2020
Ikpokọta Izrel site n’Ije-ozi Nlekọta
Jenụwarị 2020


Foto, oyiyi
ministering

Ụkpụrụ niile nke ije-ozi Nlekọta, Jenụwarị 2020

Ikpokọta Izrel site n’Ije-ozi Nlekọta

Ije-ozi nlekọta bụ otu ohere isoro ndụmọdụ nke onye-amụma ikpokọta izrel.

Onye-isi Russell M. Nelson akpọkuwo anyị inye aka kpokọta Izrel—“ihe kachasi mkpa na-eme n’elu ụwa taa.”1

Maka ndi ahụ chọrọ isoro n’ọrụ nkea nke ikpokọta Izrel, ije-ozi nlekọta nwere ike ịbụ ohere-ọma dị egwu. Ọ bụ ụzọ dị mma iji gbanwe ndụ ndi mmadụ. Ọbụrụgodị na anyị n’eje-ozi nlekọta nye ndi otu dara mba ma ọbụ ịkpọku ha inyere anyị aka dịka anyị n’eje-ozi nye ndi ahụ n’abụghị nke okwukwe anyị, ije-ozi nlekọta n’ewete ohere-ọma iji kpokọta Izrel.

Ịnapụta Ndi otu Na-alaghachị

“Site n’ịhụnanya dịka mkwalite ahụ, ihe iriba-ama ga-eme, ma anyị ga-achọta ụzọ niile iji kpọta ụmụnne anyị ndi nwanyị na ndi nwoke ‘furu efu’ n’ime ngụnye mkpuchite niile nke oziọma nke Jizọs Kraịst.” —Jean B. Bingham2

“Adawo m mba ihe rukwara afọ isii mgbe mụ na di m kwagara n’obodo ọhụrụ Onye-isi Otu Enyemaka ọhụrụ m bịara leta m, n’ajụ ma m ga-ekwe otu nwanne nwanyị bịa leta m. N’ịma ririri, e kwere m. Nwanne nwanyị nkea bịara leta m ọnwa niile, n’agbanyeghị ahụ ya anabataghị nkịta—ma enwere m otu nkịta nwere ịhụnanya! Ije-ozi nlekọta ya gara n’ihu ruo afọ abụọ, ma o nwere nnukwu mmetụta n’ime m.

N’agbanyeghị nleta ya mgbe niile gbasara ihe n’eme n’ụwa, mgbe na mgbe ọ na-ajụ m ajụjụ nke n’eduba anyị na mkparịta ụka ime mụọ. Ndia mere m obi erughị ala nwa ntakịrị, kama ha kpalitere mụọ m ikpebi ma ọ bụ ịga n’ihu n’ime ozi ọma ka ọbụ ịnọrọ ebe m nọ. Mkpebi nkea bụụrụ ndọli nye m, kama a họọrọ m ịnọkọta mụ na ụmụnne nwanyị ndi mgbasa ozi ọma.

N’ụbọchị ahụ m gara nzukọ oriri nsọ nke mbụ n’afọ isii, atụrụ m egwu ịbanye n’ime. Mgbe m banyere n’ime ụlọ nzukọ nsọ, nwanne nwanyị ije-ozi nlekọta m nọọrọ n’eche m, ma o kpọbara m n’ime chapụl. Mgbe e mesịrị, ọ dupụrụ m ruo n’ụgbọala m, na-ajụ m ihe ọ ga-eme inyere m aka nkeọma dịka m na-abịaru Onye-nzọpụta nso.

Oge na ịhụnanya nke nwanne nwanyị ije-ozi nlekọta m nyere aka idu m laghachi n’ọrụ, ma a na m ewere mgbalị ya dịka otu n’ime onyinye kachasị enyeworo m. Obi m jupụtara n’ekele na ọ nọọrọ mgbe ahụ n’akụkụ m na njem nlaghachi m gaa na Nzukọ nsọ nke Onye-nzọpụta ahụ.”

Aha edepụtaghị, British Columbia, Canada

Ụkpụrụ niile aga Atụle

“Bịara leta m ọnwa niile”

Olee otu i g’esi egosi na i nwere mmasị n’ebe ndi ahụ i n’eje-ozi nlekọta nye nọ karịa ihe ndi ọzọ niile? (Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:44).

