2020
Ije-ozi Nlekọta site n’Ije-ozi Tempụl
Mach 2020


Ụkpụrụ niile nke ije-ozi Nlekọta, Mach 2020

Ije-ozi Nlekọta site n’Ije-ozi Tempụl

Mgbe anyị nyeere ndi ọzọ aka irite ngọzi niile nke tempụl, anyị n’eje ozi nlekọta.

Foto, oyiyi
ministering

Background from Getty Images; photograph of Tegucigalpa Honduras Temple

Ịga tempụl toruru mgbalị ahụ. Onyeisi Russell M. Nelson kuziri na “tempụl dị oke mkpa maka nzọpụta na mbuli elu nke anyị nakwa nke ndi ezinaụlọ anyị. …

“… Onye ọbụla n’ime anyị kwesịrị inwete mgbam ume na nkuzi nke na-aga n’ihu ugbua nke dị ire nanị n’ime ụlọ nke Onye-nwe-anyị.”1

Ị na-aga tempụl pụtara ịhazi oge anyị, ọrụ anyị, na akụrụngwa anyị nke ọma, nakwa ịdị njikere ime mmụọ. Anyị n’eje ozi nlekọta mgbe anyị matara ihe mgbochi ndi na-adọla ụmụnne anyị ndi nwoke na ndi nwanyị azụ site na tempụl ma nyere ha aka chọta ngwọta.

Tempụl Ahụ Bụ otu Ngọzi Onye-ọbụla Nwere ike Irite

Otu onye lọghachịrị mgbasa ozi ọma na nso nso, Meg, naara agabanye n’ọnụ ụzọ Kona Hawaii Tempụl mgbe ọ hụtara otu onyeiyom nta nọdụrụ ọdụ nanị ya n’iro. O metụrụ Meg ikwusịrị onyeiyom nta ahụ okwu, kama o doghị ya anya ihe ọ ga-ekwu. Ya mere ọ jụrụ gbasara ihe esere ese na nkwonkwo ụkwụ onyeiyom nta ahụ. Nke ahụ malitere mkparịta ụka nke kwere ka onyeiyom nta ahụ, Lani, ikwupụta akụkọ ya.

Lani gwara Meg gbasara ndọlị ya ịbịaghachị n’okwukwe n’ime Nzukọ nsọ, ezigbo ndi otu ndi naara enyere ya aka, na olile anya ya na otu ụbọchi arachịkọta ya na nwa ya nwanyị.

Meg gwara Lani ịbịa nọnyere ya n’ime ọnụ ụlọ nchere oge nke tempụl. Ha agaghị enwe ike ịbanye n’ime tempụl ugbua, kama ha ga-enwe ike gafee ebe mbido. Lani kweere, ma ha gakọtara ọnụ site n’ụzọ nke isi. Otu onye ọrụ tempụl gosịrị ha oche dị n’okpụrụ Onye nzọpụta esere ese.

Dịka ha nọdụkọtara ọdụ, Lani kwuru n’olu ntaka, “N’ezie achọbụụrụ m ịbanye n’ime tempụl taa, kama ụjọ ekweghị m.” N’ihi na Meg sooro Mụọ ahụ, o nyere aka zaa ekpere umeala nke Lani.

Echiche eji Enyere Ndi n’enweghị Rekọmend aka

Ọbụna ndi ahụ n’enweghị tempụl rekọmend ugbua nwere ike inwete ngọzi nke tempụl.

  • Kwupụta mmetụta gị gbasara otu Onye-nwe-anyị si gọziwo gị site n’ọrụ nke tempụl.

  • Kpọkuo otu onye ịbịa mmepe ụlọ tempụl ma ọbụ nke ogige ndi ọbịa. Chọta mmepe ụlọ tempụl na-abịa n’ihu na temples.ChurchofJesusChrist.org.

  • Lee foto niile ma mụta karịa gbasara tempụl na temples.ChurchofJesusChrist.org.

Mee Ịga Tempụl ka ọ dị Mfe maka Ndi ọzọ

Ọbụna maka ndi otu ji tempụl rekọmend, ịga tempụl nwere ike na-ara ahụ. Ụfọdụ ga-eme njem ogologo dị anya. Ndi ọzọ ga-enwe obere ụmụaka ma ọbụ ndi otu ezinaụlọ mere agadị ndi nwere mkpa nlekọta. Anyị nwere ike ịrụkọta ọrụ mee ije-ozi tempụl adị ire maka onye niile.

Leola Chandler ka ike gwuru site n’ilekọta di ya n’adịghị ike na ụmụ ha anọ. Ya mere o kpebiri iwepụta oge n’ụbọchị Tuesday ọbụla ịga tempụl nke nọ nso. Ọ bịara bụrụ ụzọ nke udo na ike n’ime ndụ ya.

Otu ụbọchi ọ nụrụ na ndi okenye ụmụnne nwanyị dị n’ime ngalaba ukwu ya chọsịrị ike ịga tempụl, kama ha enweghị ego ụgbọ. Leola kwere ịkwọ ha n’ụgbọ ala ya. N’ime afọ 40 sotere, ọ rara ahụ ya agaa tempụl nanị ya.2

Leola nwetere ngọzi, ma ọ gọziri ndi ọzọ mgbe o kwetere ya na ha ịga tempụl.

