2020
Ije-ozi Nlekọta site n’Akụkọ agbụrụ nke ezinaụlọ
Febụarị 2020


Ụkpụrụ niile nke ije-ozi Nlekọta, Febụarị 2020

Ije-ozi Nlekọta site n’Akụkọ agbụrụ nke ezinaụlọ

Foto, oyiyi
ministering

Nkọwa site n’aka Joshua Dennis; akara ngosi dị n’okpuru na foto sitere n’aka Getty Images

Inyere otu mmadụ aka maka akụkọ agbụrụ nke ezinaụlọ ha bụ otu ụzọ kachasị ike iji jee-ozi nlekọta. Dịka ị na ejikọta ndi ọzọ ha na ndi nnannanna ha site n’akụkọ agbụrụ ezinaụlọ na nju niile, n’ikpe azu, ị n’emeju oghere dị nime obi ha nke mgbe ụfodụ ha amaghị na ha nwere.(lee Malakaị 4:5-6).

Ma ọ bụ onye otu Nzukọ nsọ oge ndụ ma ọ bụ onye na-anụtụbeghị maka ozi-ọma nke Jizọs Kraịst, ụmụ nke Chineke niile nwere ọchịchọ ịmata gbasara ebe ha siri bịa.

Mgbe ụfọdụ ọ naghị egbu oge ịhapụ mmetụta miri emi nọgidere, dịka egosipụtara n’ime akụkọ niile ndia sotere.

Ịchọta Ezinaụlọ na Fiiti 30,000

Na nso nso n’ime ụgbọ elu ịlaghachị ebe obibi, e nwetere m onwe m n’akụkụ Steve, onye kọọrọ m ụfọdụ akụkọ nke onwe ya. Ọ gụchawo akwụkwọ nke sekọndịrị, banye Amị U.S. dịka ọkachamara nzipụ ozi mgbe ọ gbara afọ 18, ma n’egbughị oge bido ịrụ ọrụ na White House, n’ewete nkwado nzipụ ozi nye Onyeisi nke United States. Site n’afọ 18-26, ọ jeere Ndiisi U.S. abụọ ozi. Akụkọ ya niile jụrụ anya!

“Steve,” mụ ekwuo, “ị kwesịrị idedata akụkọ ndia niile maka agbụrụ ọdịnihu gị! Ha kwesịrị isite n’aka gị nwete akụkọ ndia niile site na uche nke gị.” O kweere.

Mgbe ahụ Mụọ metụrụ m ịjụ ya ihe ndi ọ maara gbasara ndi nnannanna ya. Steve maara ọtụtụ gbasara akụkụ nke nne ya, tinyekọta otu akụkọ maka otu ezinaụlọ ya na Abraham Lincoln rikọtara nri abalị mgbe ọ naara adọ oche ndọrọ ndọrọ site n’akụkụ obodo n’oge nhọpụta ndi ọchịchị nke onyeisi 1860.

Ọ maara nwa obere gbasara akụkụ nke nna ya, n’agbanyeghị. Ọ nwere oké mmasị ịmata karịa. Ewepụtara m ekwe ntị m ma mepee app FamilySearch. “Steve, anyị nwere ike ịchọta ndi ezinaụlọ gị ugbua!”

Agbanyere m intanet nke ugbọ elu. Edokwasịrị m ekwe ntị m n’elu okpokoro dị n’ihu m ka anyị abụọ wee na ahụ. Anyị chọgharịrị FamilyTree. N’ime nkeji ole ma ole anyị abụọ nọọrọ n’ele asambodo alụm di na nwunye nnanna ukwu ya na nnenne ukwu ya.

“Ọ bụ ha!” ka o kwuru. “Echetere m aha nna ya ugbua!”

Mụọ nke obi ụtọ jupụtara n’etiti anyị abụọ. Anyị rụrụ ọrụ ịrụpụta njirimara maka ndi nnannanna ya amachaghị ama n’ime nkeji 45 ọzọ. Ọ rịọrọ m ka m kwee ya nkwa na anyị ga aga n’ihu ịchọkọta ọnụ n’ime Colorado. Anyị nyekọrịtara onwe anyị ozi maka inwete ibe anyị dịka ụgbọ elu dara.

N’ebe a ka anyị nọ, n’efe n’elu fiiti 30,000 (9,145 m), jiri ekwe ntị dị ntakịrị dịka aka m, n’achọgharị otu nwoke na otu nwanyị lụrụ afọ 100 gara aga onye fuworo efu nye ya na ezinaụlọ ya. Ihe ịtụnanya! Mana anyị chọtara ha. Ndi ezinaụlọ ka ejikọtara. Ọtụtụ akụkọ ka echetere. Mmetụta nke obi ekele ka enwetere maka teknụzu na ngwa niile. Ọ nweghị ihe pụrụ ya ịbụ ọrụ ebube.

