2023
Bịakwutenụ Ya
Maachị 2023


“Bịakwutenụ Ya,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Mar. 2023.

Ozi Kwa Ọnwa, Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Maachị 2023

Bịakwutenụ Ya

Onye Nzọpụta n’akpọku anyị ibokwasị Ya ibu arọ anyị niile.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst

Ngosipụta site n’aka Annie Henrie Nader

Bịakwute M

Anyị nwere ike ịbịakwute Onye Nzọpụta site n’ịmụ ozioma Ya, ịnwe okwukwe na Ya, ịchegharị, ime na idobe ọgbụgbandụ niile, na isoro ọmụmaatụ Ya.

rụọ oke ọrụ … dị arọ

Ọrụ nke anụ ahụ na ibu arụ nke anụ ahụ nwere ike ị nachara anyị ike anyị, mana otu ahụ ka ọ dị kwa ndị nke uche, mmetụta obi, ma ndị nke ime mmụọ. Ọnye Nzọpụta n’enye anyị udo Ya, na-agbanyeghị ụdị ibu arụ ndị anyị nwere ike ibu.

ihe nkekọta

Ihe nkekọta bụ ngwa ọrụ eji ekekọta anụmanụ abụọ ọnụ ka ha nwee ike dọkọta otu ibu ọnụ, dị ka otu ahụ esi adọ plow ma ọ bụ ụgbọala ibu. Ihe nkekọta ahụ n’enwekarị osisi gbara agba a n’edobe n’elu ubu nke anụmanụ ọbụla, nke a na-ekesa ibu arụ ahụ n’etiti ha abụọ.

mụta

Anyị nwere ike ịmụta maka Jizọs Kraịst site n’ịmụ nkuzi Ya niile na ọmụmatụ Ya—ma site n’ịgba mbọ isoro ha.

ezumiike

Ezumiike nke Onye Nzọpụta bụ udo Ya, nke na-eme ka uche anyị na mmụọ anyị daa jụụ. Ọ na-enyere anyị aka imeri mkpagbu niile nke ụwa ma na-enye anyị ume ime nke mmụọ mgbe anyị na-adịghị ike.

dị mfe … adighị arụ

Iwekwasị onwe anyị ihe nkekọta nke Onye Nzọpụta pụtara ịkekọta onwe anyị na ya site na ọgbugbandụ niile. Ọ pụtara ịrara obi anyị nyefee Ya na ọrụ Ya. Mgbe anyị mere nke a, ibu arụ anyị agaghị adị arụ nihi na Ọ na-enyere anyị aka.

Bipụta