2019
Inwete Mmetụta ọmịikọ ahụ eji eje-ozi nlekọta
Ọnwa Febụarị 2018


Foto, oyiyi
ministering

Ụkpụrụ niile nke ije-ozi Nlekọta, Febụarị 2019

Inwete Mmetụta ỌMỊIKO ahụ eji eje-ozi nlekọta

Ije-ozi nlekọta bụ ibuli. Anyị nwere ike ibuli ndị ọzọ dịka anyị na-anwa ighọta ihe ha n’ahụta na ndụ ma gosipụta na anyị dị njikere isoro ha gabiga ihe niile.

N’ihi na Nna anyị nke Eluigwe chọrọ ka anyị dịrịzie ka Ya, aka mgba niile anyị n’ezute n’ime ndụ nkea nwere ike bụrụzie oghere ọmụmụ ihe ma ọbụrụ na anyị ga-atụkwasị obi na Ya ma nọrọ n’ụzọ ahụ. Na mwute, ịnọrọ n’ụzọ ahụ nwere ike ịrakarịsị ahụ mgbe ọ dịrị ka anyị na-ezute ọnwụnwa ndị ahụ n’onwe anyị.

Mana enweghị mgbe achọrọ ka anyị gaa n’ụzọ ahụ nanị anyị. Onye-nzọpụta nwetere mmetụta ọmịiko zuru oke, n’ewedata onwe ya n’okpuru ihe niile ka O nwee ike mara otu esi enyere anyị aka n’ime mkpagbu na adịghị ike niile nke anyị (lee Alma 7:11–12; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 122:8). Ọ na-atụ anya na onye ọbụla n’ime anyị ga-esoro ọmụmatụ Ya ma gosipụta mmetụta ọmịiko ka ya. Ndi otu niile nke Nzukọ-nsọ agbawo ndụ “isoro ndị na-eru uju iru uju; e, kasie ha obi bụ ndị chọrọ nkasi-obi” (Mosaịa 18:9). N’agbanyeghị aka mgba nke anyị, akuziworo anyị site n’ime akwụkwọ nsọ niile ịpụta ezi ma “welite aka ndị ahụ rudara ala, ma mee ka ikpere niile ndị n’adighị ike ka ha [guzozie]” na I “mee ka ụzọ dị ogologo maka ụkwụ gị, ka nke ahụ dara ngwọrọ ghara ịpụta n’ụzọ ahụ” (Ndị Hibruu 12:12-13; lee kwa Aizaia 35:3–4; Ozizi na Ọgbụgba ndụ 81:5–6).

Ka anyị n’ejide ndị ọzọ na aka, mee ka ha dabere na anyị, ma gaa ije anyị na ha, anyị n’enyere ha aka nọrọ n’ụzọ ahụ tutu ruo mgbe Onye-nzọpụta n’abụghị nanị ịgbanwe ha—otu n’ime ebumnuche kacha mkpa nke ije-ozi nlekọta—kama kwa ịgwọ ha (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:13).

Gịnị bụ Mmetụta ọmịiko?

Mmetụta ọmịiko bụ ịghọta mmetụta, echiche, na ọnọdụ nke onye ọzọ site na anya ha kama ị bụ na nke onwe anyị.1

Inwe mmetụta ọmịiko dị mkpa n’ime mgbalị niile anyị ije-ozi nlekọta nye ndị ọzọ ma mejupụta ọrụ anyị dịka ụmụnne nwoke na nwanyị n’eje ozi nlekọta. Ọ na-ema ka anyị were onwe anyị tinye n’ime ọnọdụ ndị ọzọ.

