2021
Ọ Bụ site n’aka otu Nwata nwoke ka Esi Zọpụta otu Obodo
Eprel 2021


“Ọ Bụ site n’aka otu Nwata nwoke ka Esi Zọpụta otu Obodo,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Epr. 2021, 10–11.

Kwa ọnwa Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Ozi, Eprel 2021

Ọ Bụ site n’aka otu Nwata nwoke ka esi Zọpụta otu Obodo

Tọm Fanene gbara naanị afọ 12, mana mgbe ọrịa ọjọọ dapụtara n’otu obodo dị na Samoa, a kpọkuru ya ime ihe ndị dị ukwuu.

Foto, oyiyi
Agwaetiti nke Samoa na nwata nwoke na-enyere onye obodo ahụ na-adịghị aka

Nkọwa site n’aka Jems madsen; foto sitere n’aka Getty Images

Dị ka isiokwu nke ndị ntoroọbịa nke afọ nke a si kwuo, unu “na-atọ ntọala nke ọrụ dị ukwuu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:33). Na gburugburu agụgụala Nzukọ nsọ, ndị dị nta ọtụtụ mgbe emewo ihe ndị dị oke mkpa n’oge ndị kachasị mkpa n’iwulite alaeze Chineke. Nke a bụ otu ihe ọmụmaatụ.

Ọrịa Mkpochapụ ụwa Agwaetiti

Ihe karịrị otu narị afọ gara aga, na Agwaetiti nke Samoa nke Pacific Ocean, otu dimkpa nwoke a kpọrọ Tọm Fanene bụụrụ onye enyem aka dị mkpa n’otu ọnọdụ ọnwụ-na-ndụ maka ndị otú Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi nsọ Ụbọchi ikpeazụ a.

Tọm biiri n’obodo a kpọrọ Sauniatu, nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a chọpụtara na mpaghara ebe ahụ dị ka ebe ha nwere ịgbakọ ma biri otu ebe. Dị nnọọ ka Ndị nsọ nke Chineke noge gara aga na ebe ndị ọzọ, ha nwetara nnwale dịkwa ka ha nwetara ọrụ ebube dị iche iche dị ka ha naara arụ ọrụ iwukọta alaeze Chineke ọnụ. Otu nnwale bịara na 1918 mgbe ọrịa mkpochapụ ụwa na-efefe rutere obodo ahụ.

Ngwa ngwa ọrịa ahụ rutere, ọ dịịrị ọjọọ, ma ofesara ọsịsọ. Ihe ruru onye ọbụla na ndị obodo ahụ dara n’ute ọrịa n’ihi ya. Naanị mmadụ ole na ole niime ha bụ ndị ahụ siri ike nọ na-agagharị: otu nwoke mere okenye na Tọm gbara afọ 12.

Okwukwe na Ịrụsi Ọrụ ike

Ezi na ụlọ Tọm tinyere okwukwe n’ọrụ tupu oge nrịanrịa nke a ma ha ahụwo ọrụ ebube niile n’ihi ya. Ailama nwanne nwoke Tọm nke nta dara ọrịa afọ ole na ole gara aga tupu oge ahụ. Nna ha, Elisala, rọrọ nrọ nime nke enyere ya otu ntuziaka niihe ọ ga-eme iji lekọta Ailama: chọta osisi wili-wili, kpepụ azụ ya, ma sụpụta mmiri ya. Elisala mere nke a ma wepụta mmiri ya nye Ailama, onye nke ńụrụ ya ma gbakee mgbe na-adịghị anya. Ya mere Tọm ahụwo ka iji okwukwe mee ihe nwere ike isi nye aka gabiga nrịanrịa.

N’oge ọrịa mkpochapụ ụwa na-efe efe nke 1918 ahụ, Tọm tinyere okwukwe n’ọrụ dị ka ọ rụsiri ọrụ ike iji lekọta ndị bi n’obodo ahụ. “Ụtụtụ niile a naara m aga n’ụlọ n’ụlọ ị ga nye nri ma hichaa ha ahụ na ịchọpụta ndị nwụrụ anwụ,” ka ọ sịrị.

O jiri bọket chuta mmiri niiyi ma buga mmiri n’ụlọ niile. Ọ rịrị elu akụ, ghọọ akụ, baa ha, gbuwaa ha iji gbara mmiri ha ga nye ndị ọrịa. O gbukwara ọkụkọ niile nọ n’obodo ahụ iji siere ezi na ụlọ ọbụla ofe.

Ime Ihe Pụrụ iche

N’oge ọrịa mkpochapụ ụwa nke a, ihe dị ka otu ọkara anọ nke ndị niile bi na Samoa nwụrụ site n’ọrịa na-efe efe. Ụfọdụ ndị obodo nke Tọm nwụrụ. Tọm nyere aka gwuo ili ma liee ihe karịrị 20 niime ha, tinyere nna nke ya onwe ya.

Mana ekele dịrị ọrụ ike na nlekọta nke ịhụnaanya Tọm, ọtụtụ mmadụ na obodo ya nyara ndụ. O mere nnukwu ihe dị iche nye ndị ahụ na iwulite alaeze nke ónyenwe anyị na Samoa. Ọ naara “atọ ntọala nke nnukwu ọrụ.”

Ma n’ụzọ nke gị onwe gị, otu ahụ ka ị na-eme.

Enwere ike agaghị akpọ gị ime ụdịrị ihe ndị ahụ Tọm mere, mana ị na, na-eziokwu, etinye okwukwe n’ọrụ n’ụzọ dị iche iche nke ga-ezipụta ihe dị iche nke ukwuu nye gị, nye ndị ọzọ, na n’ọrụ ahụ nke iwulite alaeze Chineke.

Ị na-ehiwe ihe ọmụmaatụ maka ezi na ụlọ gị, ndị enyi gị, na ndị ọzọ site na igosị omume ọma, ndidi. Obi ọma, na ịhụnaanya. Ị na-ejere ndị ọzọ ozi Ị na-etinye onwe gị na-ịmụ akwụkwọ nsọ na ikpe ekpere. Ị na-agbasa eziokwu nke oziọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere.

N’oge afo nke a gara aga, ọtụtụ niime unu nọburịị eme ihe ndị a niile ebe unu nọ na-edi ndapụta niile nke otu ọrịa mkpochapụ ụwa. Ikekwe ikutatubeghị mmiri na akụ oyibo ma lekọta mmadụ 400 nọ nọrịa ha agbakee, mana ị inye wo ndị mmadụ nkasi obi, olileanya,ọńụ, na udo n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ.

O nweghị ihe afọ ole ịgbara mere karịa okwukwe gị na ịdị njikere gị n’ịrụ ọrụ na ijere ndị ọzọ ozi. Ọmụmaatụ site n’oge gara aga, dị ka nke Tọm Fanene, nwere ike nyere gị aka hụ na-achọrọ gị nịịtọ ntọala nke ọrụ dị ukwuu nke Chineke.

Bipụta