2020
Ije ozi Nlekọta Site na Bịa, Soro M
Septemba 2020


“Ije ozi Nlekọta Site na Bịa, Soro M,” Liahona, Septemba 2020

Foto, oyiyi
ije ozi nlekọta

Ụkpụrụ niile nke Ije ozi Nlekọta, Septemba 2020

Ije ozi Nlekọta Site na Bịa, Soro M

Kedụ otu Bịa, Soro M nwere ike si nyere gị aka mepụta ihe dị iche na ndụ ndị ọzọ?

Ma ị nọ n’etiti ndị ezi na ụlọ gị, n’ime klas Sọnde Skul dịka onye nkuzi ma ọbụ nwa akwụkwọ, ma ọbụ na ụlọ akwụkwọ, ụlọ ọrụ, ma ọbụ n’ebe ndị ọzọ, ọmụmụ akwụkwọ nsọ site na Bịa, Soro M na-enye ọtụtụ ohere iji jeere ndị ọzọ ozi. Nkuzi, emesịa ihe niile, “karịrị iduzi mkparịta ụka na Sọnde; ọ gụnyere ije ozi nlekọta n’ịhụnaanya na iji oziọma gọzie ndị ọzọ.”1

Ijikọ gị na Ụmụakwụkwọ

Mgbe akpọrọ Ofelia Trejo de Cárdenas ikuziri ndị ntorobịa ngalaba ukwu ya dị n’ime Obodo Mexico, o metụrụ ya na ịnwe mmekọrịta dị n’obi ya na ụmụakwụkwọ Sọnde Skul ya ọbụla ga-emelite ike ya ikuzi ma gbaa ha ume.

“Ọbụrụ na m enweghị ezi mmekọrịta n’etitii ụmụakwụkwọ m ma ọbụrụ na ịhụnaanya m emetụghị ha, ha agaghị enwe ike ịkwere m mgbe m na-akụzi klas ma ọbụ agba ọgbụgba ama m,” ka o na-ekwu. “Ha nwere ike chee na m bụ nnọọ nanị onye nkuzi Sọnde Skul.”

Mana olee otu Nwanne-nwanyị Cárdenas ga-esi emepụta ụdị mmekọrịta ahụ ma ọbụrụ na ọ kuzie nanị otu ugboro izu ụka abụọ ọbụla? O nwetere azịza site na teknụzụ. N’iji ngwa ekwe ntị WhatsApp, ya na ụmụakwụkwọ ya oge n’adịghị anya naara ezute onwe ha kwa ụbọchị site na ozi niile edere ede na nke ekwuru ekwu. Ugbua, ụbọchị ọbụla tupu nkuzi Sọnde Skul nke na-abịa, otu onye klas wepụtara onwe ya n’ezigara ndị ọzọ otu amaokwu nke akwụkwọ nsọ si na nkuzi nke ahụ na-abịa ma denye echiche nke onwe ya. Mgbe ha gụchara amaokwu ahụ na echiche ahụ, ndị otú klas na-azaghachi jiri echiche nke onwe ha.

“Mgbe ha gụrụ akwụkwọ nsọ, ha na-ezite ihu ọchị ka m wee mara na ha agụwo ma ọbụ mụwo akwụkwọ nsọ nakwa ha echewo banyere ya,” ka Nwanne- nwanyị Cárdenas na-ekwu. Mgbe oge nkuzi nke Sọnde na-abịa ruru, ụmụakwụkwọ akwadowo isoro mụọ ihe.

Nzute nke ụbọchị niile nke-a, na nso nso gọziri otu ntorobịa onye nne na nna ya adịkwaghị ike n’okwukwe n’ime Nzukọ nsọ.

“Ọ na-amasị m mgbe m na-ahụ ya ịbịa nzukọ nsọ n’ihi na m maara na irute otu ahụ, ọ gabịgara ọtụtụ aka mgba,” ka Nwanne-nwanyị Cárdenas na-ekwu. “O doro m anya na akwụkwọ nsọ na echiche niile ụmụ klas ya zipuworo na akwụkwọ nsọ na echiche niile ndị o zipuworo mgbe ọ bụụrụ ohere ya gbara ya ume nke ukwuu.”

Nwanne-nwanyị Cárdenas na-ekwu na ije ozi nlekọta site na akwụkwọ nsọ anaghị akwụsị na nkuzi Sọnde ya na nzute ọmụmụ akwụkwọ nsọ nke klas ya kwa ụbọchị.

“Njikere m gụnyere ikpe ekpere maka ụmụakwụkwọ m,” ka o na-ekwu. A na m eche maka ha na-abụghị nanị na Sọnde kama ụbọchị niile nke izu ụka kwa. Onye ọbụla n’ime ha nwere mkpa nke onwe dị iche. Onye ọbụla bụ nwa nke Chineke A na m eche banyere ha mgbe m na-ahazi nkuzi m.”

Ma mgbe ọ na-akuzi, ọ na-ege ntị—ma nye ụmụakwụkwọ ya ma nye Mmụọ Nsọ.

“Onye nkuzi bụ Mmụọ ahụ,” nke ọ na-anụkarị n’olu nke ụmụakwụkwọ ya. “E kwesịrị m ige ntị n’ihi na ihe ndị ha na-ekwu bụ mkpụghe nke Mmụọ ahụ n’enye ha.”

