Ụkpụrụ niile nke ije-ozi Nlekọta, Dizemba 2018
Gosipụta Na I nwere Ịhụnanya
Enwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị nwere ịhụnanya, kachasi n’oge ekeresimesi. Anyị nwere ike kwuo ya, dee ya, nye ya, kesaa ya, ekpe ya n’ekpere, sie ya, kwee ya, gbakuo ya, kpọọ ya, kụọ ya, ma ọbụ mee ya ụcha. Nanị nwaa ya.
Igosi ịhụnanya nye ndi ọzọ nọ nnọọ n’etiti nke ije-ozi nlekọta. Onye-isi Zuru-ọha Otu Enyem-aka Jean B. Bingham kwuru: “Ezi ije-ozi nlekọta ka ana emejupụta n’otu n’otu site n’ịhụnanya dịka mkwali. … site n’ịhụnanya dịka mkwalite ahụ, ihe iriba-ama ga-eme, ma anyị ga-achọta ụzọ niile iji kpọta ụmụnne anyị ndi nwanyị na ndi nwoke ‘furu efu’ n’ime ngụnye mkpuchite niile nke oziọma nke Jizọs Kraịst.”1
Ime ka ndi ọzọ mara na anyị nwere ịhụnanya bụ otu akuku dị mkpa nke imepụta mmekọrịta nke onwe anyị. Kama ndi mmadụ dị iche iche n’enwete ozi ahụ n’ụzọ dị iche iche. Ya mere kedu otu anyị ga-esi enwe ike gosipụta n’ụzọ ziri ezi ịhụnanya anyị maka ndi ọzọ n’ụzọ ha ga-esi aghọta ma nabata ya? Ndia bụ ụfọdụ ụzọ esi eme mkparịta ụka na anyị nwere ịhụnanya, ya na nchepụta ole ma ole iji bido echiche nke gị onwe gị.
Kwuo Ya
Oge ụfọdụ anaghị enwe ihe na-anọchite maka ikwu otu anyị si eche maka otu onye. Ebe nkea nwere ike ipụta ịgwa onye ahụ na ị hụrụ ha n’anya, ọ gụnyekwara ikesa ihe masiri gị gbasara ha ma ọbụ inye ihe otito ziri ezi. Ụdị ngosipụta nkea n’enye aka igba mmekọrịta ume. Lee Ndị Efesọs 4:29
-
Chọta oghere-ọma iji mee ka onye ahụ mara otu I si enwe mmasị n’otu ike ya.
-
Kwụsi ma banye, kpọọ n’ekwe ntị, ma ọbụ ziga imel, ozi text, ma ọbụ kaadị n’agwa onye ahụ na i na-eche gbasara ha.
Gaa nleta
Iwere oge kwukọrịta okwu na ige ntị nye onye ọbụla bụ otu ụzọ dị ike esi egosi otu I si ji ha kpọrọ ihe. Ma I gara nleta n’ebe obibi ha, n’ụlọ nzukọ-nsọ, ma ọbụ n’ebe ọzọ, enwere ọtụtụ ndi mmadụ ndi chọrọ onye ha nwere ike ikwuru okwu. (Lee Mosaịa 4:26; O&O 20:47.)
-
Dịka otu mkpa nke onye ahụ dị, hazie iga nleta. Jiri nwayọ gee ntị n’ezie ma ghọta ọnọdụ ya nwoke ma ọbụ nwanyị.
-
N’ebe o nwere ike ita akpụ iga nleta n’ebe obibi n’ihi idi anya, omenala ama ama, ma ọbụ ọnọdụ ndi ọzọ, tulee iwere oge nọkọrịta ọnụ mgbe Nzukọ-nsọ mechiri.
Jiri Ebumnobi Jee-ozi
Kpachapụ anya maka ihe onye ahụ ma ọbụ ezi na ụlọ ahụ chọrọ. Ije-ozi nwere nzube n’egosi na I nwere ịhụnanya. Ọ na-etinyekọta onyinye niile bara uru nke oge na mgbali dị mma. Omume dị mfe nke ije-ozi nwere ike inwe mmetụta pụtara ihe n’ime ndi ọzọ,” ka Nwanne nwanyị Bingham kwuru.2
-
Jee-ozi nke n’agba ndi mmadụ ume ma ọbụ ezi-na-ụlọ ha, dị ka ilegide ụmụntakịrị ka ndi nne na nna nwee ike gaa tempụl.
-
Chọta ụzọ niile eji eme ka ibu dị mfe mgbe ihe nke ụwa bịara karịa, dị ka ihichasi windo, ikpọrọ nkita gagharịa, ma ọbụ inye-aka doo gburugburu ụlọ ụcha.
Mekọrịta Ihe niile ọnụ
Enwere ndi mmadụ ndi na-anaghị ejikọta site n’oke mmarita ụka. Maka ụfọdụ ndi mmadụ, njikọta na-abịa site n’ichọta ihe mmasi zuru ọnụ na iwere oge mekọrịta ihe ndi ahụ ọnụ. Onye-nwe-anyị gbara ume na anyị “nọnyere ma gbaa ha ume” (O&O 20:53) ụmụnne anyị ndi nwoke na ndi nwanyị.
-
Soro ya gagharịa ije, hazie egwuregwu nke abalị, ma ọbụ wepụta otu oge mgbe niile maka mgbatị ahụ gị na ya.
