Ụkpụrụ niile nke Ije-ozi Nlekọta, Ọgọst 2019
E nwere m ike Inyere Mmadụ aka Gbanwee?
Ee. Kama ọrụ gị nwere ike dị iche karịa ka i chere.
E kere anyị nye anyị ikike ịgbanwe. Ebumnuche nke ndụ anụ ahụ anyị nkea bụ k’anyị tolite ị bụrụ onye nsọ ahụ anyị kwesịrị ị bụ. Otu n’ime ebumnuche anyị kachasi elu n’ije ozi nlekọta bụ inyere ndi ọzọ aka bịakwute Kraịst ma mee mgbanwe ndi dị mkpa ịlaghachị n’ihu Ya. Kama n’ihi nhọrọ nke onwe ha, ọrụ anyị n’inyere ha aka dịrịzie dịka Kraịst karịa belatara ebelata.
N’ebe a bụ nkuzi 7 dị ike sitere n’aka Onye-nwe-anyị maka ụzọ anyị nwere ike isi nyere ndi ọzọ aka n’ime mgbalị ha ịgbanwe ma dịrịzie karịa dịka Ya.
-
Atụla Egwụ Ịkpọbata Mgbanwe
Onye-nzọpụta atụghị egwu ịkpọku ndi ọzọ ịhapụ agwa ochie n’azụ ma nabata nkuzi ya niile. Ọ kpọkuru Pita na Jemes ka ha hapụ ọrụ ha niile ma “bụrụzie ndi ogu-azụ nke mmadụ” (Mak 1:17). Ọ kpọkuru nwanyị nke ejidere n’ịkwaiko ka ọ “laa, ma ghara ime njọ ọzọ” (Jọn 8:11). Ọ kpọkuru nwa okoroọbịa ahụ bara ọgaranya ka ọ nyepụ ihe jidere ya n’ihe nke ụwa ma soro Ya (lee Mak 10:17–22). Anyị kwa nwere ike nwe ma obisike ma ịhụnanya dịka anyị n’akpọku ndi ọzọ niile ime mgbanwe ma soro Onye-nzọpụta.
-
Cheta Ọ bụ Nhọrọ Ha ị Gbanwe
Ụdị mgbanwe nke Onye-nzọpụta n’akpọku abụghị nke a ga-asị mmadụ mee m’ọbụrụ na ọ chọghị ị mee ya. Onye-nzọpụta kuziri ma kpọkuo, kama O jighị ike ike. Nwa okoroọbịa ahụ bara ọgaranya “pụrụ n’iru-uju” (Matiu 19:22). N’ime Capernaum, ọtụtụ n’ime ndi n’eso ụzọ Ya họọrọ ị “laghachị azụ,” ma Ọ jụrụ ndi Iri na Abụọ ma ha ga ala kwa (lee Jọn 6:66–67). Ụfọdụ ndi n’eso Jọn Omee Baptism họọrọ isoro Onye-nzọpụta, ndi ọzọ ekweghị (lee Jọn 1:35–37; 10:40–42). Anyị nwere ike ikpọku ndi ọzọ ka ha dịrịzie dịka Ya, kama anyị agaghị emere ha mkpebi mgbanwe. Ma ọbụrụ na ha ahọrọbeghị ịgbanwe, anyị agaghị ada mba—m’ọbụ anyị abịa n’eche na anyị adawo.
-
Kpee ekpere maka Ike Ndi ọzọ Ịgbanwe
N’oge ekpere arịrịọ Ya, Jizọs rịọrọ Chineke ka e chekwa ndi n’eso ụzọ Ya site n’ihe ọjọọ, ka ha dịrị dịka Ya na Nna karịa, ma na ha ga-ejupụta n’ịhụnanya nke Chineke (lee Jọn 17:11, 21–23, 26). Ma n’ịmara na Pita ga-achọ mgbam ume n’ime mgbalị ya itolite n’ọrụ ya, Onye-nzọpụta kpere ekpere n’ihi ya (lee Luk 22:32). Ekpere anyị n’ekpe n’ihi ndi ọzọ nwere ike ime ihe dị iche (lee Jemes 5:16).
-
Kuziere Ha Ịtụkwasị obi n’Ike Ya
Ọ bụ nanị site n’Onye-nzọpụta ka anyị nwere ike n’ezie gbanwe ma tolite n’ụzọ ike si n’igwe nke anyị dum nwere. Ọ bụ “ụzọ, ezi-okwu, na ndụ ahụ: ọdighị onye na-abịakwute Nna, ma ọbụghị site na [Ya]” (Jọn 14:6). Ọ bụ ike Ya ga-enwe ike “mee ihe niile nke n’esighị ike sie ike” (Ita 12:27). Ọ bụbụụrụ okwukwe n’ime ike aja-mgbaghara-mmehie Ya mere Alma nke Nta si gbanwee (lee Alma 36:16-23). Anyị nwere ike ikuziri ndi ọzọ ịtụkwasị obi n’Onye-nzọpụta ka ha onwe ha kwa nwete ike nsachapụ Ya n’ime ndụ ha niile.
