2020
Ije-ozi Nlekọta site n’Ọgbakọ Zuru-ọha
Eprel 2020


“Ije-ozi Nlekọta site n’Ọgbakọ Zuru-ọha,” Lịahona, Eprel 2020

Foto, oyiyi
Ije-ozi nlekọta

Ụkpụrụ niile nke Ije-ozi Nlekọta, Eprel 2020

Ije-ozi Nlekọta site n’Ọgbakọ Zuru-ọha

N’okwu niile nke n’akwalite obi, omenala ezinaụlọ niile, na nkuzi sitere n’aka ndị odibo nke Onye-nwe-anyị, ọgbakọ zuru-ọha na-enye anyị ọtụtụ ụzọ eji eje-ozi nlekọta—tupu, mgbe ahụ, na njedebe izuụka ọgbakọ zuru-ọha!

Dịka ndi nkuzi nkwado-mishọn, Susie na Tom Mullen mgbe niile na-agwa ndi otu nke klas ha ịkpọku otu onye isoro bịa lee ọgbakọ zuru-ọha.

“Ịkpọku otu onye ime ihe bụ otu akụkụ nke ọrụ mgbasa-ozi-ọma, ma ọ metụtakwara ije-ozi nlekọta,” ka o kwuru. “Ụmụakwụkwọ anyị mgbe niile n’ekwupụta banyere otu dị mma o siri pụtara ha nakwa onye ha kpọkuru.”

Ndịa a bụ ụzọ ole ma ole ndi ụmụakwụkwọ ha kwụpụtara ha si kpọkuo:

  • “Anyị n’eje ozi nlekọta nye otu enyi onye nwere ụfọdụ mkpagbu ndi n’akpagbu ya. Anyị akpọkuo ya ige ntị na ọgbakọ zuru-ọha maka azịza niile. Mgbe anyị gara n’ebe obibi ya mgbe ọgbakọ zuru-ọha gasịrị, ọ gwara anyị na ya nụrụ ọtụtụ echiche nke ga-enye aka.”

  • “Anyị mere mmemme oriri nke ọgbakọ zuru-ọha ma onye niile wetere nrị ụtọ ikekọrịta. Ọ mara oké mma nke mere anyị ekpebie ime ya ọzọ.”

  • “A kpọkuru m otu enyi isoro m lee ọgbakọ zuru-ọha. Dịka anyị kwuru banyere ya, anyị kpebiri inyara ụgbọ ala gaa n’ụlọ nzukọ ile ma anyị nwere ike ile ya n’ebe ahụ. Anyị lere, ma ọ bụụrụ nhumihe kacha ibe ya elu ịnọ ebe ahụ!”

Dịka ezinaụlọ Mullens na ụmụakwụkwọ ha mụtaworo, enwere ọtụtụ ụzọ esi eje-ozi nlekọta site n’ọgbakọ zuru-ọha. Ọ bụ ụzọ dị ịtụnanya esi ekekọrịta okwu nkwalite, omenala ezinaụlọ niile, mkparịta ụka pụtara ihé, na nkuzi niile nke ụmụodibo nke Onye-nwe-anyị!

Kpọkuo Ndi Ọzọ N’ebe Obibi Gị

“Onye nzọpụta nyere ndi nsiso Ya iwu ị ‘hụkọrịta otu onye n’ibe ya n’anya; dịka M si hụ gị n’anya’ (Jọn 13:34). Ya mere anyị atụlee otu O si hụ anyị n’anya. … Ọ bụrụ na anyị emee Ya onye ọmụmatụ anyị, anyị kwesịrị mgbe niile n’agbalị ịgụnye mmadụ niile.” —Onyeisi Dallin H. Oaks1

Ọtụtụ afọ gara Mike onye-nkuzi ebe obibi anyị pụrụiche matara na mụ na ụmụ m atọ nwere nanị otu laptop ntakịrị iji lee ọgbakọ zuru-ọha na ya. Ọ kpọkuru anyị n’egbughị oge ịbịa n’ụlọ ya bịa soro ya na nwunye ya, Jackie lee, n’ekwu si ike na ọ ga-amasị ha anyị na ha ịnọkọ. Ụmụ m nwere nnukwu ọńụ ile ọgbakọ zuru-ọha na ezigbo TV; e nwere m nnukwu obi ekele inwete nkwado ahụ; ma oge anyị nọkọrọ masịrị anyị niile.

Mgbe nke ahụ gasịrị, ilekọrịta ọgbakọ zuru-ọha bụụrụ omenala. Ọbụna mgbe anyị nwetere TV nke onwe anyị, n’obi ụtọ anyị gakwara n’ụlọ Mike na Jackie jiri pilo anyị, akwụkwọ, na ihe ntagharị ọnụ maka ọgbakọ zuru-ọha. Inụkọrịta okwu niile nke ndi amụma ọnụ mere ya apụọ iche karịa. Anyị dịrịzirị dịka otu ezinaụlọ. Mike na Jackie bụrụzịrị ụfọdụ ndi enyi kacha ibe ya na ndi nne na nna nke ukwu nke abụọ nye ụmụ m. Ịhụnanya na ịbụenyi ha abụrụworịị ngọzi ihe ịtụnanya nye ezinaụlọ m. Ejupụtara m n’obi ekele maka njikere ha imepe ebe obibi ha na obi ha n’ebe anyị nọ.

