2019
Ime Ije-ozi Nlekọta Jupụta n’Ọńụ
Eprel 2019


Foto, oyiyi
ministering

Ụkpụrụ niile nke ije-ozi Nlekọta, Eprel 2019

Ime Ije-ozi nlekọta jupụta n’Ọńụ

Ije-ozi n’ịhụnanya n’ewete ọńụ nye onye n’enye enye na onye na-anata anata.

Oge ụfọdụ ọchụchọ anyị maka ańụrị n’ime ndụ nkea nwere ike ịdị ka anyị na-agba ọsọ n’enweghị njedebe. Anyị n’agba ọsọ na agba ọsọ ma dịkwa ka anyị enwebeghị ebe anyị ruru. Maka ụfọdụ mmadụ, echiche ije-ozi nlekọta nye ndị ọzọ na-adị ka agbakwunyere ihe ọzọ aga eme.

Mana Nna anyị nke Eluigwe chọrọ ka anyị nwete ọńụ ma ọ gwawo anyị “mmadụ dị, ka ha wee nwete ọńụ” (2 Nephi 2:25). Ma Onye-nzọpụta kuziri na ije-ozi nlekọta nye ndị ọzọ bụ otu akụkụ dị oke mkpa n’otu anyị si ewete ọńụ n’ime ndụ anyị na ndụ ndị ọzọ.

Gịnị bụ Mmetụta ọmịiko?

Ọńụ ka akọwara dịka mmetụta nke nnukwu mmasị na ańụrị.”1 Ndị amụma Ụbọchi ikpeazụ a eweteworịị ezi nkọwa maka ebe ọńụ si abịa na otu esi achọta ya. “Ọńụ ahụ anyị n’enwete abụghị maka ọnọdụ nke ndụ anyị ma ọ gbasara ihe niile ebe uche nke ndụ anyị nọ,” ka Onye-isi Russell M. Nelson kwuru.” … Ọńụ na-abịa site na n’ihi [Jizọs Kraịst]. Ọ bụ ebe ọńụ niile si abịa.”2

Ije-ozi nlekọta N’Ewete Ọńụ

Mgbe Lehi riri mkpụrụ osisi nke osisi nke ndụ, mụọ ya jupụtara “n’oke ọńụ” (1 Nephi 8:12). Ọchịchọ nke mbụ ya buuru ikekọrịta mkpụrụ osisi nke a ya na ndị ọ hụrụ n’anya.

Njikere anyị ije-ozi nlekọta nye ndị ọzọ nwere ike iwete ụdị ọńụ a nye anyị ma nyekwa ha. Onye nzọpụta kuziri ndi n’eso ụzọ Ya na mkpụrụ osisi anyị n’ewete mgbe anyị jikọtara na Ya n’enye aka iwetere anyị uju nke ọńụ (lee John 15:1–11). Ime ọrụ Ya site n’ije-ozi na ichọ ịkpọta ndi ọzọ nye Ya nwere ike ibụ nhumihe jupụtara n’ọńụ (lee Luk 15:7; Alma 29:9; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile18:16; 50:22). Anyị nwere ike ihụta ọńụ nkea ọbụladị n’ihu nke mmegide na ntaram ahụhụ (lee 2 Ndi Kọrint 7:4; Ndi Kọlọsi 1:11).

Onye nzọpụta gosiri anyị ọmụmatụ ahụ zuru oke na otu n’ime ụzọ kacha ukwuu nke ezi ọńụ n’ime ndụ anụ ahụ bụ nke ana achọta site n’ije ozi. Mgbe anyị n’eje-ozi nlekọta nye ụmụnne anyị ndi nwoke na ndi nwanyị dịka Onye-nzọpụta, jiri afọ-ọma na ịhụnanya n’ime obi anyị, anyị nwere ike inwete ọńụ nke na-agafe ańụrị dị mfe.

““Dịka anyị n’eji obi anyị anabata [ije-ozi nlekọta], anyị ga … adị nso ịbụrụzi ndi Zaịọn ma g’enwete ọńụ dị ukwuu anyị na ndi anyị nyeworo aka n’ụzọ nke iso ụzọ,” ka Nwanne nwanyị Jean B. Bingham, Onye-isi Zuru ọha Otu Enyem aka kuziri.3

Olee Otu Anyị Ga-esi Eme Ije-ozi nlekọta jupụta n’Ọńụ karịa?

