2018
Iwụlite Mmekọrịta Bara Uru
August 2018


Ministering

Ụkpụrụ niile nke Nkwusa-ozi-ọma, Ọgọst 2018

Iwụlite Mmekọrịta Bara Uru

Ike anyị ilekọta ndi ọzọ na-amụba mgbe anyị nwere mmekọrịta bara ụrụ anyị na ha.

Mkpọku ahụ ikwusa-oziọma nye ndi ọzọ bụ otu oghere iwulite mmekọrịta mara mma anyị na ha—ụdị mmekọrịta nke ga-eme ha enwe ike rịọ maka ma ọbụ nabata enyem aka anyị. Mgbe anyị meworo mgbalị ahụ iji mepụta ụdị mmekọrịta ahụ, Chineke pụrụ ịgbanwe ndụ niile n’akụkụ niile nke mmekọrịta ahụ.

“Ekwere m n’ezie enweghị mgbanwe dị mkpa n’enweghị mmekọrịta dị mkpa,” ka Sharon Eubank, Onye-ndụmọdụ Mbụ n’ime Ndi-isi-Nduzi Otu Enyem-aka Zuru-ọha kwuru. Ma ka omume anyị nke ije-ozi nwee mgbanwe n’ime ndụ ndi ọzọ, o kwuru, ha ga-“agbarịrị mgbọrọgwu n’ime ọchichọ dị ezi-okwu iji gwọọ ma gee ntị ma rụkọrịa ma rube-isi.”1

Mmekọrịta bara uru abụghị aghọghọ. Ewuru ha n’elu ọmiko, mgbalị niile ziri ezi, na “ịhụnanya ziri ezi” (O&O 121:41).2

Ụzọ ndi esi Ewụlite ma Gba Mmekọrịta Ume

“Anyị na-ewụlite [mmekọrịta] otu onye n’otu oge,” ka Okenye Dieter F. Uchtdorf nke Kworum Ndi Ozi Iri-na-abụọ kwuru.3 Dịka anyị na-agbalị iwulite mmekọrịta ndi bara uru anyị na ndi ọzọ anyị na-ekwusara ozi-ọma, Mụọ Nsọ ahụ nwere ike idu anyị. Nchepụta ndia sotere dabere n’usoro nke Okenye Uchtdorf nyere.4

  • Mụta maka ha.

    Onye-isi Ezra Taft Benson (1899-1994) kuziri, “I nweghị ike ijere ndi I na-amaghị nke ọma ozi nke ọma.” Ọ rọpụtara imata aha onye otu ọbụla nke ezi-na-ụlọ ma mara kwa mmemme dị mkpa dịka ncheta ọmụmụ, ngọzi niile, baptism niile, na alụm di na nwunye niile. Nkea n’ewete oghere ide ihe odide ma ọ bụ kpọọ n’ekwe ntị iji jaa onye otu ezi-na-ụlọ maka ihe nwete pụrụ iche ma ọbụ mmete pụrụ iche.5

  • Nọkọrịta nu ọnụ.

    Mmekọrịta n’egbu oge irụpụta. Chọta oghere eji anọgide na-enwe njikọ. Ọtụtụ agụmagụ n’egosi na ime ka ndi mmadụ mara na I nwere mmasi dị mkpa n’ime mmekọrịta kwesịrị ekwesị.6 Gaa nleta ugboro ugboro gị na ndi akpọrọ oku ije-ozi. Jiri ụzọ ndi ọzọ bara uru—dịka imel, Facebook, Instagram, Twitter, Skype, Oku Ekwe-ntị, ma ọ bụ iziga ibe-akwụkwọ. Jiri ụzọ ndi ọzọ bara uru—dịka imel, Facebook, Instagram, Twitter, Skype, Oku Ekwe-ntị, ma ọ bụ iziga ibe-akwụkwọ. Okenye Richard G. Scott (1928-2015) nke Kworum Ndi-Ozi Iri-na-abụọ kwuru maka ike nke ngosipụta dị mfe nwere uche nke ịhụnanya na nkwado: “Oge ụfọdụ a ga m emepe akwụkwọ-nsọ m, … ma a ga m achọta ihe edere ede n’emetụ n’obi, nwere nkwado nke nwunye m Jeanene dere tụbanye n’ime ibe-akwụkwọ ndi ahụ. … Ihe odide ndi ahụ dị oke ọnụ ahịa … na-aga n’ihu I bụ akụ pụrụ iche n’enweghị atụ nke nkasi-obi na nkwalite obi.”7

