“Josef Na-akwado maka Oge Ihe Isi ike, Ozi Friend Kwa ọnwa, Maachi 2022
“Josef Na-akwado maka Oge Ihe Isi ike”
Ozi Friend Kwa Ọnwa, Maachi 2022
Josef Na-akwado maka Oge Ihe Isi ike
Joseph bụụrụ onye amụma. O bibụrụ n’ime Ijipt. Otu abalị Pharaoh, eze ndị Egypt, rọọrọ nrọ gbawojuru anya. Ọ jụrụ Josef ihe nrọ ahụ pụtara.
Chineke nyere Josef aka iji ghọta nrọ ahụ. Ruo afọ asaa, ndị mmadụ nwere ọtụtụ ihe oriri. Afọ asaa ọzọ ndị mmadụ agaghị enwe nke ga-ezuru ha. Josef gwara Pharaoh.
Josef kwuru ka ha chekwaa ihe oriri ugbua. Mgbe ahụ ha ga-adị na njikere maka oge ihe isi ike. Pharaoh dobere Josef n’isi ndị ga-echekwa ihe oriri. Josef rụsiri ọrụ ike.
Mgbe afọ asaa nke ụnwụ bịara, ndị mmadụ nwere ihe oriri ga ezuru ha iri. Ha nwere nnọọ nke ga-ezuru ha ị kesara ndị ọzọ.
E nwere m ike ị kwado ugbua. Site n’enyem aka nke Chineke, E nwere m ike imeri oge ihe isi ike!
© 2022 site na Intellectual Reserve, Inc. Ikike Mbipụta niile ka e dokwara E bipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa ọnwa, Maachi 2022. Igbo. 18296 593