Klas Anyị Dị “Ka Nnọkọ mgbede Ezi na ụlọ”

Carla Gutiérrez Ortega Córdoba na-enwete ngọzi ị bụ onye otú klas Sọnde Skul Nwanne-nwanyị Cárdenas n’ihi ọzụzụ na ije ozi dị n’ime ogige-klas ahụ. Carla na-asị na ogige-klas ahụ dị otua n’ihi ọtụtụ ihe, nke gụnyere:

  • Njikere: Ịkesa akwụkwọ nsọ na echiche n’enyere ụmụakwụkwọ aka ịkwadoo maka klas nke na-abịa. “Akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị n’eju anyị afọ ma mụbaa ọmụma ihe anyị,” ka o na-ekwu.

  • Isoro Mee: “Anyị niile n’ekwu okwu. Nke a na-eme m ịmara ụmụ klas m nke ọma, dịka ndị enyi na dịka ụmụnne-nwoke na ụmụnne-nwanyị.”

  • Ịhụnaanya: “Nwanne-nwanyị Cárdenas n’ejide gị n’aka. Klas anyị na-adị ka nnọkọ mgbede ezi na ụlọ, ebe enwere ọtụtụ ụmụnne-nwoke na ụmụnne-nwanyị. Ọ pụrụiche nke ukwuu.”

  • Mmụọ Nsọ ahụ: “Anyị nwere mmụọ dị mma, na-adakọrịta ụda n’ime klas anyị n’ihi anyị na Mmụọ Nsọ nọkọtara.”

  • Ọgbụgba ama: “Bịa, Soro M enyerewo m aka dịrị njikere ikwupụta ọgbụgba ama m. E nwere m ọmụma ihe miri emi nke Akwụkwọ nke Mọmọn na Baịbụlụ. Nke na-ekwe m ikesa ihe m na-amụ n’etiti ụmụ klas m ebe ụlọ akwụkwọ na ndị mmadụ n’ụlọ ọrụ.

Ije ozi nlekọta nye Mkpa Ime Mmụọ

Mgbe Greg na Nicky Christensen, si na Kentucky, USA, gụrụ ihe banyere ọgbụgba ndụ Ebraham n’ime akwụkwọ nsọ ha na ụmụ ha ndị nwoke atọ, ọ rara ha ahụ ịkọwa ya nye ha. Ha kpebiri dịka ezi na ụlọ na onye ọbụla ga-amụ ọgbụgba ndụ Ebraham n’onwe ha ma emesịa ha ekekọrịa ihe ha chọpụtara.

“Anyị nwetere nkọwa okwu ndị mara mma,” ka Greg na-ekwu. Nwa anyị gbara afọ asatọ mụtara na aha Ebraham bụbụụrụ Ebram. Aha ya gbanwere bụrụ Ebraham n’ihi na ọ kwere Onyenwe anyị nkwa ịtụgharị site na njehie ma bie ndụ ezi omume. Ọ tụrụ m n’anya na o nwere ike ikwuli nke ahụ.”

Ha niile mụtara ihe ọhụrụ ma nwee mkparịta ụka dị mma banyere ihe ọgbụgba ndụ Ebraham bụ na ihe ọ pụtaara Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a taa.

“Anyị naara aga ime ụlọ onye ọbụla n’otu n’otu na-agụ akwụkwọ nsọ maka ọmụmụ akwụkwọ nsọ ezi na ụlọ anyị,” ka Nicky na-ekwu. “Bịa, Soro M na-arụ ọrụ karịa site n’ikuzi site na Mmụọ. Ugbua mgbe anyị na-amụkọta ihe ọnụ, mmetụta Mmụọ na akwalite m ibugharị mkparịta ụka anyị n’ụzọ dị iche iche dịka otu mkpa ezi na ụlọ anyị dị.”

Ijiri Bịa, Soro M abụghị nanị na o nyerewo ezi na ụlọ ha aka nọgidesie ike ma nwee mmasị na ọmụmụ oziọma nke ezi na ụlọ, kama o nyerewokwa Greg na Nicky aka ije ozi nye mkpa ime mmụọ nke ụmụ ha.

Bịa, Soro M na-enyere m aka kuziere ụmụ m,” ka Nicky na-ekwu. “Ọ nakwa enyere m aka metazie aka mgba dị iche iche mụ na ụmụ m na-enwe mgbe ụfọdụ. A na m anọgide karịa na Mmụọ, a na m ege ntị nke ọma, ma anatawo m mkpalite mmụọ n’ụzọ m nwere ike si nyere nwa nke ọbụla aka.”

Greg na-enwe obi ụtọ n’ogologo mkparịta ụka ozi ọma nke Bịa, Soro M na-enye aka mepụta n’ime ezi na ụlọ ha. “Ụmụ anyị ndị nwoke gbara iche iche n’ihe ndị ha maara na ọmụma ihe oziọma ha,” ka ọ na-ekwu. “Bịa, Soro M ewetewo ụzọ nye anyị ịnyere onye ọbụla n’ime ha aka mụọ site n’otu mkpa ha dị. Ịhụ ka ha na-abawanye n’ịhụnaanya maka ozi ọma na ile ha ịchọpụta ụzọ ha nwere ike si tinye ọmụma ihe ozi ọma ha na ndụ ha abụrụworịị ngọzi dị ịtụnanya.”

Hụba-ama

  1. Bịa, Soro M—nke Sọnde Skul: Akwụkwọ nke Mọmọn 2020 (2019), 19.

Bipụta