2021
Okwu nke Amamiihe
Ọgọst 2021


“Okwu nke Amamiihe,” Friend, Aug. 2021.

Ozi nke Friend Kwa ọnwa, Ọgọst 2021

Okwu nke Amamiihe

Foto, oyiyi
Josef Smith na-akụziri otu ndịikom

Josef Smith mere nzukọ iji kuziere ndị mmadụ ihe banyere oziọma ahụ. Mgbe ụfọdụ ndịikom na-ese ma na-ata ụtaba.

Foto, oyiyi
Josef na Emma Smith

Nke a sogburu Emma Smith. Anwụrụ na ụtaba ahụ n’eme nnukwu unyi, ma e nwere ihe na-adịchaghị mma banyere ya. Emma na Josef na-eche otu o si emetụta Chineke.

Foto, oyiyi
Joseph Smith na-ekpe ekpere

Josef kpere ekpere, ma Onyenwe anyị zara. Onyenwe anyị dọrọ ndị otú nke Nzukọ nsọ aka na ntị banyere ị na-ese ma na-ata ụtaba. Ọ sịrị na ha adịghị mma maka ahụ anyị. Ọ dọkwara ha aka na ntị banyere ịńụ tii, kọfị, na mmanya na-egbu egbu.

Foto, oyiyi
akwụkwọ nri

Chineke kwuru si ka erie mkpụrụ osisi, akwụkwọ nrị, na nri ndị ọzọ na-emezi ahụ. Anyị na-akpọ nkuzi ndị a niile Okwu nke Amamiihe.

Foto, oyiyi
nwantakịrị nwanyị na-eri nri

E nwere m ike idebe Okwu nke Amamiihe. Nna nke Eluigwe ga-agọzi m dịka m na-elekọta ahụ m.

Ihuakwụkwọ A Na-Ete Agba

E Nwere M Ike Ilekọta Ahụ M

Foto, oyiyi
ụmụntakịrị na-awụ eriri

Gịnị ka i na-eme iji lekọta ahụ gị?

Pịa na foto ahụ ibudata ya.

Ngosipụta site n’aka Apryl Stott

Bipụta