Jonathan Petty, Colorado, USA

Ezinaụlọ Ọhụụ ya Gbara gburugburu

Marịa adawo mba n’ọrụ ihe karịrị afọ 20. Ọnwa ole ma ole gara aga, anyị na ya nọkọtara awa ole ma ole n’ebe obibi anyị, n’elegharị ezinaụlọ ya site n’ime ndekọta ọnụ-ọgụgụ na ihe ndi ọzọ. N’otu mgbe o bidoro ịgba anya mmiri n’ekwu, “A mụtawo m karịa banyere ezinaụlọ m n’ime awa abụọ karịa ka m maara n’ime ndụ m niile!”

Na njedebe oge anyị, anyị gosiri ya isiokwu dị n’ime FamilyTree app akpọrọ Relatives Around Me. Ọ bịara bụrụ na mụ na di m na Maria nwere njikọ dị anya. O bidoro bewa akwa ọzọ, n’ekwu na ya echeela na ya nọ nanị ya. O nweghị mgbe o chere na ya nwere ezinaụlọ n’ime mpaghara ahụ. Izu ụka ole ma ole gachara Maria zutere bishọp anyị. Ọ na akwado ugbua ịga tempụl, ma o zutewo ọtụtụ ụmụnne “ọhụụ” n’ime ngalaba ukwu anyị!

Carol Riner Everett, North Carolina, USA

Ntụziaka maka Ije-ozi Nlekọta

Ashley, otu nwanne nwanyị m n’eje-ozi nlekọta nye, na mụ nwere akwụkwọ isi nri ndi sitere n’aka ndi nnenne anyị. Nke ya sitere n’aka nnenne ukwu ya, ma nke m bụ akwụkwọ m tinyekọtara ọnụ mgbe m ketere igbe ntụziaka-isi-nri Greenwood nke nnenne m oge ọ nwụrụ.

Mụ na Ashley họọrọ otu ntụziaka-isi-nri site na akwụkwọ isi nri anyị, ma anyị bịakọtara ọnụ otu abalị oge ọrụ gasịrị ị nwa ha. Ọ họọrọ ntụziaka nri nke dessert, ya mere anyị emee ya na mbụ ma tinye ya n’ime oven. A họọrọ m chip dip—nke a na-erikarị na mmemme niile ezinaụlọ Greenwood. Nwa nwanyị Ashley nyeere anyị aka detụ nri ahụ ọnụ. Emesịa, n’ihi Ashley achọghị ka ụmụ ya rie nri-dessert niile ahụ, ọ wegara ụfọdụ nye ụmụnne nwanyị ndi ọ n’eje-ozi nlekọta nye.

Ihe kachasị masị m banyere abalị mmemme ntụziaka-isi-nri anyị bụ, na dịka anyị n’esi ma na-ebeki nri, anyị kwuru okwu gbasara isiokwu ije-ozi nlekọta mgbe niile—ndọlị ya nile na nke m. Mana anyị kwukwara gbasara ndi nnenne na ndi nne anyị, nke metụtara anyị abụọ.

Jenifer Greenwood, Utah, USA

Ụzọ Pụrụ-iche iji Nyee aka

Akụkọ agbụrụ nke ezinaụlọ nwere ike mepee ụzọ maka ohere ije-ozi nlekọta mgbe ọ dịịrị ka enweghị ihe ọzọ ga-eme. N’ebe a bụ nchepụta ole ma ole i nwere ike ịnwale.

  • Nyere ha aka idekọta ma tinye rekọd ihe ekwuru ekwu nke akụkọ agbụrụ nke ezinaụlọ, kacha nke ndi nke ha na foto mara.

  • Rụpụta fan chart ma ọbụ akwụkwọ akụkọ agbụrụ nke ezinaụlọ ndi ọzọ enwere ike ibipụta nke i nwere ike inye dịka ihe onyinye.

  • Kuzie ụzọ ndi ha g’esi emete akụkọ nke ha site n’idebe jonaalụ n’ụzọ masịrị ha. Jonaalụ ọdịo? Jonaalụ foto? Lọọg vidiyo? E nwere ọtụtụ nhọrọ maka ndi usoro joonalụ nkiti anaghị amasị.

  • Gakọrịta tempụl ọnụ ime emume nsọ niile maka ndi nnannanna. Ma ọbụ nye aka ime emume nsọ maka aha ezinaụlọ ha m’ọbụrụ na ha nwere karịa ka ha nwere ike ime.

  • Bịakọta nụ ọnụ ikekọrịtara omenala ezinaụlọ.

  • Gakọrịta klas akụkọ agbụrụ nke ezinaụlọ ọnụ.

Bipụta