“Ndị Dike Na-eto eto,” Friend, Ọgọst 2024, 26–27.
Ozi Kwa Ọnwa nke Friend Ọgọst 2024
Ndị Dike Na-eto eto
Ndị ahụ Amọn na ụmụnne ya ndị nwoke kuziiri ihe chọrọ isoro Jizọs Kraịst. Ha liri ngwa ọgụ ha ma kweere Chineke nkwa na ha enweghị ike alụ ọgụ ọzọ.
Mana mgbe na-adịghị anya ọ dịịrị ha mkpa ichekwa ezi na ụlọ ha niile. Ndị nna ndị liri ngwa ọgụ ha achọghị imebi nkwa ha kweere Chineke. Ya mere ụmụ ha ndị nwoke kwadoro ịlụchitere ha ọgụ. A kpọrọ ha ndị dike na-eto eto puku abụọ. Na-eto eto pụtara “nta.”
Ndị dike ndị a na-eto eto alụtụbeghị ọgụ n’agha mbụ. Mana ndị nne ha nyeere ha aka kwadoo ma kuziere ha ịtụkwasị obi na Chineke.
Ha họọrọ Helaman ịbụ onye ndu ha. Obi siri ha ike, ma Chineke nyeere ha aka. Ha niile merụrụ ahụ, mana ha nyeere onwe ha aka. Chineke nabatara okwukwe ha, ma ha niile dịịrị ndụ!
© 2024 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Ọgọst 2024. Igbo. 19290 593