    Na-kwa, cheta kwa na mmekọrịta gbasara mmadụ abụọ. I nwere ike inye ịhụnanya na ịbụ-enyị, kama mmekọrịta ahụ agaghị eto eto ma ọbụghị na anabatara ma weghachite onyinye ahụ. Ọbụrụ na onye nke ọzọ dịịrị ka ọ nabataghị, ejila ike abanye na mmekọrịta ahụ. Nye ya nwoke ma ọ bụ nwanyị oghere ịhụta mgbalị gị ziri ezi, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, nara ndụmọdụ gị na ndị ndu gị gbasara na ma ọ bụ na mmekọrịta bara uru ọ ga-enwe isi.

  • Jịrị ịhụnanya kparịta ụka.

    Iwulite mmekọrịta bara uru na-achọ ka anyị gafee ihe ndi na-adịchaghị mkpa. Mkparịta ụka na-adịchaghị mkpa jupụtara n’obere okwu gbasara nhazi oge niile, ihu igwe, na okwu ndi ọzọ dị obere, mana ọ gbakwunyeghị ikekọrịta mmetụta niile, nkwenye niile, ebumnuche niile, na nchegbu niile dị mkpa iji mepụta njikọ ndi bara uru. Nna nke Eluigwe akpụpụtawo ụdị mkparịta ụka nkea bara uru site n’ikekọrịta mmetụta na atụmatụ Ya niile Ya na Ọkpara Ya (lee Jọn 5:20) na kwa anyị na Ya site na ndi amụma Ya (lee Emọs 3:7). Site n’ikekọrịta mmemme niile kwa ụbọchị na ịma-aka niile nke ndụ anyị na ndi ọzọ dịka odudu nke Mụọ, anyị na-erite ekele maka onye ọbụla n’ime anyị dịka anyị na-achọta mmasị yiri ibe ya na nhumihe ekekọrịtara ọnụ.

    Ige-ntị bụ otu akụkụ dị oke mkpa nke mkparịta ụka n’egosi na I nwere ịhụnanya.8 Mgbe I kpachapụrụ anya gee ntị, oghere gị inyere ndi ọzọ aka bịakwute Kraịst na-abawanye dịka I na-erite nghọta na ezi uche n’ime mkpa ha niile na dịka ha na-enwete ịhụnanya, nghọta, na nchekwa.

  • Ghọta ọdị-iche niile dịkwa ka ọnọdụ yiri ibe ya.

    “Ụfọdụ … kwenyere na Nzukọ-nsọ chọrọ ikepụta ndi otu site na otu igba—na onye ọbụla kwesịrị iyi ibe ya, nwee ụdị mmetụ, chee ụdị echiche, ma kpaa agwa dịka onye ọbụla niile,” ka Okenye Uchtdorf kwuru. “Nke a ga emegide amamihe nke Chineke, onye kepụtara mmadụ niile iche iche site n’ibe ya. …

    Nzukọ-nsọ na-amụba mgbe anyị jiiri uru nke idi-iche iche nkea ma gba onye ọbụla ume imepụta ma jiri akara-aka anyị bulie ma gbaa ndi otu anyị ndi-na-eso ụzọ ume.”9

    Ị hụ ndi ọzọ n’anya n’ụzọ Chineke siri hụ anyị n’anya chọrọ ka anyị gbalịa ihụta ndi ọzọ n’ụzọ Chineke si ahụta ha. Onye-isi Thomas S. Monson (1927-2018) kuziri, “Anyị ga-emepụta rịrị ikikere ịhụta ndi ọzọ na-abụghị dịka ha dị n’oge ugbua kama dịka ha nwere ike ịbụrụzi.”10 Anyị nwere ike ikpe ekpere iji hụta ndi ọzọ otu Chineke si ahụ. Ka anyị na-akpasịrị ndị ọzọ agwa site na idabere n’ike ha itolite, ha nwere oghere irigo ruo otu o kwesiri.11

  • Jere ha ozi.

