2022
Họrọ
Jun 2022


“Họrọ,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Jun 2022.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Jun 2022

Họrọ

Jọshụwa rịọsiri ndị ya arịrịọ ike ịhọrọ ihe ziri ezi—isoro Onye Nzọpụta.

họrọ

Ike anyị nwere iji họrọ ma meere onwe anyị ihe bụ ihe a kpọrọ ohere nhọrọ. Ọ bụ akụkụ dị mkpa na atụmatụ nke Nna nke Eluigwe. Otu ebumnuuche nke ndụ nke a bụ igosi na anyị ga-ahọrọ irube isi n’iwu niile nke Chineke nke ọ ga-abụ na anyị ga-enwe ike dịkarịa ka Ya. A ga-ekpe anyị ikpe dị ka otu nhọrọ anyị siri dị. (Lee 2 Nịfaị 2:27; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 101:78; Abraham 3:25.)

ụbọchị nke a

Jọshụa rịọsiri ndị ya arịrịọ ike ịhọrọ “ụbọchị nke a,” ma ọ bụ ugbu a. Anyị nwere ike ịhọrọ ihe ndị dị mkpa otu ugboro ma mgbe ahụ gbalịa iguzosi ike na ha. (Lee Abụ ọma 37:5.)

ije ozi

Na amaokwu nke a, ije ozi pụtara ife ofufe, inye aka, irube isi, na inyefe onwe gị nye onye ọzọ. Anyị kwesịrị ife Onyenwe anyị ofufe (lee Moses 1:15).

chi niile

Enyewo Israel iwu ife naanị ezi Chineke dị ndụ, Jizọs Kraịst ofufe (lee Ọpụpụ 20:2–5). Jọshụwa nyere ọmụmaatụ niile banyere chi ndị ọzọ nke ndị ya na-agaghị efe. Na ndụ anyị chi ndị ọzọ nwere ike gụnye ihe ndị enwere, echiche niile nke ndị ọzọ, ihe ndị ọzọ na-amasị mmadụ—ihe ọbụla na-ewepụ anyị site n’ebe Onyenwe anyị nọ.

mụ na ezi na ụlọ m

Jọshụwa kwuru okwu maka onwe ya na ndị otu ezi na ụlọ ya. Ọ sịrị na ha ga-ejere Onyenwe anyị ozi. Ọ chọburu idu ezi na ụlọ ya n’ezi omume ma kuziere ha isoro Onyenwe anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:40).

Bipụta