-
Kpasị Ha Agwa dịka Ha Nwere ike Ibụ
Ịhụnanya na nnabata nwere ike bụrụ ngwa-ọrụ dị ike maka mgbanwe. Nwanyị ahụ nọ n’ebe olulu mmiri ahụ biiri ya na otu nwoke onye n’abụghị di ya. Ndi n’eso ụzọ Jizọs “tụrụ anya na ọ kwusiiri nwanyị ahụ okwu” (Jọn 4:27), mana Jizọs nwere nnukwu mmasị gbasara ihe ọ nwere ike ịbụ. Ọ kuziiri ya ma nye ya ohere ịgbanwe, nke o mere. (Lee Jọn 4:4-42.)
Mgbe anyị n’akpasị ndi ọzọ agwa dịka otu ha dị na mbụ kama otu ha nwere ike isi dịrị, anyị nwere ike ịdọla ha azụ. Kama, anyị nwere ike gbaghara ma chefuo njehie ndi gara aga. Anyị nwere ike kwere na ndi ọzọ nwere ike ịgbanwe. Anyị nwere ike leghara adịghị ike anya ma chọpụta ágwá ha ndi dị mma nke ha n’enweghị ike ịhụta n’onwe ha. “Anyị nwere oke n’ọrụ ịhụta mmadụ n’abụghị otu ha dị kama dịka otu ha nwere ike ịbụ.”1
-
Kwe ka Ha Gaa n’Ike Nke Onwe Ha
Mgbanwe n’abịa ntakịrị ntakịrị. Anyị niile garịrị “aga n’ihu na ndidi tutu [anyị] ezuo oke” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 67:13). Jizọs nwere ndidi maka ndi ọzọ ma gaa n’ihu ikuzi ọbụna ndi ahụ jụrụ ya, n’agba ama maka ọrụ Ya enyere Ya site n’aka Nna Ya na ịza ajụjụ ha niile (lee Matiu 12:1–13; Jọn 7:28–29). Anyị nwere ike inwe ndidi maka ndi ọzọ ma gbaa ha ume inwe ndidi maka onwe ha.
-
Adala Mba M’ọbụrụ Na Ha Daghachị n’Agwa Ochie
Oge ọnwụ Kraịst gasịrị, ọbụna Pita na ụfọdụ Ndi Ozi ndi ọzọ laghachịrị azụ n’ihe ha maara nke ọma (lee Jọn 21:3). Kraịst chetaara Pita na ya kwesịrị i “nye atụrụ [Ya] nri” (lee Jọn 21:15-17), ma Pita laghachịrị n’ije-oziọma. Ọ na-adị mfe oge niile ịlaghachị azụ n’agwa ochie ndi ahụ. Anyị nwere ike gaa n’ihu ikwado site na mgbam ume dị nwayọ na ọkpụkpọ oku na akwalite mụọ gaa n’ihu isoro Onye nzọpụta ma gbalịa ịdị dịka Ya karịa.
Kwe ka Ndi ọzọ Tolite
Okenye Jeffrey R. Holland nke Kworum nke Ndi-ozi Iri na abụọ n’akọ akụkọ nkea gbasara ikwe ka ndi ọzọ tolite: “A gwabuuru m maka otu nwa okoroọbịa onye n’ọtụtụ afọ bụụrụ onye dabara n’etiti ihe ọchị niile n’ime ụlọakwụkwọ ya. O nwebuuru ụfọdụ adịghị ike, ma ọ dịịrị ndi ebiri ya mfe ịkwa ya emo. Emesịa n’ime ndụ ya ọ kwagara ebe ọzọ. O mesịrị n’ezie banye otù-ndi-agha ma nwe ụfọdụ nhụmihe ọma n’ebe ahụ n’inwete agụm akwụkwọ ma n’izugbe hapụ ndụ ya gara aga. Kacha nke, dịka ọtụtụ n’ime otù-agha na-eme, ọ chọpụtara ịma mma na ịdị ebube nke Nzukọ nsọ ma dịrịzie uchu n’ọrụ ma nwe ańụrị na ya.
Mgbe ahụ, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, ọ laghachịrị obodo nke ntoroọbịa ya. Ọtụtụ ndi ọgbọ ya a gawo n’ihu mana ọbụghị onye niile. O doro anya na, mgbe ọ laghachịrị dịka onye mere nke ọma na onye amụgharịrị, ụdị echiche ahụ nọbụụrụ na mbụ ka nọọrọ ebe ahụ, n’eche maka nlọghachị ya. N’obi ndi mmadụ dị n’ime obodo a mụrụ ya, ọ ka bụkwa mmadụ ‘nkea-na-nkea’ nke ochie ahụ. …
Ntakịrị ntakịrị mgbali nwoke nkea ịhapụ nke ahụ nke nọọrọ n’azụ ma jigide ihe nrite nke Chineke chere ya n’ihu jiiri nwayọ nwayọ pụọ tutu ya anwụọ dịka otu o siri bie ndụ ntoroọbịa ya. … Ọ dị oke njọ, dịrị oke mwute na ọzọ kwa ndi gbara ya gburugburu bụ … ndi ahụ ndi chere na ndụ ya gara aga dịịrị mma karịa ọdịnihu. Ha gbalịrị ịwepụ n’ahụ ya nke ahụ nke Kraịst nyeworo ya. Ma ọ nwụrụ n’iwe, n’agbanyeghị site na obere njehie nke onwe ya. …
“Ka ndi mmadụ chegharịa. Ka ndi mmadụ tolite. Kwere na ndi mmadụ nwere ike ịgbanwe ma tolite.”2
© 2019 by Intellectual Reserve, Inc All rights reserved. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/18. Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/18. Ntụgharị nke Ministering Principles, August 2019. Igbo. 15769 593