Otu Enyem aka na Kworum nke Ndị Okenye
Ikuzi nkuzi, Ịmụ ihe, na Itinye Ozi niile sitere n’Ọgbakọ Zuru ọha nọrụ


Bịanụ, Soro M

Ikuzi nkuzi, Ịmụ ihe, na Itinye Ozi niile sitere n’Ọgbakọ Zuru ọha nọrụ

Kworum nke ndị okenye na Ndị Otu Enyem aka na-arụ ọrụ dị mkpa nọrụ nke nzọpụta na mbuli elu. N’oge nzukọ Sọnde ha niile, ha na-akparịta ụka banyere otu esi etinye nkuzi niile nọ n’ozi niile nke ọgbakọ zuru ọha e mere na nso nso a na mbọ ha n’ọrụ nke a. Kworum ndị okenye na otu ndịisi Otu Enyem aka na-ahọrọ ozi ọgbakọ a ga-esi na ya amụ ihe n’oge nzukọ Sọnde ọbụla, gbadoro ụkwụ na mkpa ndị otu na ntuzi aka sitere na Mmụọ. Mgbe ọ dabara, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwekwara ike rọpụta otu ozi. N’izugbe, ndị ndu kwesịrị ịhọrọ ozi ndị sitere n’aka ndị otu nke Otu Ndịisi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na abụọ. Otu osila dị, ozi ọbụla sitere na ọgbakọ zuru ọha kachasị nso ka enwere ike ịkparịta ụka na ya.

Ndị nkuzi na-elekwasị anya na otu ha nwere ike iji nyere ndị otu aka itinye nkuzi niile dị n’ozi niile nke ọgbakọ zuru ọha n’ime ndụ ha. Ndị ndu na ndị nkuzi na-achọta ụzọ esi agba ndị otu ume ịgụ ozi ndị a họọrọ tupu nzukọ ndị ahụ.

Maka ozi ọzọ banyere nzukọ nke kworum ndị okenye na Otu Enyem Aka, lee General Handbook: Ije ozi n’ime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a, 8.2.1.2, 9.2.1.2, ChurchofJesusChrist.org.

Ikwado Ikuzi nkuzi

Ajụjụ ndị a sotere nwere ike nyere ndị nkuzi aka dị ka ha na-eme atụmatụ iji were ozi ọgbakọ zuru ọha kuzie ihe. Dị ka a chọrọ, ndị nkuzi na-anata ndụmọdụ site n’aka nke kworum ndị okenye ma ọ bụ ndịisi Otu Enyem aka dị ka ha na-atụgharị uche n’ajụjụ ndị a.

  • Gịnị mere ndịịsi kworum nke ndị okenye ma ọ bụ Otu Enyem aka ji họrọ ozi nke a ịkparịta ụka maka ya? Gịnị ka ha tụrụ anya na ndị otu ga-amata ma mee mgbe a kparịtachara ụka n’ozi nke a?

  • Gịnị ka onye na-ekwu okwu chọrọ ka ndị otu ghọta? Kedu ụkpụrụ ozi ọma nke ya nwoke ma ọbụ nwanyị na-akuzi? Olee ụzọ ụkpụrụ ndị a siri gbasa ndị kworum okenye m ma ọ bụ Otu Enyem aka m?

  • Kedụ akwụkwọ nsọ onye na-ekwu okwu jiri kwadoo ozi ya? E nwere akwụkwọ nsọ ndị ọzọ ndị otu nwere ike ịgụ nke ga emikwu nghọta ha? (I nwere ike ịchọta ụfọdụ ha n’ime ndepụta ngwụcha nke ozi ahụ ma ọ bụ niime Ntụzi aka nye Akwụkwọ nsọ [scriptures.ChurchofJesusChrist.org].)

  • Kedụ ajụjụ ndị m nwere ike ịjụ nke ga-enyere ndị otu aka tụgharịa uche ma tinye nkuzi niile dị n’ozi ahụ n’ọrụ. Kedụ ajụjụ ndị ga-enyere ha aka hụta mkpa nke nkuzi ndị a dị n’ime ndụ ha, n’ime ezi na ụlọ ha niile, na n’ime ọrụ nke Onyenwe anyị?

  • Kedụ ihe m nwere ike ime iji kpọbata Mmụọ ahụ n’ime nzukọ anyị? Kedụ ihe m nwere ike iji melite mkparịta ụka ahụ, tinyere akụkọ niile, ọdịka niile, egwu, ma ọ bụ ọrụ nka? Kedụ ihe onye na-ekwu okwu mere iji nyere ndị otu aka ghọta ozi ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị?

  • Onye na-ekwu okwu ọ kpọkuru onye ọbụla? Olee otu m nwere ike isi nyere ndịotu aka nwete mmetụta ọchịchọ nke ime ihe n’oku ndị ahụ?

Echiche niile Ihe omume

E nwere ọtụtụ ụzọ ndị nkuzi nwere ike iji nyere ndị otu aka mụta ihe site na ma tinye ozi niile nke ọgbakọ zuru ọha n’ọrụ. Ebe a bụ ọmụmatụ ole ma ole; ndị nkuzi nwere ike nwee echiche ndị ọzọ nke ga-aka arụ ọrụ n’ime kworum ndị okenye ha ma ọ bụ na Otu Enyem aka ha.

