2021
Tempụl Kirtland Ahụ
Septemba 2021


“Tempụl Kirtland Ahụ, ” Friend, Sept. 2021.

Ozi nke Friend Kwa ọnwa, Septemba 2021

Tempụl Kirtland Ahụ

Foto, oyiyi
Joseph Smith na-ahụ Tempụl Kirtland na ọhụ

Chineke gwara Joseph Smith ka o wuo tempụl. Mkpughe gosiri ihe ọ ga-adị ka ya. Ọ ga-abụ ụlọ Chineke.

Foto, oyiyi
na-ewu Tempụl Kirtland ahụ

Ndị nsọ ahụ rụkọrịtara ọrụ ọnụ inye aka wuo tempụl ahụ. Ụmụ nwoke wuru mgbidi ndị toro ogologo. Ụmụ nwanyị kwara ákwà ngebichi na kapeeti. Ụmụaka nyere aka butere ndị ọrụ ngwa ọrụ na mmiri.

Foto, oyiyi
ndị mmadụ na-abụ abụ

Mgbe arụchara ụlọ nsọ ahụ, Ndị nsọ banyere n’ime. Ha bụrụ abụ ma tie mkpu “Hosanna!” Josef kpere ekpere ido (gọzie) tempụl ahụ nsọ.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst na-eleta Kirtland Tempụl

Otu izu mesịrị, Jizọs Kraịst gara leta Joseph Smith na Oliver Cowdery n’ime tempụl ahụ. Jizọs kwuru na Ọ nabatara tempụl ahụ dịka ụlọ Ya.

Foto, oyiyi
ụmụaka nọ n’ime ọgba tempụl

Taa enwere ọtụtụ tempụl ebe niile n’ụwa! Tempụl ọbụla bụ ebe dị nsọ. Otu ụbọchị m ga-abanye n’ime ma kwe Chineke nkwa.

Ihuakwụkwọ A Na-Ete Agba

Tempụl Bụ Ebe Dị Nsọ.

Foto, oyiyi
otu nwatakịrị na-ekerịta otu cọpị Friend nye onye ọzọ

Pịa na foto ahụ ibudata ya.

Ngosipụta site n’aka Apryl Stott

Gịnị mere tempụl ahụ ji pụọ iche?

Bipụta