Iga ije n’Ọnọdụ nke Onye-ọzọ

Akụkọ ka akọrọ maka otu nwa nwoke Onye nsọ Ụbọchi ikpeazụ ihere na-eme onye na anọkarị n’azụ oche nke ụlọ nzukọ nsọ nanị ya. Mgbe otu onye otu nke kworum ndị okenye nwụrụ na ntabi anya, bishọp nyere ngọzi ọkwa nchụ aja iji kasie ezi na ụlọ okenye ahụ obi. Otu Enyem aka wetere nri. Ndị enyị na ndị agbata obi nwere ezi uche bịara nleta n’ezi na ụlọ ahụ ma kwuo, “Mee ka anyị mara ma ọbụrụ ma enwere ihe ọbụla anyị nwere ike inye aka mee.”

Mana mgbe nwoke ihere nkea bịara nleta n’ezi na ụlọ ahụ n’oge mgbede, ọ pịrị mgbịrịgba ọnụ ụzọ ma mgbe nwanyị isi mkpa ahụ zara, ọ kwụrụ, “Abịawo m ihichasị akpụkpọ ukwụ unu.” N’ime oge awa ole na ole, akpụkpọ ụkwụ niile nke ezi na ụlọ ahụ dịịrị ọcha na nkwado maka olili ozu ahụ. Sọnde n’esote ya ezi na ụlọ nke okenye ahụ nwụrụ anwụ nọdụrụ n’akụkụ nwoke ihere ahụ n’azụ oche.

Nkea bụ nwoke onye ọdịrị mfe imejupụta mkpa a n’emejupụtaghị. Ma ha na ya ka agọziri site na ije-ozi nlekọta mmetụta ọmịiko kwadoro.

Kedụ otu m nwere ike isi Enwete Mmetụta ọmịiko?

Ụfọdụ dị ka ndị ejiri onyinye mmetụta ọmịiko gọzie. Mana maka ndị na-adọlị, enwere ozi dị mma. N’ime afọ 30 gara aga, ọnụ ọgụgụ n’etolite etolite nke ndị nchọpụta amụwo banyere mmetụta ọmịiko. N’ebe ọtụtụ n’ime ha n’abịa n’isi okwu jiri nghọta dị iche iche, ọtụtụ n’ime ha ekwerewo na mmetụta ọmịiko bụ ihe enwere ike ịmụ amụ.2

Anyị nwere ike ikpe ekpere maka onyinye nke mmetụta ọmịiko. Inwe ike metazie, ọ gakwa enye aka inwe ezi nghọta otu mmetụta ọmịiko si arụ ọrụ. Nchepụta ndịa sotere bụ ihe dị n’ime mmetụta ọmịiko dị mkpa ọha nabatara.3 Ebe ihe ndịa na-emekarị ọbụna mgbe anyị na-amaghị na ha na-eme, imara mgbe ọ na-eme n’enye anyị ohere ịhụta ohere ndị eji aganiịhụ.

1.Ghọta

Mmetụta ọmịiko na-achọ nghọta ọnọdụ nke onye ọzọ. Ọbụrụ anyị ghọtazie ọnọdụ ha, ọ ga-adịrịzie mfe ịghọta otu o si emetụta ha gbasara ya na ihe anyị nwere ike inye aka mee.

Igezi ntị, ịjụ ajụjụ, na ịdụ ọdụ anyị na ha na ndị ọzọ bụ omume dị mkpa maka ịghọta ọnọdụ ha. Mụtakuo gbasara echiche ndịa dị n’ime isiokwu Ụkpụrụ niile nke Ije-ozi nlekọta gara aga:

  • ““Ihe Ise Ezi-Onye-na-ege Ntị Na-eme,” Liahona, Jun 2018, 6.

  • “Dụọ Ndụmọdụ maka Mkpa Ha,” Liahona, Sept. 2018, 6.

  • “Gụnye Ndị ọzọ n’Ije-ozi nlekọta—dịka ọ Dị mkpa,” Liahona,Oct. 2018, 6.

Dịka anyị na-achọ ịghọta, anyị ga-eji nwayọ ghọta ọnọdụ ha kpọmkwem karịa ị na-eche site otu onye ọzọ siri nwee ụdịrị ọnọdụ ahụ. Ma ọbụghị, anyị nwere ike ida mba n’ụzọ ahụ ma hapụ ha iche na aghọtahiere ha.

