2022
Mozis na Mana ahụ
Eprel 2022


“Mozis na Mana ahụ,” Ozi Friend Kwa Ọnwa, Eprel 2022

“Mozis na Mana ahụ”

Ozi Friend Kwa ọnwa, Eprel 2022

Mozis na Mana ahụ

Foto, oyiyi
Mozis na ụmụ Izrel

Nkọwa site n’aka Apryl Stott

Mozis bụụrụ onye amụma. O duuru ụmụ nke Chineke gaa n’ala ahụ e kwere na nkwa. Ha jere ije ọtụtụ ụbọchị.

Foto, oyiyi
ụmụaka ji mana

Agụụ gụrụ ndị mmadụ. Ha enweghị nri. Ya mere Chineke zigara ha nri sitere n’eluigwe. A kpọọrọ ya mana.

Foto, oyiyi
nwa nwoke na nne na-akwadebe mana

N’ụtụtụ ọbụla, ndị mmadụ na-achịkọta mana ka ha rie. Mana ọ gaghị adị ọhụrụ n’ofe abalị. Ha bịakwara chịkọtakwu ọzọ n’echi ya.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst na ụmụntakịrị

Mana ahụ na-echetara anyị maka Jizọs Kraịst. Chineke zitere mana ịzọpụta ndị mmadụ. O zitekwara Jizọs n’ụwa ịzọpụta anyị. Anyị chọrọ Jizọs kwa ụbọchị, dị ka anyị chọrọ nri kwa ụbọchị.

Foto, oyiyi
ụmụaka na-ele foto Jizọs Kraịst

A ga m esoro Jizọs. Ọ ga-enye m ume ma nyere m aka inwe mmetụta ịhụnanya Ya kwa ụbọchị.

Ihuakwụkwọ A Na-Ete Agba

Anyị Chọrọ Jizọs Kwa Ụbọchị

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst na ụmụntakịrị

Pịa na foto ahụ ibudata ya.

Ngosipụta site n’aka Apryl Stott

Olee otú Jizọs si e nyere gị aka?

Bipụta