    Nwee mmetụta ọsọsọ maka mkpa niile nke ndi I na-ekwusara ozi-ọma ma diri na njikere inye oge gị na akara aka, ọbụrụgodi n’ime oge ahụ ma ọ bụ nanị na I nwere mmasị. I nwere ike I nọ n’ebe ahụ iwete nkasi-obi, nkwado, na mkpa achọrọ mgbe e nwere ihe mberede, nrịa nrịa, ma ọ bụ ọnọdụ pụtara na ntabi-anya. Mana n’ime ọtụtụ mmekọrịta niile ọ na-adị anyị ọsịsọ. Chineke nyere anyị oghere ịhọrọ ka anyị nwee ike ime kama aga amanye anyị (lee 2 Nifaị 2:14). Dịka Onye-ozi Pọl kuziri na anyị nwere ịhụnanya n’ebe Chineke nọ n’ihi na Ọ bụrụ ụzọ hụ anyị n’anya (lee 1 Jọn 4:19), mgbe ndi ọzọ n’enwete ịhụnanya anyị ziri ezi site na-omume ije ozi anyị, o nwere ike idaju obi ma mụbaa ịhụnanya na ntụkwasị-obi.12 Nke a n’akpọpụta ụdị omume na etolite etolite nwere ike iwulite mmekọrịta.

Nkwusa-ozi-ọma dịka Onye-nzọpụta Mere

Jizọs Kraịst wulitere mmekọrịta bara uru Ya na ndi-na-eso-ụzọ Ya (lee Jọn 11:5). Ọ maara ha (lee Jọn 1:47–48). O nyere ha oge Ya (lee Luk 24:13–31). Mkparịta-ụka Ya gafere ihe ndi na-adịchaghị mkpa (lee Jọn 15:15). Ọ ghọtara ọdịiche ha niile (lee Matịu 9:10) ma hụta ihe ha ga-emepụtali (lee Jọn 17:23). O jeere onye ọbụla ozi, na-agbanyeghị na Ọ bụ Onye-nwe nke onye niile, na-ekwu na Ọ bịara na-abụghị ka ekwusaara Ya ozi-ọma kama ka O kwusaa ozi-ọma (lee Mak 10:42–45).

Gịnị ka I ga-eme iji wulite mmekọrịta siri ike karịa gị na ndi ọzọ akpọrọ gị ije-ozi?

Hụba-ama

  1. Sharon Eubank, n’ime “Omume niile nke Kwesiri Mmadụ ka aga Agbarịrị Mgbọrọgwụ n’ime Mmekọrịta, ka Sharon Eubank kwuru,” mormonnewsroom.org.

  2. Lee “Ụkpụrụ niile nke Nkwusa Ozi-ọma: Setipụ-aka n’Ọmịko,” Liahona, Julai 2018, 6–9.

  3. Dieter F. Uchtdorf, “Maka Ihe niile Nke Dịkacha Mkpa,” Liahona, Nov. 2010, 22.

  4. Lee Dieter F. Uchtdorf, “Maka Ihe niile Nke Dịkacha Mkpa,”22.

  5. Lee Ezra Taft Benson, “Maka Ndi-nkuzi Ebe-obibi nke Nzukọ-nsọ,” Ensign, Mee 1987, 50.

  6. Lee Charles A. Wilkinson na Lauren H. Grill, “Na-ekwupụta Ịhụnanya: Okwu nke Ozi Ịhụnanya,” n’ime >Imepụta Njikọta: Agụmagụ niile n’ime Mkparita-ụka Onye na Ibe ya, ed. Kathleen M. Galvin, 5th ed. (2011), 164–73.

  7. Richard G. Scott, “Ngọzi Ebigh-ebi niile nke Alum Di na Nwunye,” Liahona, Mee 2011, 96.

  8. Lee “Ụkpụrụ niile nke Nkwusa Ozi-ọma: “Ihe Ise niile Ezi Onye-na-ege Ntị Na-eme,” Liahona, Jun 2018, 6–9.

  9. Dieter F. Uchtdorf, “Isi-okwu Anọ niile,” Liahona, Mee 2013, 59.

  10. Thomas S. Monson, “Hụta Ndi-ọzọ dịka Ha Nwere ike Ibụrụzi,” Liahona, Nov. 2012, 68.

  11. Lee Terence R. Mitchell na Denise Daniels, “Na-akpali,” n’ime Handbook of Psychology, vol. 12, ed. Walter C. Borman a ndi ọzọ (2003), 229.

  12. Lee Edward J. Lawler, Rebecca Ford, na Michael D. Large, “Unilateral Initiatives as a Conflict Resolution Strategy,” Social Psychology Quarterly, vol. 62, no. 3 (Sept. 1999), 240–56.