2019
Kedụ Otu Anyị Nwere ike sị Kepụta Omenala nke Ngụnye n’ime Nzukọ-nsọ?
Julaị 2019


Foto, oyiyi
ministering

Ụkpụrụ niile nke Ije-ozi Nlekọta, Julaị 2019

Kedụ Otu Anyị Nwere ike sị Kepụta Omenala nke Nsonye n’ebe Nzukọ-nsọ?

Mgbe anyị lere anya gburu gburu ngalaba ukwu na ngalaba nta anyị, anyị na ahụta ndị mmadụ ndị na-adịka ha dabara n’ụzọ dị mfe. Ihe anyị anaghị amata bụ na ọbụna n’etiti ndị ahụ dịka ha dabara, e nwere ọtụtụ ndị chere na ha esoghị. Otu mmụta, n’ịmaatụ, na nso nso chọpụtara na ihe ruru ọkara ndị okenye dị n’ime United States kwuru maka ịnọ nanị ha, nhapụ, ma ọbụ a jụrụ ajụ n’etiti ndị ọzọ.1

Ọ dị mkpa inwe mmetụta na agụnyere gị. Ọ bụ isi mkpa ụmụ mmadụ, ma mgbe ọ dị ka agụpụrụ anyị, ọ na-afụ ụfụ. Ịgụpụ agụpụ nwere ike iwetere anyị mmetụta nke mwute na ọbụ iwe.2 Mgbe ọ dị ka anyị esoghị, anyị na-achọ ebe anyị ga-esonye nke ọma. Anyị kwesịrị inyere onye ọbụla aka mata na ha sonyere na nzukọ-nsọ.

Gụnyekọta dịka Onye-nzọpụta.

Onye nzọpụta bụụrụ ọmụmatụ ahụ zuru oke nke iji kpọrọ ihe na ịgụnyekọta ndị ọzọ. Mgbe Ọ họrọ Ndị Ozi Ya, Ọ leghị anya n’ọnọdụ, akụ na ụba, ma ọbụ ọrụ dị elu. O ji nwanyị Samerịa ahụ nọ n’ebe well kpọrọ ihe, n’agbara ya ama maka ịdị nsọ Ya n’agbanyeghị otu ndị Juu sị n’eleda ndị Samerịa anya (lee Jọn 4). Ọ n’ele anya n’obi ma ọ naghị asọpụrụ mmadụ (lee 1 Samuel 16:7; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:16, 26).

Onye-nzọpụta kwuru:

“Iwu nsọ ọhụụ ka M n’enye unu, Na unu hụkọritara onwe unu n’anya; dịka m sịrị hụ unu n’anya, na unu hụkwa onwe unu n’anya onye ọbụla n’ime unu.

“Site otua ka mmadụ niile si amata na unu bụ ndi na eso ụzọ m, ọbụrụ na unu nwee ịhụnaanya onye ọbụla n’ime unu” (Jọn 13:34-35).

Gịnị ka Anyị Nwere ike Ime?

Mgbe ụfọdụ ọ na-ara ahụ ịmata ma enwere onye ọ dị ya ka o soghị. Ọtụtụ mmadụ anaghị ekwu ya—ma ọ bụghị ihe ọzọ n’ụzọ n’edoghị anya. Mana site n’obi ịhụnanya, odudu nke Mụọ Nsọ, na mgbalị nke mkpachapụanya, anyị nwere ike ịmata mgbe otu onye chere na agụpụrụ ya site na Nzukọ nsọ

Ihe iriba ama Pụrụ ime Mmadụ Echee na Agupụrụ ya:

  • Ahụ akpachiri akpachi, dịka aka apịajisiri ike apịaji ma ọbụ anya dị mwute.

  • Ịnọdụ ọdụ n’azụ ime ụlọ ma ọbụ ịnọdụ ọdụ naanị ya.

  • Abịaghị nzukọ nsọ ma ọbụ abịaghị mgbe niile.

  • Isite na nzukọ ma ọbụ egwuregwu pụọ ọsọ ọsọ.

  • Esoghị eme ihe nkwukọrịta ụka ma ọbụ ihe ọmụmụ.

Ndịa nwere ike bụrụ ihe iriba ama nke mmetụta uche ndị ọzọ kwa, dịkwa ka ihere, nchegbu, ma ọbụ obi erughị ala. Ndị otu nwere ike chee na ha dị “iche” mgbe ha bụ ndị otu ọhụụ nke Nzukọ nsọ, sitere na mba ọzọ ma ọbụ omenala, ma ọbụ e nwetewo nhumihe mgbanwe ndụ n’agbawa obi na nso nso, dịkwa ka ịgba alụkwaghị, ọnwụ nke otu onye otu nke ezi na ụlọ, ma ọbụ ịlọghachi ozi mgbasa ozi n’oge.

