“Ikwere na Kraịst tupu Ya Abịa Ọzọ,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Epr. 2024.
Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Eprel 2024
Ikwere na Kraịst tupu Ya Abịa Ọzọ
Ndị Nefi nwere okwukwe tupu Onye Nzọpụta abịa, ma anyị nwere ike inwe okwukwe tupu Ya abịa ọzọ.
Enwewo mgbe ịchere maka otu ọ ga-adị ikwere na Onye Nzọpụta tupu Ya abịa n’ụwa? Ndị Nefi mgbe ochie mere nnọọ nke ahụ—“tụọanya Mezaya, ma kwere na ya ịbịa ka a ga-asị na ọ bịaworịị” (Jarom 1:11).
N’oge ugbu a, anyị nwere ihe ndị e dere n’akwụkwọ nsọ na akụkọ ihe mere eme nke na-egosi na Jizọs Kraịst dịịrị ndụ, nwụọ, ma bilie ọzọ. Anyị kwere na Onye Nzọpụta onye bịarala. Mana anyị kwekwara na Onye Nzọpụta onye ga-abịa ọzọ.
Tupu Jizọs Kraịst Abịa, ndị Nefi Nwere Okwukwe Nye:
Inwe mgbaghara nke mmehie ha niile.
“Onye ọbụla ga-ekwere na Kraịst ga-abịa, onye ahụ kwa nwere ike nata mgbaghara nke mmehie ha, ma ńụrịa na oke ọńụ dị ukwuu, ọbụna dịka a ga-asị na ọ bịaworịị n’etiti ha” (Mozaya 3:13; nkwusi ike agbakwunyere).
Gbaghara onwe ha.
“Ma o nwere olu rutere m, na-asị: Enọs, mmehie gị niile ka a gbagharaworo gị. … Ya mere, ikpe ọmụma m ka a zafuworo. Ma a sịrị m: Onyenwe anyị, olee otu esi eme ya? Ma o wee sị m: N’ihi okwukwe gị n’ime Kraịst, onye nke ị na-aka anụtụghị olu ya ma-ọbụ hụtụ ya mbụ. Ma ọtụtụ afọ ga-agafe tupu ọ ga egosịpụta onwe ya n’anụ arụ; … okwukwe gị azọpụtawo gị” (Ịnọs 1:5–8; nkwusi ike agbakwunyere).
Rụọ ọrụ ebube niile.
“Anyị matara maka Kraịst, ma anyị nwere olileanya nke ebube ya ọtụtụ narị afọ tupu ọbịbịa ya. … Nke mere na anyị n’ezie nwere ike nye iwu n’aha nke Jizọs ma osisi ndị ahụ a kpọrọ aha wee rubere anyị isi, ma ọ bụ ugwu ukwu niile, ma ọbụ ebili mmiri nke oke osimiri” (Jekọb 4:4, 6; nkwusi ike agbakwunyere).
Nata mkpughe.
“E nwere ọtụtụ ndị okwukwe ha siri ezigbo ike nke ukwuu, ọbụna tupu Kraịst abịa, ndị a na-enweghị ike igbochi site niime akwa mgbochi ahụ, kama ha jiri anya ha hụ” (Ita 12:19; emesiri ike).
Tupu Jizọs Kraịst Abịa Ọzọ, Anyị Nwere ike Nwee Okwukwe Inweta:
Mgbaghara, gbaghara onwe anyị, rụọ ọrụ ebube niile, ma nata mkpughe (dị ka ndị Nefi).
Na-akwado onwe anyị maka ọbịbịa Ya.
Dị ka anyị n’agba mbọ idobe ọgbụgba ndụ anyị niile, anyị na-akwado i bi na alaeze selestịal. “N’ihi na lee, ndụ nke a bụ oge ahụ dịrị ndị mmadụ ịkwadobe ijekwuru Chineke; ee, lee ụbọchị nke ndụ nke a bụ ụbọchị dịrị ndị mmadụ iji rụọ ọrụ ha niile” (Alma 34:32).
Kwadoo ụwa maka ọbịbịa Ya.
Onyeisi Russell M. Nelson akpọkuola anyị ịbụ akụkụ nke “ọrụ kachasị ukwuu n’elu ụwa”—mkpokọta nke Izrel. “Nna anyị nke Eluigwe edokwawo ọtụtụ mmụọ Ya ndị kachasị nwee nsọpụrụ—ikekwa, e nwere m ike ị sị, ndị otu Ya kachasị mma—maka nkeji ikpeazụ a. Ndị mmụọ ndị ahụ kachasị nwee nsọpụrụ—ndị egwuregwu ndị ahụ kachasị mma, ndị dike ndị ahụ—bụ unu!”1
Nwee olileanya mgbe ihe siri ike.
Mgbe Onye Nzọpụta ga-abịa ọzọ, ndị ezi omume ga-ebi n’udo. Onye Nzọpụta ga-achị, ma ezighị ezi ka a ga-emezi. “N’ihi na Onyenwe anyị ga-anọ n’etiti ha, ma ebube ya ga-adakwasị ha, ma ọ ga-abụ eze ha na onye na-enye ha iwu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:59).
Tụkwasị obi na Mbilite n’ọnwụ.
Mmadụ niile ga-esite n’ọnwụ bilie. Anyị ga-enwe ahụ zuru oke nke na-adighị anwụ anwụ. Anyị nwekwara ike ịhụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ. “Mmụọ ahụ na anụ ahụ ka a ga-ejikọta ọnụ ọzọ n’ụdị ya zuru oke; ma ụkwụ na aka ma njikọ-ahụ ka a ga-eweghachi n’ụdị ya kwesịrị ekwesị, ọbụna otu anyị dị ugbua n’oge a” (Alma 11:43).
Ndị Nefi mgbe ochie nwere okwukwe na Onye Nzọpụta tupu Ya abịa. Anyị nwere ike nwee okwukwe na Onye Nzọpụta ga-abịa ọzọ—mgbe “[anyị] ga ahụ [Ya] nime igwe ojii niile nke eluigwe, na-e yikwasị ike na nnukwu ebube” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:44.; lee kwa Ọrụ 1:11). O lee otu ịmara na Ọ ga-abịa ọzọ ji agbanwe ihe ị ga-eme taa?
© 2024 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Eprel 2024. Language. 19353 593