“Jizọs Kraịst Na-eme ka Oké ifufe daa Jụụ,” Friend, Mar. 2023, 46–47.
Ozi Friend Kwa Ọnwa, Maachi 2023
Jizọs Kraịst Na-eme ka Oké ifufe daa Jụụ
Otu abalị Jizọs Kraịst na ndị na-eso ụzọ Ya kụfere osimiri ahụ nime otu ụgbọmmiri. Ike gwụrụ Jizọs ma ọ dara n’ụra.
Oké ifufe bịara. Ebili mmiri ahụ na-abawanye abawanye! Egwu tụrụ ndị na-eso ụzọ. Ha kpọtere Jizọs ma rịọ Ya ka ọ zọpụta ha.
Jizọs bilitere ma kwuo, “Udo, dere duu.” Ikuku ahụ kwụsịrị. Mmiri ahụ dara jụụ.
Okwukwe m nime Jizọs Kraịst nwere ike ịwetere m udo. Mgbe egwu n’atụ m, Jizọs nwere ike inyere m aka nwete mmetụta udo.
© 2023 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nnabata n’asụsụ Bekee: 6/19. Nnabata ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa ọnwa, Maachi 2023. Language. 18905 593