ inapụta mgbu ha. Ọgbụgba-ndụ isoro Onye-Nzọpụta bụ ọgbụgba-ndụ nke ọmịko I “burita ibu-arọ onye ọbụla nye ibe ya” (Mosaịa 18:8). Ọrụ nke ilekọta ndi ọzọ bụ oghere ikwusa-ozi dịka Onye-nwe ga-eme: jiri “ọmịko, na-emepụta ihe dị iche” (Judu 1:22). Onye-nwe nyere iwu, “Gosi obi ebere na ọmịko onye ọbụla nye nwanne ya” (Zechariah 7:9).
Ọmịko nke Onye-nzọpụta
Ọmiko bụụrụ ngwa-ọrụ dị ike n’ime nkwusa-ozi-ọma nke Onye-nzọpụta (lee n’akụkụ: “Onye-Nzọpụta nwere Ọmiko”) Ọmiko Ya maka mmadụ ibe Ya mere Ya esetipụ-aka ruo ndi nọ Ya n’akụkụ ọtụtụ mgbe. Imata ihe dị iche na mkpa na ọchichọ ndị mmadụ, O nwere ike ịgọzi ha ma kuziere ha n’ụzọ nke metụrụ ha karịa. Ọchichọ nke Onye-nzọpụta ibuli anyị elụ karịa mkpagbu anyị dubanyere n’omume ọmiko kacha ibe ya: Aja-mgbaghara-mmehie Ya maka njọ niile na ahụhụ niile nke mmadụ.
Ike Ya imezi mkpa niile nke ndi mmadụ bụ ihe anyị nwere ike igbali maka ya ka anyị na-eje ozi. Ka anyị na-ebi ndu n’ezi-omume ma na-ege ntị na mmetụ niile nke Mụọ ahụ, anyị ga-enwe nkwalite isetipụ-aka n’ụzọ ndị bara uru.
Ọgbụgba-ndụ Anyị nke Ọmiko
Nna nke Eluigwe chọrọ ka ụmụ Ya nwe ọmiko (lee 1 Ndi Kọrịnt 12:25–27). Ibụrụzi ezi ndi-na-eso ụzọ,anyị ga-amụta ma gosi ọmiko nye ndi ọzọ, ka cha nke nye ndi nọ na mkpa (O&O 52:40).
Iwekwasi n’onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst site na ọgbụgba-ndụ nke baptism, anyị na-agba aka-ebe na anyị dị na njikere igosi ọmiko. Onye-isi Henry B. Eyring, Onye-Ndụmọdụ nke Abụọ n’ime Ndi-isi-nduzi Mbụ, kuziri na onyinye nke Mụọ Nsọ na-enyere anyị aka ime otu ahụ: “I bụ onye-otu gbara ọgbụgba-ndụ nke Nzukọ-nsọ nke Jizọs Kraịst. …
Nke ahụ mere I si enwe mmetụta mmasi enyem aka nye onye na-adọga iga n’ihu n’okpuru ibu mwute na ihe isi ike. I kwere nkwa na ị ga-enyere Onye-nwe-anyị aka mee ibu-arọ ha a diri mfe ma nwete nkasi-obi. E nyere gị ike iji nyee aka mee ka ibu niile ahụ dị mfe mgbe ị natara onyinye nke Mụọ Nsọ.”1
N’ọmụmatụ, otu nwanne nwanyị n’ime Rọshịa nwebuuru ọnọdụ ihe isi ike nke ezi-na-ụlọ nke gbochiri ya iga nzukọ-nsọ ihe karịrị otu afọ. Nwanne nwanyị ọzọ n’ime ngalaba-nta ahụ setipụrụ-aka n’ọmiko Sọnde ọbụla site n’ikpọ ya n’ekwe ntị ma gwa ya gbasara okwu niile enyere, ihe ọmụmụ niile, ikpọ-oku mgbasa-ozi, ụmụ ọhụrụ amụrụ, na akụkọ ndi ọzọ nke ngalaba-nta ahụ. Mgbe edozichara ọnọdụ ezi-na-ụlọ nwanne nwanyị a tọrọ n’ime ụlọ, ọ dịrị ya ka ọ bụkwarịị onye otu nke ngalaba-nta ahụ n’ihi ikpọ-oku izu-ụka niile nke enyi ya.
© 2017 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike Mbipụta nile ka e dokwara Ebipụtara na USA. Asụsụ Bekee akwadoro: 6/17. Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/17. Ntụgharị nke Ministering Principles, July 2018. Igbo. 15050 593