“Ajụjụ niile”

Ịjụ ajụjụ ziri ezi nwere ike nyee aka kpalite ntule nke onwe. Cheta na ije-ozi nlekọta anyị nwere nzube nke karịrị ịbụ ndi na-elekọta mmadụ.3

“Na-eche m”

Onye niile kwesịrị inwe mmetụta nnabata (lee 3 Nifaị 18:32).

“N’ebe ahụ n’akụkụ m na njem nlaghachi m”

Nkwado anyị nwere ike mepụta ọdịiche pụtara ihe nye ndi ahụ ndi sụrụ ngọngọ ịlaghachịrị Onye-nzọpụta ma nwete ọgwụgwọ (lee Ndi Hibru 12:12-13).

Ije-ozi nlekọta na Ikpokọta

“N’ụzọ nke ọbụla dị n’ọdịdị ya ma dịrị nkịtị nye gị, kesaara ndi mmadụ ihe mere Jizọs Kraịst na Nzukọ nsọ Ya si dịrị gị mkpa. …

Ọrụ gị bụ ikesa ihe dị n’ime obi gị ma bie ndụ agbanwe agbanwe na nkwenye gị niile.” —Elder Dieter F. Uchtdorf4

Ije-ozi nlekọta na ikekọrịta ozi ọma na-aga aka na aka. Ebe a bụ ụfọdụ ụzọ anyị nwere ike ikpokọ ndi enyi na ndi agbata obi anyị dịka anyị n’eje ozi nlekọta—ma ọbụ n’eje-ozi nlekọta dịka anyị na-ekpokọ ndi enyi na ndi agbata obi anyị:

  • Jekọta ozi ọnụ. Chọọ ohere ọma ikpọku ndi enyi na ndi agbata obi isoro gị n’ije-ozi nlekọta nye mkpa nke otu onye. Rịọ ha inyere gị aka kwadoo otu nri maka otu onye nne ọhụrụ, ileta otu onye agbata obi agadi, ma ọbụ hichaa ebe obibi nke otu onye nọ n’ọrịa.

  • Kuzikọta ihe ọnụ. Tulee ikpọku otu enyi ma ọbụ onye agbata obi onye anaghị abịa nzukọ nsọ mgbe niile ihazi ihe mmụta mgbasa ozi ọma n’ime ebe obibi ha maka otu onye ya na ndi mgbasa ozi ọma nwere nzukọ. Ma ọbụ enyi gị nwere ike kwado gị n’ịhazi otu ihe mmụta n’ime ebe obibi gị ma ọbụ soro gị gaa mmụta n’ebe obibi nke onye ọzọ.

  • Gakwuru ndi ọzọ mgbe ị hụrụ mkpa. Nye aka maka ụgbọ ịga nzukọ nsọ. Kpọkuo ụmụntakịrị ịga ihe omume nke ndi ntoroọbịa ma ọbụ nke Praịmarị. Olee ụzọ ndi ọzọ i nwere ike iji jee-ozi nlekọta ma kpokọọ?

  • Jiri ngwa ọrụ Nzukọ nsọ weteworo Nzukọ nsọ n’enye ọtụtụ ngwa-ọrụ maka ndi otu inyere ha aka gbasaa ozi-ọma. I nwere ike brawụzụọ site na nkeji nke “Mgbasa ozi ọma” n’ime Gospel Library app ma gaa na ComUntoChrist.org maka nchepụta n’ụzọ esi ekpokọ Izrel nime obodo anyị niile.

Hụba-ama

  1. Russell M. Nelson, “Olile anya nke Izrel” (worldwide youth devotional, June 3, 2018), HopeOfIsrael.ChurchofJesusChrist.org.

  2. Jean B. Bingham, “Ije-ozi nlekọta dịka Onye-nzọpụta si Eme,” Liahona, May 2018, 106.

  3. Lee “Ụkpụrụ niile nke Ije-ozi Nlekọta: Nzube Nke Ga Agbanwe Ije-ozi Nlekọta Anyị,” Jan. 2019.

  4. Dieter F. Uchtdorf, “Ọrụ Mgbasa ozi ọma: Ikesa Ihe Nọ n’ime Obi Gị,” Liahona, May 2019, 17.

Bipụta