Enwere ọtụtụ ụzọ esi ewete ọńụ dị ukwuu n’ime ije-ozi nlekọta anyị. N’ebe a bụ uche ole ma ole:

  1. Ghọta ebumnuche gị n’ije ozi nlekọta. Enwere ọtụtụ ebumnuche iji jee-ozi nlekọta. Kacha nke, mgbalị anyị kwesịrị ịnọ n’otu ụzọ ya na ebumnuche nke Chineke “iwete anwụghị anwụ na ndụ ebigh ebi nke mmadụ” (Moses 1:39). Ka anyị na-anabata ọkpụkpọ oku Onye-isi Russell M. Nelson inyere ndi ọzọ aka n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ, anyị nwere ike ịchọta ọńụ site n’isoro mee ihe n’ọrụ nke Chineke.4 (Maka inwete karịa gbasara ebumnuche nke ije-ozi nlekọta, lee “Ukpụrụ niile nke Ije-ozi nlekọta: Ebumnuche Nke Ga Agbanwe Ije-ozi nlekọta Anyị,” n’ime Liahona.)

  2. Mee ije-ozi nlekọta maka ndi mmadụ n’abụghị ọrụ. Onye-isi Thomas S. Monson mgbe ụfọdụ n’echetere anyị: “Ekwekwala ma ọlị nsogbu nke aga emetazi dịrịzie mkpa karịa onye nke ekwesịrị ịhụ n’anya.”5 Ije-ozi nlekọta bụ gbasara ịhụnanya nye mmadụ, n’abụghị maka ihe ndi aga eme. Dịka anyị n’etolite inwe ịhụnanya dịka Onye-nzọpụta mere, anyị ga-adị na njikere karịa maka ọńụ nke ahụ na-abịa site n’ijere ndi ọzọ ozi.

  3. Mee ije-ozi nlekọta mfe. Onye-isi M. Russell Ballard, Onye-isi Nnọchite nke Kworum ndi Ozi Iri-na-abụọ, na-agwa anyị: “Nnukwu ihe na-abịa site na ihe ndi dị mfe ma dịrị obere. … Omume obi ebere na ije-ozi anyị dị obere ma dịrị mfe ga amụbanye n’ime ndụ jupụtara n’ịhụnanya maka Nna nke Eluigwe, jiri obi anyị n’ọrụ nke Onye-nwe-anyị Jizọs Kraịst, na mmetụta nke udo na ọńụ oge ọbụla anyị gakwuru otu onye na ibe ya.”6

  4. Wezuga ndoli ahụ pụọ n’ije-ozi nlekọta. Ọbụghị oke na ọrụ gị ịrụpụta nzọpụta nke otu onye. Nke ahụ bụ n’etiti onye ahụ na Onye-nwe-anyị. Oke na ọrụ anyị bụ inwe ịhụnanya n’ebe ha nọ ma nyere ha aka chewe ihu na Jizọs Kraịst, onye bụ Onye-nzọpụta ha.

Ewepụkwala Ọńụ nke Ije-ozi

Oge ụfọdụ ndi mmadụ na-adọla azụ irịọ enyem aka ha chọrọ, ya mere ije-ozi anyị nwere ike bụrụ nanị ihe ha chọrọ. Ụlọ ahụ n’enweghị unyi dị na ya bịara dịrịzie unyi. Ịjụ ma ha kwere tupu ije-ozi nlekọta bụ uche dị mma.

Okenye Dieter F. Uchtdorf nke kworum ndi Ozi Iri na abụọ kwuru maka otu onye nne nanị ya onye butere ọrịa chicken pọx—ma emesịa ụmụ ya dakwara ọrịa. Ụlọ ahụ n’enweghị unyi dị na ya bịara dịrịzie unyi. Efere nri na akwa ruru unyi juru ebe niile.

Na nwa oge mgbe ihe niile juru ya anya, ụmụnne nwanyị Otu Enyemaka kụrụ aka n’ọnụ ụzọ. Ha ekwughị, “Ka anyị mara ma anyị nwere ike inye aka.” Mgbe ha hụrụ ọnọdụ ahụ, ha banyere n’ọrụ.

Ha kpochasịrị unyi niile ahụ, webata ihé na ịdị ọcha n’ime ebe obibi ahụ, ma kpọọ otu enyi iwete ụfọdụ ngwa nri kacha mkpa. Mgbe ha mechara ọrụ ha ma lawa, o mere ka onye nne obere ahụ jupụtara n’anya mmiri—anya mmiri nke obi ekele na ịhụnanya.”7

Ma ndi nyere enye na onye natara anata nwetere mmetụta mkpọm ọkụ nke ọńụ.