  • Tinye ezi okwu niile n’ọrụ na ndụ anyị Kpọkuo ndị otu ka ha nyochagharịa ozi ọgbakọ na-achọ ezi okwu ndị nwere ike inyere ha aka mejupụta ọrụ ahụ Chineke nyere ha dị ka ndị mmadụ ma ọ bụ dị ka onye kworum ndị okenye ma ọ bụ nke Otu Enyem aka. N’ịma atụ, gịnị ka anyị na-amụ nke nwere ike inyere anyị aka dị ka ndị ozi? dị ka ndị nne na nna? dị ka ndị otu ndị mgbasa ozi ọma? Kedụ otu ozi nke a na-esi emetụta echiche anyị, mmetụta anyị, na ihe ndị anyị na-eme?

  • Kparịta ụka n’otu n’igwé. Kee ndị otu n’otu obere obere, ma nye otu ọbụla nkeji dị iche iche nke ozi ọgbakọ ịgụ ma kparịta ịka na ya. Emesịa gwa otu ọbụla ka ọ kọọ otu eziokwu ha hụtara na otu o si metụta ha. Ma ọ bụ i nwere ike mepụta otu dị iche iche nke ndị mejupụtara ha bụ ndị otu ndị mụrụ akụkụ dị iche iche nke ozi ahụ ma kwe ka ha kọọrọ onwe ha ihe ha hụrụ.

  • Chọọ azịza niile nye ajụjụ niile. Kpọkuo ndị otu ịza ajụjụ ndị dị ka ndịa sotere banyere ozi ọgbakọ ahụ: Kedụ eziokwu ndị nke ozi ọma anyị chọtara n’ime ozi nke a? Olee otu anyị nwere ike iji tinye n’ọrụ eziokwu ndị a? Kedụ ịkpọ oku na ngọzi ndị e kwere na nkwa e nyere? Kedụ ihe ozi nke a na-akụziri anyị banyere ọrụ Chineke chọrọ ka anyị rụọ? Ma ọ bụ mepụta ajụjụ ole ma ole nke onwe gị na-agba ndị otu ume ichemi echiche ime gbasara ozi ahụ ma ọ bụ tinye eziokwu ndị ọ na-akụzi n’ọrụ. Nye ndị otu ohere ịhọrọ otu niime ajụjụ ndị a ma chọta aziza niile dị n’ime ozi ahụ.

  • Kesaa nkwupụta niile sitere na ozi ahụ. Kpọọ ndịotu oku ịkọwa nkwupụta niile sitere na ozi ọgbakọ nke kpalitere mmụọ ha iji mejupụta ọrụ ha nwere ịrụ n’ime ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu. Gbaa ha ume ịtụle ụzọ ha nwere ike si kesaa nkwupụta niile iji gọzie otu onye, tinyere ndị a hụrụ n’anya na ndị ha n’ejere ozi nlekọta nye.

  • Kekọrịta ihe mmụta. Iga niihu, kpọkuo ndịotu ole ma ole iwete ihe mmụta site n’ebe obibi nke ha nwere ike ji kuzie ihe banyere ozi ọgbakọ. N’oge nzukọ ahụ, gwa ndị otu ka ha kọwaa otu ihe ndị ahụ siri gbasa ozi ahụ na otu ozi ahụ siri metụta ndụ ha.

  • Kwadoo ihe ọmụmụ a ga-akuzi n‘ebe obibi. Gwa ndị otu ka ha rụọ ọrụ mmadụ abụọ abụọ iji mee atụmatụ ihe ọmụmụ nnọkọ mgbede ezi na ụlọ dabeere n’ozi ọgbakọ Ha nwere ike zaa ajụjụ ndị dị ka ndị a: Olee otu anyị nwere ike isi mee ozi ahụ abaa uru nye ndị ezi na ụlọ anyị? Olee ụzọ anyị nwere ike iji kesaa ozi a nye ndị anyị n’eje ozi nlekọta?

  • Kesaa nhụmihe niile. Gụkọta ọtụtụ ederede ọnụ site n’ozi ọgbakọ. Gwa ndị otu ka ha kesaa ọmụmatụ ndị sitere na akwụkwọ nsọ niile ma site na ndụ ha nke n’egosi ma ọbụ n’emesi ike ozizi akuziri n’ime ederede ndị a.

  • Chọta ahịrị okwu. Kpọkuo ndị otu maka ịchọgharị ozi ọgbakọ ahụ na-achọ nkebi okwu niile ndị baara ha uru. Gwa ha ka ha keesa nkebi okwu ndị ahụ na ihe ndị ha mụtara site na ha. Gwa ha ka ha kọwaa otu nkuzi niile ndị a si enyere ha aka imejupụta ọrụ nke Onyenwe anyị.

Maka echiche ndị ọzọ karịrị maka otu esi amụ ma kuzie ihe site na ozi ndị nke si n’ọgbakọ zuru ọha, lee “Echiche ndị bụ maka Ịmụ ihe na Ikuzi ihe site n’Ọgbakọ Zuru ọha.” (Pịa “Echiche niile maka Ọmụmụ ihe” n’okpuru “General Conference” nime Ọba akwụkwọụ.)

Bipụta