Suzanne Erd, California, USA

Ụkpụrụ niile aga Atụle

“Matara”

Onye nzọpụta n’ịhụnanya jiri obi umeala ị hụta mkpa niile nke ndi ọzọ ma mgbe ahụ mee ihe iji mejupụta mkpa ndi ahụ niile (lee Matiu 9.35-36; Jọn 6:5; 19:26-27). Anyị nwere ike ị mee kwa otu a.

“Kpọkuru n’egbughị oge”

Mgbe anyị matara mkpa niile nke ndi anyị n’eje-ozi nlekọta nye, ihe ọzọ bụ ime.“Ịnụta okwu niile nke ndi amụma”

Anyị kwesịrị “izukọta ọnụ mgbe na mgbe” (Moronaị 6:5) ịmụkọrịta, itokọrịta, na ikwu banyere ihe ime mụọ niile nke kacha mkpa nye mụọ anyị.

“Bịa, gere olu nke otu onye amụma, ma nụrụ okwu nke Chineke”2 nwere ike bụrụ otu n’ime ọkpụkọ oku kacha ibe ya anyị nwere ike inye ndi ahụ anyị n’ejere ozi nlekọta nye.

“Ịhụnanya na ịbụenyị”

Inye aka n’eziokwu ma metụta ndi ọzọ, anyị ga ewuliterịrị adịnamma nwere ọmịiko na ịhụnanya n’enweghị atụ” (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:41).

Kesaa na Intanet ahụ

Chaneelu nile nke soshịal media bụ ngwaọrụ mba ụwa niile nke nwere ike imetụta ọtụtụ ọnụọgụgụ nke mmadụ na ezinaụlọ n’onwe ha na n’ụzọ ziri ezi. Ma e kwere m na oge ahụ abịawo maka anyị dịka ndi n’eso ụzọ nke Kraịst iji ngwaọrụ ndia sinachi n’ụzọ ziri ezi ma dị ire iji gbaa ama nke Chineke nke Nna Ebighị ebi, atụmatụ nke ańụrị Ya maka ụmụ Ya, na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, dịka Onye nzọpụta nke ụwa.” —Okenye David A. Bednar3

Intanet n’ekwe ka anyị kwusaa oziọma ahụ n’etiti ụwa. A hụrụ m nke a n’anya! A na m ekwupụta egwuregwu ole ma ole maka ọgbakọ zuru-ọha, ma nke kacha bụ, a na m agbalị inyere ndi ọzọ aka mepụta ihe mkparịta ụka site n’ozi niile nke ọgbakọ zuru-ọha. Inwete ajụjụ site n’aka ndi ọzọ nwere ike mgbe ụfọdụ nyere anyị aka hụta ihe niile n’ụzọ ọhụrụ ma o nwere ike bụrụ ebe ntụkwasị obi nye ajụjụ niile mkparịta ụka ukwuu nke onwe anyị.

A hụtawo m na dịka ị n’eji ajụjụ niile atụlerịta okwu niile nke ọgbakọ zuru-ọha gị na ezinaụlọ ije-ozi nlekọta gị niile, ọ n’enyere gị aka ịhụta ike ha nakwa mkpa ha niile. Otu n’ime ajụjụ masịrị m ịjụ bụ, Kedụ ihe i chere bụụrụ isiokwu sitere na nzukọ ọgbakọ zuru-ọha emere nso nso a?

Aziza ya dịka mgbe niile n’eme ka gị hụta ihe ndi na-eme n’ime ndụ ha na ihe ndi dị ha mkpa. Ọ na-eme gị abụrụzie nwanne nwoke ma ọbụ nwanne nwanyị n’eje-ozi nlekọta karịa n’ihi na ị na-abịa hụtazie ha nke ọma.

Camille Gillham, Colorado, USA

Ụkpụrụ niile aga Atụle

“Kwusa ozi-ọma ahụ”

Anyị agbawo ndụ I “guzo dịka ndị aka ebe nke Chineke n’oge niile na n’ihe niile, na n’ebe niile” (Mosaịa 18:9).

“Mepụta ihe mkparịta ụka”

Ozi niile nke ọgbakọ zuru-ọha nwere ike kwalite mkparịta ụka ndị dị ịtụnanya, dị mkpa, na nke mụọ dụrụ. Ma ụdị mkparịta ụka ndịa nwere ike nye mmekọrịta gị niile mgbam ume, nyere gị aka wulite ọgbụgba ama gị, ma wetere gị ọńụ! (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:22).

“Jiri ajụjụ”

“Ajụjụ dị mma ga enyere gị aka ghọta ọchịchọ, nchekasị, ma ọbụ ajụjụ niile ndị ọzọ nwere. Ha nwere ike metazie nkuzi gị, kpọbata Mụọ ahụ, ma nyere ndị mmadụ aka mụọ ihe.”4

Hụba-ama

  1. Dallin H. Oaks, “Ịhụnanya na Iwu ahụ” (video), mormonandgay.ChurchofJesusChrist.org.

  2. “Bịa, Gee ntị nOlu nke Onye amụma,” Hymns, no. 21.

  3. David A. Bednar, “Flood the Earth through Social Media,” Liahona, Aug. 2015, 50.

  4. Preach My Gospel: A Guide to Missionary Service (2004), 185.

Bipụta