“Echela! “Dịrị Dị ka Ndị ọzụzụ atụrụ,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Dec. 2022. Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Disemba 2022 Luk 2:8-20 Echela! Dịrị Dị ka Ndị ọzụzụ atụrụ Site n’aka Eric B. Murdock; ngosipụta niile site n’aka Darren Rawlings Foto, oyiyindị ọzụzụ atụrụ N’otu abalị dị jụụ ogologo oge gara aga, ndị ọzụzụ atụrụ dịịrị uchu n’ilekọta ìgwè atụrụ ha. Foto, oyiyiatụrụ Ndị ọzụzụ atụrụ nwere otu ọrụ dị mkpa. Atụrụ ahụ chọrọ nri, mmiri, na nchekwa site n’ihe dị egwu. Foto, oyiyimmụọ ozi N’otu ntabi anya, otu mmụọ ozi pụtara! “Atụla egwu, niihi na lee, e weteere m unu ozi ọma nke oké ọṅụ. … N’ihi unu ka a mụrụ taa … Onye Nzọpụta, nke bụ Kraịst Onyenwe anyị.” Foto, oyiyimmụọ ozi Mmụọ ozi ahụ gwara ndị ọzụzụ atụrụ na ha ga-achọta nwa ọhụrụ ahụ e kere n’akwa akwa, dinara n’ụlọ anụ ụlọ dị na Bethlehem. Foto, oyiyikwaya dị ka nke mmụọ ozi Kwaya dị ka nke mmụọ ozi jupụtara n’igwe ma sonyere mmụọ ozi ahụ n’inye Chineke otuto. “Otuto dịrị Chineke nke kachasị elu, ma n’elu ụwa udo, uche ọma n’ebe ụmụ mmadụ nọ.” Foto, oyiyindị ọzụzụ atụrụ “Ka anyị ga na Bethlehem ma hụta ihe Onyenwe anyị meworo ka anyị mata.” Foto, oyiyindị ọzụzụ atụrụ na-eso kpakpando Ndị ọzụzụ atụrụ echeghị. Nke a dịịrị oke mkpa! Ha “bịara ọsọ ọsọ” na Bethlehem. Foto, oyiyindị ọzụzụ atụrụ nọ n’ụlọ anụ ụlọ Ndị ọzụzụ atụrụ chọtara Jizọs e jiri akwa akwa kee, dinara na ụlọ anụ ụlọ, dị nnọọ ka otu mmụọ ozi si kwuo. Foto, oyiyinwa ọhụrụ Jizọs Nke a bụ Mezaya ahụ e kwere nkwa ya onye bịara ị bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke ụwa na iwetere anyị ezi ọṅụ! Foto, oyiyindị ọzụzụ atụrụ Ndị ọzụzụ atụrụ nwere nnukwu ọṅụ! Ha kesara ihe ha nuworo ma hụ. “A mụwo Onye Nzọpụta nke ụwa!” “Mezaya n’ikpeazụ abịawo!” Foto, oyiyionye ikom nta na-amụ akwụkwọ nsọ Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ “bịakwutere Jizọs ọsọ ọsọ”. Ị nwekwara ike! Ị nwere ike ịmụ maka Ya. Foto, oyiyionye ikom nta na-asụchasị ahịhịa Ị nwere ike ijere Ya ozi site n’ijere ndị ọzọ ozi. Foto, oyiyionye inyom nta na-ekekọrịta akụkọ Akwụkwọ nke Mọmọn ya na onye ikom nta Ị nwere ike ịgba ama maka Ya. © 2022 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nnabata n’asụsụ Bekee: 6/19. Nnabata ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Disemba 2022. Asụsụ.18318 593