“Liahona Ahụ,” Friend, Feb. 2024, 26–27.
Ozi Friend Kwa ọnwa, Febụwarị 2024
Liahona Ahụ
Onyenwe anyị gwara Lehi ka ọ gaa nala ahụ e kwere na nkwa ya na ezi na ụlọ ya. Mana ha ejighị aka otu esi agaru ebe ahụ.
Onyenwe anyị nyere Lehi otu ngwa ọrụ pụrụ iche. Ọ dịịrị ka kọmpas. Ọ tụrụ aka nụzọ ha ga-aga. Ha kpọrọ ya Liahona ahụ.
Mgbe ha dobere iwu nsọ niile, Liahona ahụ rụrụ ọrụ. O duuru ha gaa ebe a ga-enweta nri na nchekwa. Mana mgbe ha rụrụ ụka ma nupu isi, ọ kwụsịrị ịrụ ọrụ.
Ezi na ụlọ Lehi sooro Liahona ahụ ka ha nwee ike ruo ala ahụ e kwere na nkwa. Mgbe anyị họọrọ ihe ziri ezi, Nna nke Eluigwe ga-edukwa anyị.
© 2024 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Febụwarị 2024. Language. 19276 593