Echiche ndi eji Enyere Ndi ọzọ Aka Ịga Tempụl

Kedụ otu ị g’esi enyere ndi ọzọ aka garuo tempụl ugboro ugboro? Ị nwere ike ịhụta na ụdị echiche ndi ahụ nyekwaara gị aka.

  • Gakọta ọnụ. Kwere iwete ma ọbụ ịhazi maka ụgbọ ala n’ihi otu onye. O nwere ike ịgba otu onye ọzọ ume ị gakwa tempụl.

  • Rịọ ndi otu nke ezinaụlọ gị ma ọbụ ngalaba ukwu ịnyere gị aka mee emume nsọ maka ndi nnanna gị, kacha nke mgbe i nwere ọtụtụ aha ndi ezinaụlọ nọ maka emume nsọ.

  • Kwere ilekọta ụmụaka ka ndi nne na nna ha nwe ike gaa tempụl. Ma ọbụ hazie ilekọrịtara ụmụ onye na ibe ya.

Mgbe Tempụl Nọ Ebe Dị Anya

Chandradas “Roshan” na Sheron Antony nke Colombo, Sri Lanka, kpebiri ka arachie ha n’ime tempụl. Ndi enyi ha Ann na Anton Kumarasamy nwere nnukwu obi ańụrị maka ha. Mana ha maara na ịgaru na Manila Philippines Tempụl adịghị mfe ma ọ dị ọnụ.

Roshan na Sheron edokwaala ego ha ma kwụọ ụgwọ ụgbọ elu ọnwa ole ma ole n’ihu ịnwete ụgbọ elu ego ha ruru. Emesịa, ụbọchi ahụ eruo. Kosiladi, n’oge ngafe n’ime Malaysia, ha chọpụtara na ịga n’ihu gaa Philippines, ha kwesịrị inwe visa ma ọbụ ịgba ụgbọ elu ọzọ. Ọ dịghị ire inwete visa, ma ha enweghị ego ịzụ tiketi na ụgbọ elụ ọzọ. Mana ha ebulighị echiche nke ịlaghachị obodo ha n’emeghị nrachị.

N’amaghị ihe ọzọ ime, Roshan kpọrọ Anton. Anton na Ann chọsịrị ike ịnye aka. Ha sooro otu n’ime di na nwunye n’ime Sri Lanka ndi rachịworo n’ime tempụl, ma ha maara ụdị ngọzi ọ bụ. Mana ha ejiriwo ego ha chekwara ji nyere onye otu ezinaụlọ nọ na mkpa aka, ma ha enweghị ego zuru ezu iji nyere Roshan na Sheron aka zụọ tiketi maka ụgbọ elu ọhụrụ.

N’ime Sri Lanka ọ bụ omenala ka di ọhụrụ zụtara nwunye ọhụrụ ya ọla edo olu ka nwunye nwee ike nwee ego m’ọbụrụ ma di ya nwụọ. Ann kpebiri ire ọla olu ya iji nyee aka zụta tiketi ọhụrụ ahụ. Onyinye amara ya mere ya adiire ka Roshan na Sheron garuo tempụl na Manila.

“A ma m uru nrachi tempụl,” Ann ekwuo. “A maara m na Sheron na Roshan ga-abụ nnukwu ike nye ngalaba nta ahụ. Achọghị m ka ohere ahụ gabiga ha.”3

Echiche eji Enyere Ndi Ahụ N’enweghị ike Ịga Tempụl

Enwere ike ịkpọ gị oku ije-ozi nlekọta nye ndi n’enweghị ike ịga tempụl ugboro ugboro ma ọbụ ma ọlị n’ihi ịdị anya ma ọbụ ego. Kama i nwekwara ike ịchọta ụzọ ndi eji nyere ha aka nabata ngọzi niile nke tempụl.

  • Kuzie ma ọbụ soro mekọta ihe ọnụ n’ime klas nkwado tempụl ma ọbụ agụgụ ala ezinaụlọ.

  • Nye ha otu foto nke tempụl ikonye n’ebe obibi ha.

  • Ọbụrụ na ị gawo tempụl, kwupụta mmetụta gị gbasara nhumihe gị na ọgbụgba ama gị nke emume nsọ niile nke tempụl.

  • Nyere ha aka mụta karịa banyere ọgbụgba ndụ ndi ha meworo na otu ha g’esi edebe ha. Tulee iji “Ịghọta Ọgbụgba Ndụ Anyị na Chineke: Nchịkọta nke Nkwa Anyị Kachasịrị Mkpa,” n’ime Julai 2012 Liahona.

Hụba-ama

  1. Russell M. Nelson, “Ịbụ Ọmụmatụ Ndi nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a,” Liahona, Nov. 2018, 114.

  2. Lee LaRene Gaunt, “Ịchọta Ọńụ n’ime Ije-ozi nke Tempụl,” Ensign, Oct. 1994, 8.

  3. Ann na Anton nweteghachịrị ọla olu ha mgbe Church’s General Temple Patron Assistance Fund nyeghachịrị ha ego ha, nke na-enye ndi otu enyemaka ego otu ugboro ndi n’enweghị ego iji gbaa ụgbọ gaa tempụl.

Bipụta