Kụọ mkpụrụ nke Ọńụ n’ime Ndụ Gị

Ọńụ, udo, na afọ ojuju karịrị anyị nwere ike ịkọ n’ime ndụ anyị, ọ ga adịrị anyị mfe ikekọrịta anyị na ndi ọzọ dịka anyị n’eje ozi nlekọta. Ọńụ na-abịa site na Mụọ Nsọ (lee Ndi Galetia 5:22 an Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:13). Ọ bụ ihe anyị nwere ike ikpe ekpere maka ya (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 136:29) ma kpọbata n’ime ndụ anyị. Ebe a bụ uche ole ma ole maka ịkụ ọńụ n’ime ndụ nke onwe anyị:

  1. Gụkọọ Ngozi Gị ọnụ Dịka ị na elebanyere ndụ gị anya, dee n’ime akwụkwọ jonalụ gị ihe ndị Chineke jiri gọzie gị.8 Mata ihe ndi niile dị mma nọ n’akụkụ gị.9 Gee ntị maka ihe ndị nwere ike iwezuga gị site n’inwete ọńụ ma dedata ụzọ iji metazie ma ọbụ ghọtazie ha. N’oge Ista nkea, jiri nwayọ chọta njikọ karịrị akarị gị na Onye-nzọpụta (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 101:36).

  2. Mụọ itinye uche n’ọrụ. Ọńụ nwere ike ịchọta gị kacha mfe n’oge nke ntụgharị uche dị nwayọ.10 Gezie ntị nke ọma maka ihe n’ewetere gị ọńụ (lee 1 Krọnịkul 16:15). Oge iwezugara onwe gị site na media nwere ike oge ụfọdụ dị mkpa iji mụọ itinye uche n’ọrụ.11

  3. Zere ịtụlerita onwe gị. Ekwuwo na ntụlerita bụ onye oshi nke ọńụ. Pọl adọwo aka na ntị na ndi “n’ewere onwe ha tụọ onwe ha, ma were kwa onwe ha tulee onwe ha, ha onwe ha aghọtaghị ihe” (2 Ndi Kọrint 10:12).

  4. Chọọ mkpughe nke onwe. Onye Nzọpụta kuziri: “Ọbụrụ na unu ga-arịọ, unu ga-anata mkpughe n’elu mkpughe, ọmụma-ihe n’elu ọmụma-ihe, ka unu wee mata ihe-omimi niile na ihe-udo niile—nke ahụ na-eweta ọn̄ụ, nke ahụ na-eweta ndụ ebighi-ebi” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:61).

Ịkpọ-ókú Ime

Olee otu I ga-esi ewulite ọńụ nke I na-enwete na ndụ gị site n’ije-ozi nlekọta?

Hụba-ama

  1. “Ọńụ,” en.oxforddictionaries.com

  2. Russell M. Nelson, “Ọńụ na Nlanarị nke Mụọ,” Liahona, Nov. 2016, 82.

  3. Jean B. Bingham, “Ije-ozi nlekọtadịka Onye-nzọpụta si Eme,” Liahona, May 2018, 106.

  4. Russell M. Nelson, “Dịka Anyị Na-Agakọrịta-ọnụ N’ihu,” Liahona, Apr. 2018, 7.

  5. Thomas S. Monson, “Ịchọta Ọńụ n’ime Njem ahụ,” Liahona, Nov. 2008, 86.

  6. M. Russell Ballard, “Ịchọta Ọńụ site n’Ije-ozi Ịhụnanya,” Liahona, May 2011, 49.

  7. See Dieter F. Uchtdorf, “Ibi ndụ Ozi-ọma N’uju Ọńụ,” Liahona, Nov. 2014, 120–123.

  8. See Henry B. Eyring, “O Cheta, Cheta,” Liahona, Nov. 2007, 67.

  9. See Jean B. Bingham, “Ka Ọńụ Gị Wee Jupụta.” Liahona, Nov. 2017, 87.

  10. Dieter F. Uchtdorf, “Maka Ihe niile Nke Dịkacha Mkpa,” Liahona, Nov. 2010, 22.

  11. See Gary E. Stevenson, “Mkpuchi nke Mụọ,” Liahona, Nov. 2017, 46.

Bipụta