2020
Ije ozi nlekọta site na Ndabere Onwe
Ọgọst 2020


“Ije ozi nlekọta site na Ndabere Onwe,” Liahona, Ọgọst 2020

Foto, oyiyi
ije ozi nlekọta

Ụkpụrụ niile nke Ije ozi Nlekọta, Ọgọst 2020

Ije ozi nlekọta site na Ndabere Onwe

Ịnyere ndị ọzọ aka nweta ndabere onwe pụtara ịrọpụta ihe na ije ozi nlekọta n’ụzọ nke Onyenwe anyị.

Ọtụtụ n’ime ndị otú ezi na ụlọ, ndị enyi, na ndị agbata obi nwere mmasị inwe ndabere onwe. Iji atụmatụ ndabere onwe nke Nzukọ nsọ, ndị otú Nzukọ nsọ na-achọpụta ohere iji jee ozi, lekọta, ma jee ozi nlekọta dịka ha na-agọzi ndị ọzọ site na ụkpụrụ ndị n’ewete “nnukwu olile anya, udo, na ọganihu.”1

“A Nọọrọ M N’Ebe obibi”

Site n’aka Chrissy Kepler, Arizona, USA

A nọọrọ m na ndọlị ịkpata ego mgbe m gbachara alụkwaghị m, na-achọ ịlaghachị n’ọrụ ka m nọchara dịka nne nwa nọ n’ụlọ afọ asatọ. A nọkwaara m na adọlị n’ime mmụọ, na-achọ ezi okwu na okwukwe, agbanyeghị na-azọnyebeghị m ụkwụ n’ime ụlọ ụka kemgbe m gbara afọ iri na ụma.

Otu Sọnde a nọọrọ m na-asa akwa n’ebe obibi nke nwanne m nwanyị kacha okenye, Priscilla, onye otú Nzukọ nsọ dị nkọ. Ka m nọ n’ebe ahụ, Priscilla kpọkuru m isoro ezi na ụlọ ya gaa nzukọ—oku mbụ m n’ime afọ karịrị 15.

Ọ rara m ahụ na mbụ, kama nanị na abalị gara aga, arịọwo m Chineke igosi m otu m ga-esi abịakute Ya nso. Mgbe m tụgharịchara ya n’ime obi m, e kpebiri m, “Ma ọkaghị mma ị ga nụta ma hụta n’onwe gị dịka dimkpa?”

Mgbe anyị nọọrọ na nzukọ oriri nsọ, a hụtara m mpempe akwụkwọ dị n’ime ihe mgbasa ozi Sọnde na-amaọkwa maka otu ọmụmụ ihe ndabere onwe gbasara nchịkọta ego nke onwe. A dịbeghị m na njikere ịlaghachị nzukọ, mana obi m nọọrọ na ihe ọmụmụ ahụ a ga-amụ ruo izu ụka 12. Na mgbam ume sitere n’aka nwanne m nwanyị na ọgọ m nwoke, edebanyere m aha m, na-atụ anya ịmụta nanị otu esi eme atụmatụ mkpata na mmefu na otu esi akwụchapụ ụgwọ. Klas niile ahụ, otu o sila dị, gbanwere m ime mmụọ.

Ọtụwo m n’anya site n’ozi ime mmụọ niile nke klas izu ụka abụọ bu ụzọ, mana n’oge klas nke atọ, oke mmetụta nke mmesị obi ike mere ka m kweta na erutewo m ebe obibi, ma n’anụta eziokwu ọhụrụ bụkwa nke m maara amara. A hapụrụ m klas ahụ ma nyara ụgbọala gaa ozugbo ịhụ Priscilla. N’anya mmiri, ajụrụ m ya, “Olee otu m ga-esi enwete karịa ụdị mmetụta a n’ime ndụ m?” O mere ka ndị mgbasa ozi ọma bido ikuziri m ihe.

Ndị otú klas ndabere onwe m bịara na nkuzi ndị mgbasa ozi ọma m ma kwadoo m. Ha mere ezi mmetụta n’ime mmụọ m ma nyere m aka nwete ọgbụgba ama nke ozi ọma na ndị amụma ụbọchị taa.

N’oge o were m imezu mmụta ahụ, e mere m ọtụtụ mgbanwe nke ndụ na nke ime mmụọ. E bidoro m ọrụ ọhụrụ n’ụlọ ọrụ dị mma, ma akwụghachịrị m ọtụtụ ụgwọ mgbazinye.

Mana ngọzi ndị ka mie emie, ka dị ụtọ sitere na mmụta ahụ bịa gụnyekọtara imepụta ọmarịcha enyi na enyi, iwulite mmekọrịta dị mma mụ na bishọp na-enye mgbam ume, nwete ọgbụgba ama nke ịkwụ otu ụzọ na ụzọ iri, ịnata tempụl rekọmend m, nata onyinye dị nsọ m, na ịhụta ụmụ m abụọ tọchara ndị ọzọ mee baptizm.

Ụzọ nke ndabere onwe m ka n’emepe emepe, kama maka njem m nke fọdụrụ, a ga m eji nkuzi niile m mụtaworo na enyi ndị m meworo kpọrọ ihe.

“Enweterem Mmetụta Ịhụnanya Mgbe Ọbụla M Hapụrụ Klasị Ọbụla”

Mgbe ọ gara nleta na Ogige Tempụl dị n’Obodo Salt Lake, Utah, ya na nwa ya nwoke gbara afọ 10, Vincent, na Dizemba 2016, Katie Funk hụtara onwe ya dịka ndị ahụ kwere na mmadụ “ekwesighị, mọbụ nwe ike ị ma ịhe ọbụla gbasara Chineke.” Ọ hapụrụ Nzukọ nsọ n’afọ 16, bụrụ nne nanị ya nọ n’afọ 17, bido ise ihe n’ahụ ya, ma bido ịńụ kọfị. Mana n’oge nleta na Ogige Tempụl ahụ, Vincent nwetere mmetụta Mmụọ Nsọ ma rịọ nne ya ma o nwere ike ibido ịnata nkuzi ndị mgbasa ozi ọma.

N’agbanyeghị ọrụ abụọ ya, ịrụ ọrụ awa ruru 80 kwa izu ụka, Katie mụrụ ozi ọma ya na Vincent, na-achọta azịza nye ajụjụ ya n’etiti nleta ndị mgbasa ozi ọma. N’oge ọkọchị nke 2017, o bidoro ịga nzukọ niile nke Nzukọ nsọ, ebe ọ mụtara ihe banyere ọmụmụ ndabere onwe nke Nzukọ nsọ.

Ọ sịrị, “A matara m na ha bụrịị ihe ndị nwere ike inyere m aka”. “Enwere ike ọdịghị mkpa na m ga-arụ ọrụ abụọ ma ọbụ dabere n’aka nne na nna m n’oge ndụ m niile.”

Katie kpọrọ mmụta ya “mgbam ume pụrụ iche nke ndụ na nke ime mmụọ,” n’abụghị n’ihi ihe ọ mụtara kamakwa n’ihi otu ndị otú ndabere onwe ya si nabata ma lekọta ya.

Lee anya

  1. “Ozi sitere n’aka Otu Ndịisi Mbụ,” n’ime Nchịkọta ego nke Onwe maka Ndabere onwe (2016), i.

Bipụta