-
Jekọrịta ozi ọnụ n’ime obodo ma ọbụ ọrụ projektị Nzukọ-nsọ.
Nye ihe Onyinye
Mgbe ụfọdụ oge ma ọbụ oghere-ọma eji ekwukọrịta na adị nke nke. N’ime ọtụtụ omenala, inye ihe onyinye bụ ihe iriba-ama nke ịhụnanya na mmetụta ọmịiko. Ọbụladị mgbe ụkpọrọ, ihe onyinye dị mfe nwere ike igosi mmasị gị iwulite mmekọrịta dị mma karịa. (Lee Ilu 21:14.)
-
Kpọrọ ha gaa zunye ha ihe ọnụ-ụtọ kacha masi ha.
-
Kọrọ ha otu ihe ekwuru, akwụkwọ nsọ, ma ọbụ ozi ndi ọzọ I chere na ha ga-erite ihe na ya.
Otu Ọrụ nke Ịhụnanya
Dịka I na-abịa mata ndi I na-ejere ozi nlekọta na maka ndi I na-achọ nkwalite mụọ, I ga-amụta kacha nke otu esi egosi ịhụnanya gị na nleta nye ha n’otu n’otu.
Kimberly Seyboldt nke Oregon, USA, na-akọ akụkọ nke ịchọ nkwalite mụọ na inye ihe onyinye iji gosipụta ịhụnanya:
“Mgbe m hụrụ na ndụ na ebuda m ala, ebilie m ma mee achicha zucchini, mgbe niile ihe ruru ogbe asatọ. Ngwa nri m pụrụiche bụ ekpere nwayọ m n’ekpe ka m n’esi nri imara onye nọ na mkpa ogbe achicha ndi ahụ. Abịala m nwee ike mata karịa ndi agbata obi m gbara m gburugburu dịka achicha zucchini ahụ dị ọkụ abụrụwo ihe nnabata m n’ime ebe obibi na ndụ ha niile.
Otu ụbọchi dị ọkụ n’oge okpọmọkụ, akwụsịrị m ụgbọ m n’akụkụ otu ezi-na-ụlọ na-ere pint blackberrị n’akụkụ okporo-ụzọ ahụ. Enweghị m mkpa nke blackberrị ọzọ, mana nwantakịrị nwoke ahụ n’ebughi ibu nọ na ebe ngwa ahịa ahụ nwere obi ụtọ ịhụta m, n’eche na m bụ onye ọzọ n’agba ya aka ahịa. A zụrụm obere blackberrị, mana e nwekwara ihe onyinye inye ya. E nyere mnwantakịrị nwoke ahụ ogbe achicha abụọ. Ọ tụgharịrị n’ebe nna ya nọ maka nnabata, mgbe ahụ kwuo, ‘Lee, Nna, ugbua anyị nwere ihe anyị nwere ike iri taa.’ Ejupụtara m n’obi ekele maka oghere-ọma nkea igosi ịhụnanya n’ụzọ dị mfe.”
Okenye Jeffrey R. Holland nke Kworum nke Ndi-Ozi Iri-na-abụọ rịọrọ “ na nwoke na nwanyị niile –na ndi nkom nta na ndi iyom nta tolitere –ga adị … nranye miri emi karịa maka nlekọta sitere n’ala ala obi n’ihi onye-ọzọ na ibe ya, nke kpalirị nanị site na ịhụnanya nke Kraịst iji mee otu ahụ. … Ka anyị soro Onye-nwe-anyị nke ubi vine rụọ ọrụ, n’enye Chineke na Nna nke anyị niile aka enyem-aka ya na ọrụ ịtụnanya Ya nke iza ekpere niile, n’iwete nkasi obi, n’ihicha anya mmiri, ma n’igba ume nye ikpere ụkwụ n’esighi ike.”3
Jizọs Kraịst nwere Ịhụnanya
Mgbe Jizọz Kraịst kpọlitechara Lazarus site n’ọnwụ, “Jizọs bere akwa.
“Mgbe ahụ ndi Juu kwuru, Lee otu o siri hụ ya n’anya!” Jọn 11:35–36
“Enwere m ọmiko n’ebe unu nọ,” Ka Kraịst gwara ndi Nifaị. Mgbe ahụ Ya asi ka akpọta ndi nrịa nrịa na ndi ihe metụrụ, ndi ngwọrọ ha na ndi isi, ma “ọ gwọrọ ha” (lee 3 Nifaị 17:7–9).
Onye-nzọpụta gosiri anyị ihe ọmụmatụ dịka O lekọtara ndi ọzọ. O kuziiri anyị:
“Ị ga-ewere obi gị niile, werekwa mkpụrụ obi gi niile, werekwa uche gị niile hụ Onye nwe gị Chineke gi n’anya.
“ Nke a bụ ịhe ukwu na ịhe mbụ enyere n’iwu.
“Ihe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dịka onwe gị” (Matiu, 22:37–39).
Onye nwere mkpa nlekọta gị? Kedụ otu I nwere ike isi egosi ha na I nwere ịhụnanya?
© 2018 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike Mbipụta nile ka e dokwara Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/17. Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/17. Ntụgharị nke Ministering Principles, December 2018. Igbo. 15056 593