2.Tụgharịa uche

N’ime mgbalị anyị idebe ọgbụgba ndụ anyị isoro ndị n’erụ uju ruo uju ma kasie ha obi ndị chọrọ nkasi obi, anyị nwere ike kpee ekpere maka Mụọ Nsọ inyere anyị aka ghọta ihe otu onye nwere ike ịdị n’enwe mmetụta na otu anyị nwere ike isi nye aka.4

Otu aka ahụ anyị ghọtara ọnọdụ otu onye, onye ọbụla n’ime anyị—ma ọbịara n’aka ya ma ọbụghị—nwere ike isoro ụzọ nke ịtụgharị uche ihe anyị ga-eche ma ọbụ nwee mmetụta n’ime ọnọdụ ahụ. Ịghọta uche na mmetụta ndị ahụ, ya na odudu nke Mụọ Nsọ, nwere ike inye aka duo aziza anyị nye ọnọdụ ha.

Dịka anyị na-abịa ghọta ọnọdụ onye ọzọ ma tụgharịa uche otu o si metụta ha, ọ dị mkpa na anyị agaghị ekpe ha ikpe n’ezighị ezi (lee Matiu 7:1). Inyochasị otu otu onye si banye n’ime ọnọdụ ahụ nwere ike iduba anyị ịgụpụ mgbu ọnọdụ ahụ na-akpata

3.Zaghachị.

Otu anyị si azaghachị dị mkpa n’ihi na ọ bụ otu mmetụta ọmịiko anyị si egosipụta. Enwere ọtụtụ ụzọ ndị esi egosi nghọta anyị ma ekwuru ya ekwu ma ekweghị ya ekwu. Ọ dị mkpa icheta na ebumnuche anyị abụchaghị imezi nsogbu ahụ. Mgbe na mgbe ebumnuche bụ naanị ibuli na ịgba ume site n’ime ha amara na ha anọghị nanị ha. Nkea nwere ike ịpụta ikwu, “Obi dị m mma na ị gwara m” ma ọbụ “Ndo. Nke ahụ wutere gị.”

N’ikpe niile aziza anyị ga-adịrịrị eziokwu. Ma mgbe o kwesịrị, ikwe ka ndị ọzọ hụta adịghị ike na enweghị nchekwa nke onwe gị nwere ike ikepụta echiche bara uru nke njikọta.

Ịkpọ-ókú Ime

Dịka I na atụle ọnọdụ nke ndị I na-ejere ozi nlekọta, tụgharịa uche ka ịnọ n’ọnọdụ ha na ihe ị ga-achọta n’enyekarịcha aka ma ọbụrụ na ị nọ n’ọnọdụ ha. Kpee ekpere ịghọta otu o sị emetụta ha ma soro n’ụzọ ahụ. Azịza gị nwere ike dị mfe, mana ọ ga-enwe ezi nghọta.Aziza gị ga-adi mma karịa n’ihi ọ ga-abịa site na nghọta dị ukwu karịa.

Hụba-ama

  1. Lee W. Ickes, Empathic Accuracy (1997); and M. L. Hoffman, Empathy and Moral Development: Implications for Caring and Justice (2000).

  2. Lee, maka ọmụmatụ, Emily Teding van Berkhout and John M. Malouff, “The Efficacy of Empathy Training: A Meta-Analysis of Randomized Controlled Trials,” Journal of Counseling Psychology (2016), 63(1), 32–41.

  3. Lee, maka ọmụmatụ, Brené Brown, I Thought It Was Just Me (But It Isn’t) (2008); Theresa Wiseman, “A Concept Analysis of Empathy,” Journal of Advanced Nursing (1996), 23, 1162–67; and Ed Neukrug and others, “Creative and Novel Approaches to Empathy: a Neo-Rogerian Perspective,” Journal of Mental Health Counseling, 35(1) (Jan. 2013), 29–42.

  4. Henry B. Eyring,”Onye Nkasi-obi,” Liahona, May 2015, 18.

Bipụta