2021
Kedu otu m ga-esi mara na m na-anụ olu nke Onyenwe anyị n’ime ndụ m?
Febụwarị 2021


“Kedu otu m ga-esi mara na m na-anụ olu nke Onyenwe anyị n’ime ndụ m?” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Feb. 2021, 29.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Febụwarị 2021

Kedu otu m ga-esi mara na m na-anụ olu nke Onyenwe anyị n’ime ndụ m?

Foto, oyiyi
onye ikom nta na-agụ akwụkwọ nsọ

Onyeisi Russell M. Nelson akpọkuwo anyị “iche echiche nke ọma ọtụtụ mgbe” banyere otu anyị si anụ olu Jizọs Kraịst ma gbalịa inụ Ya nke ọma ọtụtụ mgbe” (“’Kedụ Otu I si a #Nụrụ olu Ya?’ Ọkpụkpọ oku Pụrụiche,” Feb. 26, 2020, blog.ChurchofJesusChrist.org).

Anyị nwere ike nụrụ olu Ya site na akwụkwọ nsọ na okwu nke ndị amụma. Mana ọbụghị nanị ịnụrụ ma ọbụ ịgụ okwu ndị ahụ bụ ebe o biri. Site na Onye Amụma Joseph Smith, Onyenwe anyị kọwara:

Ọ bụ olu m nke na-ekwu [okwu ndị a] nye gị; nihi na enyere gị ha site na Mmụọ M … ;

“Ya mere, I nwere-ike ịgba-ama na Ịnụwo olu m” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:35–36).

Na mgbakwunye, ị na-achọ ịnụrụ Ya abụghị ihe anyị na-eme na mberede. Onyeisi Nelson ekwuwo, “Ọ na-ewe mgbalị a kpachaara anya na nke na-anọgide” (“Nụrụ Ya,” Apr. 2020 ọgbakọ zuru ọha [Ensign ma ọbụ Liahona, Me 2020, 89]).

Dịka unu na-amụ, ekpe ekpere, efe ofufe, eje ozi, ma na-erube isi nye iwu nsọ nke Onyenwe anyị, Ọ ga-eji Mmụọ Ya gọzie unu ma, site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, ga-agbanwe unu Mgbe ahụ I ga-amara na I nụwo olu Ya.

Bipụta