N’agbanyeghị ebumnuche ahụ, anyị ekwesịghị ịsọla azụ ịgarụ n’ịhụnanya. Ihe anyị n’ekwu na ihe anyị n’eme nwere ike mepụta mmetụta na onye niile ka anabatara na onye niile ka achọrọ.

Ụfọdụ Ụzọ Ịgụnye na Ịnabata:

  • A nọdụkwala ọdụ n’akụkụ ụdị ndị mmadụ ahụ na nzukọ nsọ mgbe niile.

  • Lefere anya n’ọdịdị ha pụtara ihé ịhụta onye ha bụ n’ezi okwu. (Maka ihe ndị ọzọ n’isi okwu a, lee “Ije-ozi nlekọta Bụ Ịhụta Ndị ọzọ dịka Onye-nzọpụta Sị ahụ,” Liahona, Jun 2019, 8–11.)

  • Gụnye ndị ọzọ na mkparịta ụka.

  • Kpọkuo ndị ọzọ ịbụ otu akụkụ nke ndụ gị. I nwere ike ịgụnye ha n’egwuregwu nke i bidoworo nhazi.

  • Chọọ ma rụpụta mmasị zuru ọnụ.

  • Akwụsịkwala ime enyi nanị n’ihi nwa mmadụ etozughị n’anya gị.

  • Mgbe i hụrụ ihe pụrụ iche gbasara otu onye, nwee mmasị na ihe ahụ kama ile ya n’anya ma ọbụ izere ya.

  • Gosipụta ịhụnanya ma nye ezi ekele.

  • Kpachapụ anya chee gbasara ihe ọ pụtara mgbe anyị n’ekwu na Nzukọ nsọ bụ maka ndị niile, n’agbanyeghị ọdịiche ha. Kedụ ụzọ anyị nwere ike isi mee nkea adị ire?

Ọ naghị adịcha mfe inwe obi ruru ala n’akụkụ ndị mmadụ dị iche n’etiti anyị. Ma na omume, anyị nwere ike dị mma karịa n’ịchọta uru n’ime ọdịiche ma nabata onyinye pụrụ iche nke onye ọbụla wetere. Dịka Okenye Dieter F. Uchtdorf nke Kworum Ndị Ozi Iri na abụọ kuziri, ọdịiche anyị nwere ike inye aka mee anyị ndị nwere ańụrị dị mma: “Bịa, nyere anyị aka rụpụta ma gbaa ume nye omenala nke ọgwụgwọ, obiọma, na ebere ruo ụmụ niile nke Chineke.”3

Agọziri site na Ngụnye

Christl Fechter gara mba ọzọ mgbe agha gbasasiri ala nna ya. Ọ sụghị asụsụ ahụ nke ọma ma enweghị onye ọ maara n’ebe agbata obi ọhụrụ ya, ya mere na mbụ ọ dịrị ka agụpụrụ ya ma ya a nọrọ naanị ya.

Dịka onye otu nke Nzukọ nsọ, ọ kpọkọtara obisike ya ma bido ị ga na ngalaba ukwu ọhụrụ ya. O chegburu onwe ya na olumba ya ga-eme ka ndị mmadụ hara ikwusara ya okwu ma ọbụ na aga ama ya ikpe maka na ọ lụbeghị di.

Kama o zutere ndị ọzọ ndị leghara ọdịiche ya anya ma nabata ya n’ime igwe enyi ha. Ha setipụrụ aka n’ịhụnanya, ma n’adịghị anya ọ hụtara onwe ya n’ọrụ inye aka kuziere klas Ụmụaka Prịamarị ndị ahụ bụụrụ nnukwu ọmụmatụ nke nnabata, na mmetụta nke ị bụ onye ahụrụ n’anya na onye achọrọ gbara okwukwe ya ume ma nyere ya aka wụgharịa ofufe ndu ogologo oge ya nye Onye-nwe-anyị.

Hụba-ama

  1. Lee Alexa Lardieri, “Study: Many Americans Report Feeling Lonely, Younger Generations More So,” U.S. News, May 1, 2018, usnews.com.

  2. Lee Carly K. Peterson, Laura C. Gravens, na Eddie Harmon-Jones, “Asymmetric Frontal Cortical Activity and Negative Affective Responses to Ostracism,” Social Cognitive and Affective Neuroscience, vol. 6, no. 3 (Jun 2011), 277–85.

  3. Dieter F. Uchtdorf, “Kwere, Nwee Ịhụnanya, Mee,” Liahona, Nov. 2018, 48.

Bipụta