“Mozis na Mana ahụ,” Ozi Friend Kwa Ọnwa, Eprel 2022
“Mozis na Mana ahụ”
Ozi Friend Kwa ọnwa, Eprel 2022
Mozis na Mana ahụ
Mozis bụụrụ onye amụma. O duuru ụmụ nke Chineke gaa n’ala ahụ e kwere na nkwa. Ha jere ije ọtụtụ ụbọchị.
Agụụ gụrụ ndị mmadụ. Ha enweghị nri. Ya mere Chineke zigara ha nri sitere n’eluigwe. A kpọọrọ ya mana.
N’ụtụtụ ọbụla, ndị mmadụ na-achịkọta mana ka ha rie. Mana ọ gaghị adị ọhụrụ n’ofe abalị. Ha bịakwara chịkọtakwu ọzọ n’echi ya.
Mana ahụ na-echetara anyị maka Jizọs Kraịst. Chineke zitere mana ịzọpụta ndị mmadụ. O zitekwara Jizọs n’ụwa ịzọpụta anyị. Anyị chọrọ Jizọs kwa ụbọchị, dị ka anyị chọrọ nri kwa ụbọchị.
A ga m esoro Jizọs. Ọ ga-enye m ume ma nyere m aka inwe mmetụta ịhụnanya Ya kwa ụbọchị.
© 2022 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. All rights reserved. E bipụtara na USA. Nnabata n’asụsụ Bekee: 6/19. Nnabata ntụgharị-asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Eprel 2022. Igbo. 18314 593