Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 111


Nkeji 111

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Salem, Massachusetts, 6 Ọugọst 1836 (History of the Church, 2:465–466). N’oge nkea ndị ndu nke Nzukọ-nsọ ji nnukwu ụgwọ n’ihi ọrụ ha nile n’ịgbasa-ozi. Mgbe ha nụrụ na nnukwu ego ga-erute ha aka na Salem, Onye-amụma, Sidney Rigdon, Hyrum Smith, na Oliver Cowdery garuru ebe ahụ site na Kirtland, Ohio, iji chọpụta ihe nke a, ya na ikwusa ozi-ọma. Ụmụnna ahụ rụrụ ọtụtụ ihe na ọrụ nke Nzukọ-nsọ na kwusaa kwa ozi-ọma. Mgbe o doro-anya na o nweghị ego gaje ịpụta, ha lọghachiri na Kirtland. Ọtụtụ ihe pụtara íhè n’ebe ahụ ka e gosipụtara na mkpụrụ okwu nke mkpughe nke a.

1–5, Onye-nwe na-eleba anya na mkpa nile nke arụ nke ụmụ-odibo ya; 6–11, Ọ ga-emere Zaịọn ebere na hazie ihe nile maka ọdị-mma nke ndị odibọ ya.

1 Mụ, Onye-nwe, Chineke unu, enweghị iwe maka njem nke a unu bịara, n’agbanyeghị nzuzu unu nile.

2 E nwere m nnukwu akụ na obodo-ukwu nke a maka unu, n’ihi nrite-uru nke Zaịọn, na ọtụtụ mmadụ n’ime obodo-ukwu nke a ndị m ga-akpọpụta mgbe oge ya ruru maka nrite-uru nke Zaịọn, site na aka unu.

3 Ya mere, ọ dị mkpa ka unu mara ndị mmadụ n’obodo ukwu nke a, dịka a ga-edu unu, na dịka a ga-enye kwa unu.

4 Na ọ ga-eru n’oge ya na a ga m enye obodo-ukwu ahụ n’aka unu nile, ka unu wee nwee ike n’ebe ọdị, nke ga-eme na ha a gaghị achọpụta akụkụ nzuzo unu nile; na akụ ya gbasara ọla ọcha na ọla edo ga-abụ nke unu.

5 Echegbula onwe unu maka ụgwọ unu nile, n’ihi a ga m enye unu ike ịkwụ ha.

6 Echegbula onwe unu maka Zaịọn, n’ihi a ga m emere ya ebere.

7 Nọrọ nụ n’ebe a, na mpaghara nile gbaa gburu-gburu;

8 Na n’ebe ahụ bụ uche m ka unu nọrọ, maka isi ọnọdụ, ka a ga-atụ aka nye unu site na udo na ike nke Mụọ m, nke ga-asọba n’ime unu.

9 Ebe nke a, unu nwere ike inweta site n’ịkwụ ụgwọ. Ma kpachapụ anya jụọnụ ajụjụ gbasara ndị ochie bi ebe a na ndị chọpụtara obodo-ukwu nke a;

10 N’ihi e nwere nnukwu akụ karia otu maka unu na obodo-ukwu nke a.

11 Ya mere, bụrụ nụ ndị maara ihe dịka agwọ nile na kwa n’enweghị mmehie; na a ga m ahazi ihe nile maka ọdị nma nke unu, ngwa ngwa unu nwere ike iji nabata ha. Amen.